Igbo Good Friday Readings 2025 – April 18 2025 (Ezi Fraịdee)

Nke a bụ Igbo Good Friday Readings 2025 – April 18 2025 (Ezi Fraịdee).

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 52:13-53: 12

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: “A mapuru Ya ahụ maka njọ anyị”

Lee, nwodibo M ga-enwe agamnihu. A ga-ebulite Ya elu, nye Ya ọkwa dị elu. Ọ bịakwa gbagoro n’ebe dị oke elu. Otu egwu si jide ndị mmadụ mgbe ha hụrụ Ya, otu ahụ ka ọ ga-esi gbaa ndị mmadụ gharịị mgbe ha ga-ahụ Ya.

E metọchara Ya nke na Ọ dịghịzi ka mmadụ ma ọlị. Ndị eze ga-eguzoro n’enweghị ọnụ okwu n’ihu Ya. Maka na ha ga-ahụ ihe ha na-ahụbeghị mbụ, nụkwa akụkọ a na-akọbeghị mbụ. “Onye ga-ekwe ihe anyị nụrụ?

Ọ bụ onye ka Onyenweanyị gosiri ike Ya”? O tolitere n’ihu anyị dịka ome osisi, bịakwa gbaa mgbọrọgwụ n’ala kpọrọ nkụ. N’anya anyị jiri hụ Ya, Ọ maghị mma; O nweghị ugwu eze; Ọ dịghị mma ọ bụla nke ile Ya anya.

Ọ bụ onye ahụhụ zuru ahụ. Ọ bụ onye na-eme ka ndị mmadụ gbarụọ ihu ha. E leliri Ya eleli nke na anyị agụnyeghịkwa Ya n’ihe ọ bụla. Ma ọ bụ ezie na ọ bụ ahụhụ anyị gaara ahụ ka Ọ hụrụ, bịakwa bụrụ mmekpa ahụ gaara abụ nke anyị ka e bokwasịrị ya.

Ma anyị onwe anyị, anyị chere na Ọ bụ onye a tara ahụhụ; onye Chineke kụrụ ihe na onye e wedara n’ala. Ma ọ bụ maka mmehie anyị ka e jiri mapuo Ya, bụrụkwa maka njọ anyị ka e jiri zọpịa Ya. E boro Ya ntamahụhụ niile wetaara anyị ahụ izu oke.

Ọ bụkwa site n’ọnya Ya ka e ji gwọọ anyị. Anyị niile kpafuru akpafu ka igwe atụrụ; onye ọ bụla n’ụzọ nke ya. Ma Onyenweanyị buuru mmehie anyị niile bokwasa Ya. E mesiri Ya ike, ma O jiri umeala digbuo ihe niile na ndidi.

Ọ tụpụghị ọnụ ọ bụla dịka nwatụrụ a kpụ na-eje ebe a ga-egbu ya. Ọ dara ogbi dịka nne atụrụ a na-akpacha ajị. E jidere Ya n’ike, maa Ya ikpe, kpụrụ Ya pụọ. O nwere onye ọ bụla ga-ekwuchite ọnụ Ya?

N’ezie, e jiri aka ike wepụ Ya n’ala ndị dị ndụ. E gburu Ya n’ihi mmehie anyị. E nyere Ya ala ili ebe e nyere ndị njọ. Ya na ọgaranya nwekwara otu ala ili. Ọ bụ ezie na O meghị ihe ọjọọ ọ bụla; O nweghịkwa mgbe ọ bụla O jiri kwurụọ ọnụ, ma ọ sọrọ Onyenweanyị iji ahụhụ gwerie Ya.

Ọ bụrụ na O jiri ndụ Ya chụọ aja mmeda obi, Ọ ga-ahụ ndị ga-eri Ya ekpe. Ọ ga-enwe ogologo ndụ. A ga-esikwa n’aka Ya mezuo ihe Onyenweanyị chọrọ.

Mgbe Ọ pụtara na ndụ ahụhụ Ya, Ọ ga-ahụ ihe bịakwa ñụrịa ọñụ ọzọ. Site n’ahụhụ Ya, nwodibo M ga-eme ka a gụnye ọtụtụ mmadụ na ndị ezi omume, bịakwa bokwasa onwe ya mmehie ha.

Maka ihi Ya, aga m eji nnụ kwuru nnụ igwe mmadụ akwụ Ya ụgwọ. Ọ ga-esoro ndị bụ dike n’ọgụ kerie ihe a lụtara n’agha. Ebe ọ bụ na O weere onwe Ya nye n’ọnwụ, a gụnyere Ya ebe a a gụnyere ndị njọ. Ma O buuru mmehie ọtụtụ mmadụ, na-arịọkwa arịrịọ mgbe niile maka ndị mmehie.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 30:2.6.12-13, 15-17.25 Az. Lk. 23:46

Azịza: Nna, n’aka Gị ka M tinyere mkpụrụobi M.

1. Onyenwe m, agbatara m ọsọ ndụ n’ime Gị.

E kwela ka ihere megbuo m.

Were ezi omume Gị tọhapụ m.

Onyenwe m, n’aka Gị ka m tinyere mkpụrụobi m.

Azịza: Nna, n’aka Gị ka M tinyere mkpụrụobi M.

2. N’ihu ndị iro m niile, abụ m ihe nkọcha;

bụrụkwa ihe a na-akwa emu n’aka ndị agbata obi m;

na ihe a na-asọ oyi n’ihu ndị enyi m.

Azịza: Nna, n’aka Gị ka M tinyere mkpụrụobi M.

3. Ndị hụrụ m n’ụzọ na-agbara m ọsọ.

Adị m ka onye nwụrụ anwụ,

ndị mmadụ chefuru echefu.

A dịkwa m ka ihe a tụfuru atụfu.

Azịza: Nna, n’aka Gị ka M tinyere mkpụrụobi M.

4. Ma mụ onwe m,

e nwere m ntụkwasị obi n’Onyenweanyị.

E kwuru m sị: “Ị bụ Chincke m”.

Ndụ m nọ Gị n’aka.

Zọpụta m n’aka ndị kpọrọ m asị.

Azịza: Nna, n’aka Gị ka M tinyere mkpụrụobi M.

5. Ka ihu tọọ Gị ọchị n’ebe nwodibo Gị nọ.

Zọpụta m n’ịhụnanya Gị.

Ka ndị niile chekwubere n’Onyenweanyị nwee obisike.

Guzosienụ ike.

Azịza: Nna, n’aka Gị ka M tinyere mkpụrụobi M.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:14-15, 5:7-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi e degaara ndị Hibru

Isi Okwu: O sitere n’ahụhụ mụta ihuwe isi. O wee ghọọrọ ndị niile na-asọpụrụ Ya isi iyi nke ndụ ebighị ebi.

Ka anyị jidesienụ aka ike n’okwukwe ahụ anyị kwupụtara. N’ihi na a bịa na Jesu Nwa Chineke, anyị nwere nnukwu onye isi nchụaja bụ e kwuchaa, ọ gwụ; Onye gafeere banye n’eluigwe kacha elu.

Onye isi nchụaja ukwu ahụ anyị nwere abụghị nke na-enweghị ike isoro anyị ghọta ihe bụ adịghị ike mmadụ. Kama anyị nwere onye isi nchụaja e leghara elegha; nke a nwakwara ọnwụnwa, n’ụzọ ọ bụla e si anwa anyị, ma O mehieghị.

N’ihi ya, ka anyị werenụ obisike bịaruo oche eze nke amara; ka anyị si n’aka Chineke nweta ebere, bịakwa chọta amara mgbe anyị nọ na mkpa enyemaka.

Mgbe Jesu dị ndụ n’anụ ahụ, O jiri ịkwa akwa siri ike, na ịsụ ude n’obi na anya mmiri, chee ekpere na arịrịọ n’ihu Onye ahụ nwere ike ịzọpụta Ya n’ọnwụ. O jiri umeala rube isi, nke na a nụrụ arịrịọ Ya.

Ọ bụ ezie na Ya Onwe Ya bụ Nwa Chineke. Ma O sitere n’oke ahụhụ mụta irube isi. Mgbe Ọ bịara zuo oke, Ọ ghọọrọ ndị niile na-erubere Ya isi, isi iyi nke nzọpụta ebighị ebi.

MBEKU – Filipaị 2:8-9

Kristi budagidere Onwe Ya ala ruo nke ịnara ọnwụ; ruorị na nke ịnara ọnwụ n’elu obe. Ma Chineke buliri Ya elu wee nye Ya aha kacha aha niile.

AKỤKỌ AHỤHỤ NKE ONYENWEANYỊ JESU KRISTI DỊKA JỌN SIRI DEE YA.

Jọn. 18:1-19: 42

K = KRISTI

Ọ = ỌKỌ AKỤKỌ

N = NDỊ MMADỤ

Ọ: Jesu na Ụmụazụ Ya bịara gafee ọdọ mmiri Kidrọn, ruo otu ubi a gbara ogige. Ya na Ụmụazụ Ya wee baa n’ogige ahụ. Ma Judas, onye raara Ya nye, maara ebe ahụ nke ọma, n’ihi na ọtụtụ oge ka Jesu na Ụmụazụ Ya na-ezukọ n’ebe ahụ. Judas bịara n’ebe ahụ, ya na ndị agha na ndị nche nke ndị isi nchụaja na ndị Farisii dunyere ya. Ha ji ngwa agha ha, na ọwa, na mmụ-ọkụ ha. Ma, ebe Jesu maara ihe niile ga-abịakwasị Ya, O jekwuuru ha, wee jụọ ha sị:

K: Onye ka ụnụ na-achọ?

Ọ: Ha wee zaa Ya sị:

N: Jesu Onye Nazaret.

Ọ: Jesu wee sị ha:

K: Mụ onwe M bụ ya.

Ọ: Ma Judas, onye raara Ya nye so ha guzo ebe ahụ. Mgbe Jesu sịrị ha: ‘Mụ Onwe M bụ Ya’, ha laghachiri azụ daa n’ala. Jesu wee jụkwaa ha ọzọ sị:

K: Onye ka ụnụ na-achọ?

Ọ: Ha wee sị:

N: Jesu onye Nazaret.

Ọ: Jesu zaghachiri, sị:

K: Agwala M ụnụ na Mụ Onwe M bụ Ya. Ọ bụrụ na ụnụ na-achọ M, hapụnụ ndị a ka ha laa.

Ọ: O kwuru nke a ka okwu O kwuru mbụ wee mezuo, sị: “A bịa na ndị niile I nyere M, ọ dịghị onye ọ bụla M tụfuru”. Mgbe ahụ, Saịmọn Pita mịịrị mma agha o ji, gbuo odibo onye isi nchụaja, wee bepụ ya ntị aka nri. Aha odibo ahụ bụ Malkụs. Jesu wee sị Pita:

K: Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya! Iko ahụhụ nke Nna M nyere M, i chere na agaghị M añụ ya?

Ọ: Otu ndị agha ahụ na ọchịagha ha, na ndị nche nke ndị Juu wee jide Jesu, kee Ya agbụ, wee buru ụzọ duru ya jekwuru Anas. N’ihi na Anas bụ ọgọ nwoke Kaịfas, onye bụ onye isi nchụaja n’afọ ahụ. Ma Kaịfas bụ onye ahụ dụrụ ndị Juu ọdụ na mbụ, na ọ ka mma ka otu onye nwụtara ọha ndị Juu ọnwụ. Saịmọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ Jesu, nke onyeisi nchụaja maara, sooro Jesu. O wee soro Jesu banye n’obi onye isi nchụaja. Ma Pita guzoro n’ezi, n’ọnụ ụzọ. Nwaazụ Jesu nke ọzọ ahụ, onye isi nchụaja maara, wee pụọ n’ezi rịọ nwa-agbọghọ na-eche ọnụ ụzọ, o wee kpọbata Pita. Ma nwa-agbọghọ ahụ na-eche ọnụ ụzọ jụrụ Pita sị:

N: Ị bụghị otu onye n’ime ndị Ụmụazụ Nwoke a?

Ọ: Pita wee zaa, sị:

N: Abụghị m.

Ọ: N’abalị ahụ, oyi na-atụ. Ndị agha na ndị na-ejere onyeisi nchụaja ozi nọ nso n’akụkụ ọkụ a kwanyere n’ebe ahụ na-anya ọkụ. Pita gara soro ha guzo na-anyakwa ọkụ. N’oge ahụ onyeisi nchụaja ahụ malitere ịjụ Jesu ajụjụ banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ihe ọ na-ezi ha. Ma Jesu zara ya, sị:

K: Agwala M ụwa okwu Chineke n’ihu ọha. Oge niile ka M na-akụzi nkuzi n’ụlọ ekpere, na n’Ụlọ Nsọ Chineke, ebe ndị Juu niile na-agbakọta. Ọ dịghị ihe ọ bụla M kwuru na nzuzo. Gịnị mere i ji ajụ M? Jụọ ndị nụrụ ihe M kwuru. Jụọ ha ihe M gwara ha. Lee, ha amarala ihe M kwuru.

Ọ: Mgbe O kwuru nke a, otu onye n’ime ndị nche ndị guzo nso n’ebe ahụ wee maa Jesu aka na ntị, sị Ya:

N: Ọ bụ otu a ka I si na-asa onye isi nchụaja ajụjụ?

Ọ: Jesu wee sị ya:

K: Ọ bụrụ na ekwuru M ajọ okwu, gwa ọha mmadụ ajọ okwu ahụ M kwuru. Ma ọ bụrụ na ekwuru M nke ọma, gịnị mere i ji eti M ihe?

Ọ: Anas zigara Jesu n’agbụ, ka O jekwuru Kaịfas onye isi nchụaja. Ma Saịmọn Pita ka guzo n’ebe ahụ na-anya ọkụ. Ndị ọzọ wee jụọ ya, sị:

N: Ị bụghị otu onye n’ime ndị Ụmụazụ Nwoke a?

Ọ: Ma ọ gọrọ agọ, sị:

N: Abụghị m.

Ọ: Otu onye n’ime ndị ohu onye isi nchụaja nọ n’ebe ahụ; nke bụ nwanna onye ahụ Pita bepụrụ ntị aka nri ya, wee jụọ Pita sị:

N: Ọ bụghị gị ka m hụrụ n’ime ubi ahụ a gbara ogige, gị na Jesu?

Ọ: Ma Pita gọkwara ọzọ. Ngwa ngwa, oke ọkụkọ wee kwaa akwa. Ha si n’ụlọ Kaịfas kpụrụ Jesu gaa n’ụlọ Paịlet onye n’achị Jerusalem. Mgbe ahụ bụ n’isi ụtụtụ. Ndị Juu ahụ abanyeghị n’ime ụlọ Paịlet ka ha ghara imerụ onwe ha. Ha mere otu a ka ha wee dị ọcha maka Oriri Ngabiga. Paịlet pụkwuru ha n’ezi jụọ ha, sị:

N: Olee ebubo ụnụ na-ebo Nwoke a?

Ọ: Ha zara ya, sị:

N: A sị na Onye a abụghị onye na-eme arụ, anyị agaraghị akpụtara gị Ya.

Ọ: Paịlet sịrị ha:

N: Kpọrọnụ Ya n’onwe ụnụ; kpeenụ Ya ikpe dịka iwu ụnụ si dị.

Ọ: Ndị Juu wee sị ya:

N: Iwu enyeghị anyị ike igbu onye ọ bụla.

Ọ: E mere nke a ka e mezuo okwu Jesu kwuru mgbe O gosiri ụdị ọnwụ Ọ gaje ịnwụ. Paịlet banyere ọzọ n’ime ụlọ ikpe ya, wee kpọọ Jesu, jụọ Ya sị:

N: Ị bụ eze ndị Juu?

Ọ: Jesu wee jụọ ya sị:

K: Ị na-ekwu nke a n’onwe gị, ka ọ bụ ndị ọzọ gwara gị okwu banyere M?

Ọ: Paịlet zara, sị:

N: I chere na abụ m onye Juu? Ndị obodo Gị na ndị isi nchụaja ụnụ duuru Gị bịakwute m. Gịnị ka I mere?

Ọ: Jesu wee zaa, sị:

K: Alaeze M abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze M bụ nke ụwa a, ndị agha M gaara alụ ọgụ, ka a ghara ịrara M nye n’aka ndị Juu. Ma otu ọ dị, alaeze M esiteghị n’ụwa nke a.

Ọ: Paịlet wee sị Ya:

N: Ọ pụtaranụ na Ị bụ eze?

K: Ee, abụ M eze. Ihe e ji mụọ M n’ụwa na ihe M ji bịa n’ụwa bụ ka m gbaara ezi okwu ahụ akaebe. Onye ọ bụla guzoro n’ụzọ eziokwu na-anụ olu M.

Ọ: Paịlet wee jụọ Ya sị:

N: Eziokwu? Gịnị bụ eziokwu?

Ọ: Mgbe Paịlet kwuru nke a, ọ pụkwuuru ndị Juu ọzọ, wee sị ha:

N: Ọ dịghị ihe ọ bụla kwesịrị ịma ikpe ọnwụ m hụrụ O mere. Ma dịka omenala ụnụ si dị, ana m ahapụrụ ụnụ otu onye mkpọrọ n’oge mmemme Ngabiga ọ bụla. Ya mere, ụnụ chọrọ ka m hapụrụ ụnụ Eze ndị Juu?

Ọ: Ma ha tiri mkpu ọzọ, sị:

N: Mbaa! Ọ bụghị Nwoke a! Kama hapụrụ anyị Barabas!

Ọ: Ma Barabas bụ onye na-apụnara mmadụ ihe n’ike. Paịlet wee kpọrọ Jesu, pịa Ya ihe. Ndị agha weere ogwu kpaa okpu eze, kpube Ya n’isi, werekwa uwe na-acha uhie uhie yikwasị Ya. Ha wee bịakwute Ya, sị Ya:

N: Ekele, Eze ndị Juu!

Ọ: Ha jikwa aka ha tie ya ihe otiti. Paịlet wee pụọ ọzọ n’ezi, sị ha:

N: Lee, aga m akpụpụtara Ya ụnụ n’ezi, ka ụnụ wee mara na ọ dịghị ihe kwesịrị ikpe ọnwụ m hụrụ O mere.

Ọ: A kpọpụtara Jesu n’ezi. Okpu ogwu ahụ dị ya n’isi. O yikwa uwe ahụ na-acha uhie uhie. Paịlet sịrị ha:

N: Leenụ Nwoke ahụ!

Ọ: Mgbe ndị isi nchụaja na ndị nche hụrụ Ya, ha tiri mkpu sị:

N: Kpọgide Ya n’obe! Kpọgide Ya n’obe!

Ọ: Paịlet wee sị ha:

N: Kpọrọnụ Ya, gaa kpọgide ya n’onwe ụnụ. Ọ dịghị ihe kwesịrị ikpe ọnwụ m hụrụ O mere.

Ọ: Ma ndị Juu zara ya sị:

N: Anyị nwere iwu nke kwuru na O kwesịrị ọnwụ, n’ihi na O ji aka mee onwe Ya Nwa Chineke.

Ọ: Mgbe Paịlet nụrụ ka ha kwuru nke a, ọ tụrụ egwu nke ukwuu. O wee banye ọzọ n’ime ụlọ ikpe ya, jụọ Jesu sị:

N: Olee ebe I siri bịa?

Ọ: Ma Jesu atụpụrụghị ya ọnụ. Paịlet wee sị Ya:

N: Ị chọghị ịtụpụrụ m ọnụ? Ị maghị na m nwere ike ịhapụ Gị, nwekwaa ike ịkpọgide Gị n’obe?

Ọ: Jesu zara ya sị:

K: I nweghị ike ọ bụla n’ebe M nọ ma ọ bụghị Chineke nyere gị ya. Onye ahụ raara m nye n’aka gị mere njọ karịa.

Ọ: Mgbe Paịlet nụrụ nke a, ọ chọrọ ụzọ ọ ga-esi hapụ Jesu. Ma ndị Juu tiri mkpu, sị:

N: Ị hapụ Nwoke a ka Ọ laa, i gosiri na ị bụkwaghị enyi Siza! N’ihi na onye ọ bụla na-eme onwe ya eze bụ onye iro nke Siza!

Ọ: Mgbe Paịlet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jesu n’ezi, wee nọdụ n’oche-ikpe, n’ebe a na-akpọ Gabata n’asụsụ Hibru, ma ọ bụ “Ọbọ Nkume”. Ihe a mere n’ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie n’ụbọchị Nkwadebe nke mmemme Ngabiga. Paịlet wee sị ndị Juu.

N: Leenụ Eze ụnụ!

Ọ: Ha tiri mkpu, sị:

N: Kpọrọ ya pụọ! Kpọrọ ya pụọ! Kpọgide Ya n’obe!

Ọ: Paịlet jụrụ ha, sị:

N: Ụnụ chọrọ ka m kpọgide Eze ụnụ n’obe?

Ọ: Ndị isi nchụaja wee zaa, sị:

N: Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza!

Ọ: Mgbe ahụ, Paịlet kpọnyere ha Jesu, ka ha kpọgide Ya n’obe. Ha wee kpụrụ Jesu. O wee pụọ, buru obe n’onwe Ya, garuo ebe a na-akpọ Gọlgọta n’asụsụ Hibru, ma ọ bụ “Ebe ọkpọkọrọ isi”. N’ebe ahụ ka ha kpọgidere Ya n’obe, Ya na mmadụ abụọ ọzọ, otu n’aka nri Ya, onye nke ọzọ n’aka ekpe Ya. Paịlet wee dee ihe kụpanye n’elu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a: JESU ONYE NAZARET, EZE NDỊ JUU”. Ọtụtụ n’ime ndị Juu gụrụ ihe Paịlet dere, n’ihi na o dere ya n’asụsụ atọ, Hiburu, Latịn na Grik. Ebe a nọkwa kpọgide Ya n’obe dị nso n’obodo Jerusalem. Ndị isi nchụaja nke ndị Juu wee sị Paịlet:

N: Gbanwee ihe i dere n’elu obe ahụ. Ị garaghị ede na ọ bụ eze ndị Juu, kama na ọ sịrị, “Mụ onwe M bụ Eze ndị Juu!”

Ọ: Ma Paịlet zara, sị:

N: Ihe m dere, edeela m ya.

Ọ: Mgbe ndị agha ahụ kpọgidesịrị Jesu n’obe, ha chịịrị uwe Ya kee ha ụzọ anọ. Onye ọ bụla n’ime ha wee keta otu ụzọ. Ma ha ekeghị otu uwe mwụda Ya, n’ihi na a kpara ya akpa. O nweghị ebe a dụkọtara ya adụkọta. Ha gwarịtara onwe ha sị:

N: Ka anyị hapụ ịdọka uwe a adọka. Kama ka anyị fee nza wee mara onye ọ ga-abụ nke ya.

Ọ: Emere nke a ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ sị: “Ha kere uwe M n’etiti onwe ha. Ha fere nza onye ga-eketa uwe mwụda M.” Ndị agha ahụ mere ihe ndị a.” Meri, nne Jesu, na nwanne ya nwanyị bụ Meri nwunye Kleopas, na Meri Magdalin, guzo nso n’ebe ahụ a kpọgidere Jesu n’obe. Mgbe Jesu hụrụ nne Ya na Nwaazụ Ya ahụ Ọ hụrụ n’anya, ka o guzo n’ebe ahụ, Ọ sịrị nne Ya:

K: Nwanyị, lee nwa gị nwoke!

Ọ: Ọ sịkwara Nwaazụ Ya ahụ bụ Jọn:

K: Lee, nne gị!

Ọ: Site n’oge ahụ, Nwaazụ Ya ahụ kpọọrọ nne Jesu laa, ka o biri n’ụlọ ya. Ma Jesu amatala na ihe niile ezuola ugbu a. Ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo, Ọ sịrị:

K: Akpịrị na-akpọ M nkụ.

: Ma otu ite nke mmanya gbara ụka juru, dọrọ n’ebe ahụ. Ha weere ogbo, denye ya na mmanya ahụ gbara ụka, tụkwasị ya n’elu ngalaba osisi hisọp, welie ya elu detu Ya n’ọnụ Jesu. Mgbe Jesu deturu mmanya ahụ gbara ụka ọnụ o tiri mkpu sị:

K: O zuola!

Ọ: O wee hulata isi, kubie ume (sekpurunụ ala). Mgbe ahụ ndị Juu rịọrọ Paịlet ka ha gbajisịa ụkwụ ndị ahụ a kpọgidere n’obe, ka ha wee nwee ike ibutu ha n’elu obe. Ha mere nke a n’ihi na ụbọchị ahụ bụ Fraịdee, Ụbọchị Nkwadebe. Ha achọghịkwa ka ozu ndị ahụ dịrị n’elu obe n’Ụbọchị Izuike, n’ihi Ụbọchị Izuike nke izu ahụ bụ oke ụbọchị. Ndị agha ahụ wee bịa, gbajisịa ụkwụ nke onye mbụ na nke onye ọzọ a kpọgbukọtara Ya na ha n’obe. Ma mgbe ha rutere na obe Jesu, ha chọpụtara na Ọ nwụọlarị. N’ihi nke a ha agbajighị ụkwụ Ya. Kama otu onye agha mara Ya ube n’akụkụ. Ngwa ngwa ọbara na mmiri wee gbapụta. Onye jiri anya ya abụọ hụ otu ihe a si mee kọrọ akụkọ a ka ụnụ wee kwere. Akụkọ ọ kọrọ bụkwa ezi okwu. Ya onwe ya makwa na ya na-ekwu ezi okwu. Ihe ndị a mere ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Agaghị agbaji ọ bụna otu ọkpụkpụ Ya.” E dekwara n’ebe ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ sị: “Ha ga-elegide Ya anya, bụ onye ahụ ha mara ube”. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Josef onye Arịmatịa bịara, rịọ Paịlet ka o buru ozu Jesu lie. Ma Josef a bụ onye na-eso Jesu na nzuzo n’ihi egwu ndị Juu. Paịlet wee kwenye, ya mere, Josef bịara buru ozu Jesu. Nịkọdịmọs, onye ahụ jiri abalị bịakwute Jesu na mbụ, bịakwara ebe ahụ, o wetara mmanụ otite nke a gwara ya na mgba-ilu na-esi isi ụtọ a na-akpọ myrrh; nke ọnụ ahịa ya karịrị narị naịra na ụma. Ha abụọ buuru ozu Jesu, were akwa ọcha kee Ya, teekwa Ya ude ụtọ ndị a, dịka omenala ili ozu nke ndị Juu si dị. N’ebe ahụ a kpọgburu Jesu, otu ogige dị. N’ime ogige ahụ, otu ili ọhụrụ dị nke a na-elibeghị ozu ọ bụla n’ime ya. Ebe ụbọchị ahụ bụ Ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, na ebe ili ahụ dịkwa nso, ha liri Jesu n’ebe ahụ.

Igbo Mass Readings for April 19 2025, Ụka Mbilite N’Ọnwụ Onyenweanyị (Satọdee N’Izuụka Dị Asọ) – Afọ nke Atọ

Igbo Good Friday Readings 2025 – April 18 2025 (Ezi Fraịdee).