Igbo Mass Readings for March 25 2025, Nnukwu Emume Ikwupụta Ịtụrụ-ime nke Onyeweanyị.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 25 2025, Nnukwu Emume Ikwupụta Ịtụrụ-ime nke Onyeweanyị.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:10-14: 8:10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Yahweh gwakwara Ahaz ọzọ sị ya, “Rịọ Yahweh Chineke gị akara ọbụla, ọ sọkwa, ya bụrụ nke si n’ala mmụọ mọbụ nke si n’eluigwe.” Mana Ahaz kwuru sị, “Mba, agaghị m arịọ ihe ọbụla agakwaghị m anwale Yahweh.”
O wee sị, “Nụrụnụ nke a ụnụ ụlọ nke Devid niile! Ọ bụụrụ ụnụ obere ihe na ụnụ na-eme ndị mmadụ ka ike gwụ ha, ụnụ ji bịa ime Chineke m otu aka ahụ? Nihi nke a, Yahweh n’onwe ya ga-enye gị akara.
Lee, otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụta nwa nwoke, aha ọ ga-akpọ ya bụ Ịmmanụel. Gbaanụ izu otu ọbụla masịrị ụnụ, ọ gaghị enwe isi; Kwuonụ ihe ọbụla masịrị ụnụ, ọ gaghị ere! n’ihina Chineke anyị nọnyeere anyị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 40: 6-7, 7-8, 9, 10.
Azịza: Anọ m ebe a, Onyenwe m, a bịara m ime uche gị
1. Ị naghị achọ ịchụ aja mọbụ ihe nrunye
kama ntị ghe oghe
Ị naghị achọ aja nsureọkụ mọbụ aja maka njọ,
kama ekwuru m sị, “Anọ m ebe a, ana m abịa.
Azịza: Anọ m ebe a, Onyenwe m, a bịara m ime uche gị
2. N’ime akwụkwọ iwu e dere
na m tosịrị ime uche gị.
Chineke m, ahụrụ m iwu gị n’anya,
eji m obim niile hụ ya n’anya.
Azịza: Anọ m ebe a, Onyenwe m, a bịara m ime uche gị
3. Ekwupụtala m eziomume nke Onyenweanyị
na nnukwu ọgbakọ.
Lee, emechighị m ọnụ m,
ị maara ake a O Onyeweanyị.
Azịza: Anọ m ebe a, Onyenwe m, a bịara m ime uche gị
4. O nwebeghị mgbe m jụrụ ikwupụta eziomume gị,
kama ekwupụtala m nkwụdosiike na enyemaka nzọpụta gị.
Ahapụbeghị m ikwupụta ịhụnaanya na nkwụdosiike gị
n’ihu nnukwu ọgbakọ.
Azịza: Anọ m ebe a, Onyenwe m, a bịara m ime uche gị
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 10:4-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi e degaara ndị Hibru
Ọ bụ he agaghị ekwe omume na ọbara oke ehi na ewu ga-asachapụ njọ. N’ihi nke a, mgbe Kristi bịara n’ụwa o kwuru sị, “Ọ bụghị aja na onyinye ka ị chọrọ kama ọ bụ ahụ ka ị kwadobeere m.”
Aja nsureọkụ na aja mgbagbara njọ anaghị enye gị obi ụtọ. Mgbe ahụ ka m kwuru sị, “Lee, abịara m ime uche gị O Chukwu, dịka e dere banyere m n’Akwụkwọ Nsọ.”
O kwuru na mbụ sị, “Aja onyinye, aja nsureọkụ na aja mgbaghara njọ adịghị amasị gị nke ha na-enye gị obi ụtọ.” (A chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị). O kwukwara sị, “Lee, abịara m ime uche gị.”
Chineke emebiela aja mbụ iji malite nke abụọ site n’ime ya bụ uche Chineke, e mere ka anyị dị ọcha site n’aja ahụ Jesu ji onwe ya wee chụọ naanị otu ugboro.
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Okwu ahụ bụụrụ mmadụ, wee binyere anyị. O jupụtara n’amara na eziokwu.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 1:26-38.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
N’ọnwa nke isii, Chineke zigara Mmụọọma Gebrel ka ọ gaa n’obodo Galili a na-akpọ Nazaret; ka ọ gakwuru otu nwagbọghọ na amaghị nwoke, onye ikwunibe ya kwekọrịtara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n’agbụrụ Devid, ga-alụ.
Aha nwaagbọghọ ahụ bụ Marịa. Mmụọọma ahụ bịakwutere Marịa sị ya, “Ekele, I jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyeere gị!” Obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu n’ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere ịtụle na uche ya ihe ụdị ekele a pụtara.
Mmụọọma ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, Marịa, N’ihina ị natala ngọzi n’aka Chineke, Lee ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke, aha ị ga-akpọ ya bụ Jesu. Ọ ga-adị ukwuu, aga-akpọkwa ya nwa onye kacha elu.
Dinwenụ Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. Ọ ga-achị ezinụụlọ Jekọb ebeebe; alaeze ya agaghị enwe ọgwụgwọ.” Marịa jụrụ Mmụọọma ahụ sị, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ na-amaghị m nwoke.”
Ma Mmụọọma ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N’ihi nke a, a ga-akpọ nwa ahụ ị ga-amụ; onye nsọ, nwa Chineke.
“Lee, Elizabet onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n’agadi ya; ugbu a ọ dị ime ọnwa isii. N’ihina ebe Chineke nọ, o nweghị ihe nyịrị omume.
Marịa kwuru sị, “Lee, abụ m odibo nwaanyị nke Osebụrụwa, ka o reere m ka i siri kwu.” Mmụọọma ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.
Igbo Mass readings for March 26 2025, Wenezde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Igbo Mass Readings for March 25 2025, Nnukwu Emume Ikwupụta Ịtụrụ-ime nke Onyeweanyị.