Igbo Mass Readings for January 17 2025, Fraịdee n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 17 2025, Fraịdee n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-5, 11

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

Ya bụ, otu ọ bụ na nkwa ịba n’izu ike ya ka dị, ka anyị tụọnụ egwu, n’ihi na e meghị otu a e nwere ike ikpe otu n’ime ụnụ ikpe na o rughị ya. N’ihina anyị nụrụ oziọma ahụ dịka ha si nụ ya.

Oziọma ahụ ha nụrụ abaghịrị ha uru ọbụla, n’ihina mgbe ha nụrụ ya, ha ejighị okwukwe nara ya. Anyị bụ ndị kwere ekwe bara n’izu ike ahụ.

Dịka o si kwu, “Dịka m si ñụọ iyi n’iwe m, ha agaghị aba n’izu ike m”, Ọ bụ eziokwu na ọ rụsịrị ọrụ ya niile mgbe ahụ ọ tọrọ ntọala nke ụwa.

O nwere ebe o kwuru maka ụbọchị nke asaa sị, “Ma Chineke zuru ike n’ọrụ ya n’ụbọchị nke asaa” Ọzọ, n’otu ebe ahụ, ọ sịrị,”Ha agaghị aba n’izu ike m”. Ya bụ ka anyị nwaa oko anyị ịba n’ezumike ahụ, a ghara inwe onye ga-adapụ site na nnupụisi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 78:3, 4, 6-7, 8

Azịza: Echezọna ọrụ nke Onyenweanyị

1.Ihe anyị nụrụ ma matakwa n’onwe anyị,

nke ndị nnanna anyị ha gwara anyị,

nke agaghị ekpuchiri ụmụ ha,

kama anyị ga-eme ka ụmụụmụ anyị mata ya,

ihe ndị a bụ: ịdị ukwu nke Onyenweanyị,

ike ya na ọrụ ebube niile ọ rụrụ.

Azịza: Echezọna ọrụ nke Onyenweanyị

2. Ka agbụrụ na-abịa abịa were mata ha,

wee nwekwaa ike kụziere ụmụ ha,

ka ha were nwee ntụkwasịobi na Chineke,

ghara ịchezọ ọrụ nke Chineke niile,

ma na-edebe iwu ya.

Azịza: Echezọna ọrụ nke Onyenweanyị

3. Ya na ka ha ghara ịdị ka ndị nna ha ochie,

agbụrụ nzuzu na ekwe ekwe,

agbụrụ ndị obi ha akwụsighị ike,

ndị mmụọ ha enweghị nrubeisi n’ebe Chineke nọ.

Azịza: Echezọna ọrụ nke Onyenweanyị

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile, omume ya niile jupụtara n’obi ebere.

Alleluia.

OZIỌMA – 2:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Ka ụbọchị olemaole gachara, Jesu laghachiri na Kapanaum, akụkọ wee gazuo na ọ nọ n’ụlọ. Ma ọtụtụ mmadụ zukọtara nke mere na ohere ọbụla adịghịkwa, ọ bụladị n’ọnụụzọ; ma ọ gwabara ha okwu Chineke.

Mmadụ ụfọdụ buteere ya otu onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, nke mmadụ anọ n’ime ha bu. Ebe ha na-enweghị ike ịbịaru ya nso n’ihi igwe mmadụ ahụ, ha meghere oghere n’elu ụlọ, n’akụkụ ebe ahụ Jesu nọ.

Mgbe ha meghechara ya, ha budara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ n’ute ọ na-edina. Ma mgbe Jesu hụrụ okwukwe ha, o sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa m, a gbagharala gị mmehie gị niile”.

Ụfọdụ ndị odeakwụkwọ nọdụrụ ebe ahụ na-ajụ n’ime obi ha sị, “Gịnị mere nwoke a ji ekwu okwu otu a? Ọ bụ nkwulu! O nwere onye nwere ike ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị Chineke?”

Ngwangwa, Jesu chọpụtara na mmụọ ya na ha na-atule okwu a n’ime obi ha; ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere ụnụ ji atule okwu a otu a n’ime obi ụnụ? Olee nke ka mfe ime, ịsị onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, A gbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ịsị ya, “Bilie chịrị ute gị gagharịba?.

Ma ka ụnụ mara na Nwa nke mmadụ nwere ike ịgbaghara mmehie n’ụwa a, ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Ana m agwa gị, bilie, chịrị ute gị laba.

O biliri, chịrị ute ya ngwangwa si n’ihu ha niile pụọ. Nke a tụrụ ha niile n’anya ha wee too Chineke sị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a mbụ!”

Igbo Mass Readings for January 18 2025, Satọdee n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for January 17 2025, Fraịdee n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.