Igbo Mass Readings for January 4 2025 – Satọde
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 4 2025 – Satọde
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:7-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Jọn nke mbụ
Ụmụntakịrị, ụnụ ekwela ka onye ọbụla duhie ụnụ. Onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi bụ onye ezi omume dịka ya onwe ya si bụrụ onye eziomume. Onye ọbụla na-eme njọ bụ nwa nke Ekwensu.
N’ihina Ekwensu emehiela site na mbido. Ihe mere Nwa nke Chukwu ji pụta ihe bụ ka ọ laa ọrụ niile nke Ekwensu n’iyi. Onye ọbụla bụ nwa nke Chukwu anaghị eme njọ, n’ihi na ọdịdị nke Chineke dị n’ime ya.
O nweghị ike ime njọ n’ihina ọ bụ nwa nke Chukwu. N’ụzọ dị otu a ka a ga-esi chọpụta ndị bụ ụmụ Chineke na ndị bụ ụmụ Ekwensu. Onye ọbụla na anaghị eme ihe ọma ma ọ bụ hụ nwa nne ya n’anya, abụghị onye nke Chukwu.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98: 1, 7-8, 9,
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube,
aka nri ya na aka ya dị nsọ eweterela ya mmeri.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
2. Tienụ mkpu, osimiri na ihe niile dị n’ime ya,
ụwa na ndị niile bi n’ime ya!
Ka iyi niile kụọ aka ha,
ka ugwu niile kwee ukwe añụrị n’ihu Dinwenụ.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
3. Onyenweanyị na-abịa,
Ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe,
ọ ga-eji ikpe ziri ezi were kpee ụwa ikpe.
Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ were kpee ndị mmadụ ikpe.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Ụbọchị dị asọ adakwasala anyị. Ka mba niile sekpuoro Onyenweanyị. Taa nnukwu ihè achakwasala anyị.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 1: 35-42.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
N’ụbọchị nke ọzọ, Jọn na mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya kwụ. Mgbe ọ hụrụ Jesu ka ọ na- aga. Ọ sịrị, “Leenụ nwatụrụ nke Chukwu!” Ka mmadụ abụọ ahụ ndị na-eso ụzọ ya nụrụ ihe o kwuru, ha sobere Jesu.
Jesu tụgharịrị hụ ka ha na-eso ya, sị ha, “Gịnị ka ụnụ na-achọ?” Ha zara ya sị, “Rabaị” (nke pụtara onye nkuzi) “Olee ebe i bi?” Ọ sịrị ha, “Bịanụ ka ụnụ hụ.”
Ha bịara ma hụ ebe o bi. Ha nọnyeere ya ụbọchị ahụ, n’ihina ọ bụ ihe dịka elekere nke anọ. Andru nwanne Saịmọn Pita bụ otu onye n’ime mmadụ abụọ ahụ, nụrụ ihe Jọn kwuru, wee sobe Jesu.
Ihe mbụ o mere bụ na ọ chọtara nwanne ya bụ Saịmọn sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ,” nke pụtara ma a sụgharịa ya “Kristi.” Ọ kpọtaara ya Jesu. Jesu elee ya anya sị, “Ya bụ, Ị bụ Saịmọn nwa Jọn? A ga-akpọzi gị Kefas,” nke pụtara “Okwute”.
Igbo Mass Readings for January 5 2025 – Nleta nke Ndịeze Atọ si Ọwụwa Anyanwụ
Igbo Mass Readings for January 4 2025 – Satọde