Igbo Mass Readings for December 23 2025, Tuzde

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 23 2025, Tuzde

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-4, 23-24

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye amụma Malaki

Lee, ana m ezipụ onyeozi m ka ọ kwadoro m ụzọ. Ma Yahweh onye nke ụnụ na-atụ anya ya ga- abata n’ụlọnsọ ya na mberede; lee onyeozi nke ọgbụgbandụ ahụ ụnụ na-enwe mmasị na ya na- abịa.

Ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu. Ma onye ga-edi ụbọchị ọbịbịa ya, onye ga- eguzokwa ma ọ pụta? “N’ihina ọ ga-adị ka ọkụ ihe nñụcha na ncha e ji asụ akwa; ọ ga-anọdụ ala dịka onye nñụcha na nsacha nke ọlaọcha, ọ ga- asachakwa ụmụ Levaị ma ñụcha ha dị ka ọlaedo na ọlaọcha ruo mgbe ha ga-ewetera Yahweh ihe onyinye kwesịrị ekwesị.

Mgbe ahụ onyinye nke Juda na Jerusalem ga-amasị Yahweh dịka ọdị na mgbe ochie n’afọ ndị ahụ gara aga. “Lee, aga m ezitere ụnụ Elaịja tupu oke ụbọchị nke Yahweh ahụ dị egwu abịa.

Ọ ga-atụgharịkwa obi ndị nna n’ebe ụmụ ha nọ, ma tụgharịkwa obi ụmụ n’ebe ndị nna ha nọ, ma ọ bụghị otu ahụ, aga m abịa ịbụ ala ahụ ọnụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 25: 4-5. 8-9, 10.14.

Azịza: Welitenụ isi ụnụ, lelie anya elu, n’ihi na oge mgbapụta ụnụ abịala nso.

1. Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenweanyị,

Kụziere m ụzọ gị,

Dube m n’ụzọ eziokwu gị,

ma kụzibere m.

N’ihina ọ bụ Chineke onye nzọpụta m.

Azịza: Welitenụ isi ụnụ, lelie anya elu, n’ihi na oge mgbapụta ụnụ abịala nso.

2. Onyenweanyị dị mma, bụrụkwa onye eziomume,

Ọ na-akụziri ndị mmehie ụzọ,

Ọ na-eduzi ndị umeala n’ihe niile kwụ ọtọ.

Ọ na-akụziri ndị ogbenye ụzọ ya.

Azịza: Welitenụ isi ụnụ, lelie anya elu, n’ihi na oge mgbapụta ụnụ abịala nso.

3. Ụzọ nke Onyenweanyị bụ ịhụnaanya na eziokwu,

n’ebe ndị na-edebe iwu ya na ọgbụgbandụ ya ọo.

Ndị na-atụ Onyenweanyị egwu maara ihe omimi ya,

Ọgbụgbandụ ya na-enye ha nghọta.

Azịza: Welitenụ isi ụnụ, lelie anya elu, n’ihi na oge mgbapụta ụnụ abịala nso.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Bịa n’etiti anyị Ịmmanuel, gị bụ Chineke nọ n’etiti anyị, gị bụ eze anyị, gị bụkwa onye ikpe anyị, zọpụta anyị Onyenweanyị na Chineke anyị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1:57-66

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọziọma dị asọ nke Luk dere.

Ugbu a, oge ruru mgbe Elizabet ga-eji mụọ nwa, o wee mụọ nwa nwoke. Mgbe ndị agbataobi na ndị ikwu na ibe ya nụrụ na Dinwenụ egosila ebere ya n’ebe ọ nọ, ha sooro ya ñụrịa ọñụ.

N’ụbọchị nke asatọ ha zukọrọ ibi nwata ahụ ugwu, ha gaara akpọ ya Zekarịa, aha nna ya. Ma Elizabet zara sị, “Mba; a ga-akpọ ya Jọn.” Ha azaa ya sị, “O nweghị onye ọbụla n’ime ndị ikwu na ibe gị na-aza aha dị otu a.”

Ha meere nna ya akara ka ha mara aha ọ chọrọ ka a kpọọ nwa ya. O wee rịọ ka enye ya ihe eji ede akwụkwọ O dere, “Aha ya bụ Jọn.” Nke a tụrụ ha niile n’anya. Ozigbo ahụ, ọnụ ya meghee, ire ya tọghepụ, ọ bịa kwube okwu, na-agọzi Chineke.

Ụjọ tụrụ ndị agbataobi ha niile. Ndị mmadụ kwusara ihe ndị a n’obodo niile nke Judia: Ndị niile nụrụ ihe merenụ chebaara ihe ndị a echiche, na-ajụ sị, “Gịnị ka nwatakịrị a ga-abụ?” N’ihina ike nke Dinwenụ nọnyeere ya.

Igbo Mass Readings for December 24 2025, Wenezde

Igbo Mass Readings for December 23 2025, Tuzde