Igbo Mass Readings for January 5 2029 – Fraịde
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 5 2029 – Fraịde.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:11-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Jọn nke mbụ
Nke a bụ ozi nke ụnụ nụrụ site na mbido, na anyị ga-ahụrịta onwe anyị n’anya. Anyị agaghị adị ka Ken, onye bụụrụ onye nke ajọ onye ahụ, ma gbuo nwanne ya.
Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ n’ihina omume ya rụrụ arụ, ma nke nwanne ya ziri ezi. Ya agbala ụụu gharịị na ụwa kpọrọ ụnụ asị. Anyị maara na anyị esila n’ọnwụ banye na ndụ n’ihina anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya.
Onye ọbụla na- anaghị ahụ mmadụ ibe ya n’anya, ka nọkwa n’ime ọnwụ. Onye ọbụla kpọrọ nwanne ya asị, bụ onye ogbu ọchụ. Ụnụ makwaara nke ọma na onye ogbu ọchụ enweghị ndụ ebighịebi n’ime ya.
Na nke a ka anyị ji mara ihe ịhụnaanya bụ: na ọ tọgbọrọ ndụ ya n’ihi anyị. Anyị kwesịkwara ịtọgbọ ndụ anyị maka ụmụnna anyị. Ọ bụrụ na mmadụ nwere akụ nke ụwa, ma hụ nwanne ya ka ọ nọ na mkpa, mechie obi ya, olee otu ịhụnaanaya Chukwu si biri n’ime ya?
Ụmụntakịrị, ka anyị ghara ịdị na-ahụ n’anya naanị n’egbugbereọnụ ma ọ bụ n’okwu. Kama ka anyị na-ahụ n’anya site n’omume na n’eziokwu. N’ụzọ dị otu a, anyị ga-ama na anyị bụ ndị nke eziokwu, ma mekwaa ka obi anyị sie ike n’ihu ya, mgbe ọbụla mmụọ anyị na-ama anyị ikpe, anyị ga-amata na Chineke kariri mmụọ anyị; ọ mazukwara ihe niile.
Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ na mmụọ anyị anaghị ama anyị ikpe, anyị ga-enwe obi siri ike iguzo n’ihu Chukwu.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 100:1-2, 3, 4, 5.
Azịza: Ka ụwa niile tijere Onyenweanyị mkpu ọñụ
1. Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,
Werenụ ọñụ fee Onyenweanyị ofufe.
Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu ya.
Azịza: Ka ụwa niile tijere Onyenweanyị mkpu ọñụ
2. Maranụ na Onyenweanyị bụ Chineke,
ya kere anyị, Ọ bụkwa ya nwe anyi,
anyị bụ ndị nke ya,
anyị bụkwa igwe atụrụ ya.
Azịza: Ka ụwa niile tijere Onyenweanyị mkpu ọñụ
3. Werenụ ekele baa n’ọnụụzọama ya niile,
werenụ otito baa n’ogige ya niile;
kelenụ ya, gọziekwanụ aha ya.
Azịza: Ka ụwa niile tijere Onyenweanyị mkpu ọñụ
4. N’ihi na Onyenweanyị dị mma,
Ịhụnaanya ya na-adị ebeebe,
ntụkwasịobi ya na-adịgide,
bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.
Azịza: Ka ụwa niile tijere Onyenweanyị mkpu ọñụ
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Okwu ahụ bụụrụ mmadụ, wee binyere anyị. Ma ndị nabatara ya, ka o nyere ike ịbụ ụmụ nke Chineke.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 1:43-51.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
N’ụbọchị nke ọzọ, Jesu chọrọ Ị ga Galili, Ọ hụrụ Filip, sị ya, “Sobe m.” Filip bụ onye Betsaịda nke bụ obodo Andru na Pita. Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere n’akwụkwọ iwu, na onye ndị amụma dere banyere, ya bụ Jesu onye Nazaret, nwa Josef.”
Nataniel jụrụ ya sị “O nwere ihe ọma ọbụla nwere ike isi na Nazaret pụta?” Filip zara ya sị “Bịa ka ị hụrụ.” Mgbe Jesu hụrụ Nataniel ka ọ na-abịakwute ya, o kwuru maka ya sị, “Lee ezigbo onye Izrel onye aghụghọ ọbụla na-adịghị n’ime ya!”
Nataniel jụrụ ya sị, “Olee ebe ị nọ mara m?” Jesu azaa ya sị, “Tupu Filip akpọọ gị mgbe ị nọ n’okpuru osisi Fiig, ahụrụ m gị.” Nataniel zara ya sị “Rabaị (Onye nkụzi), ị bụ nwa Chineke! Ị bụkwa eze nke Izrel!”
Jesu zara ya sị, “Ọ bụ n’ihina m gwara gị na m hụrụ gị n’okpuru osisi Fiig ka i ji kwere? Ị ga-ahụ ihe ịtụnaanya kariri ndị a.” Ọ sịrị ya, “N’ezie, n’ezie, agwa m gị, ị ga-ahụ eluigwe ka o meghere, hụkwa ndị Mmụọ ọma nke Chineke ka ha na-arịgo na-arịdatakwa n’ahụ nwa nke mmadụ.”
Igbo Mass Readings for January 6 2029 – Satọde
Igbo Mass Readings for January 5 2029 – Fraịde