Kulienụ ka Anyị Jenụ Rie [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Kulienụ ka Anyị Jenụ Rie‘ is one of the popular Igbo Hymns composed by Sam Ojukwu which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Kulienụ ka Anyị Jenụ Rie Lyrics (Key Ab 3/4)

m:f:r/m:-.m:t,/d:-:-/-:-:-

Chorus: Kulienụ k’anyị jenụ rie, kulite k’anyị jenụ rie,

Kulienụ k’anyị jenụ rie, kulite k’anyị jenụ rie,

Kulienụ k’anyị jenụ rie, kulite k’anyị jenụ rie,

Eye k’anyị je, kulitenụ ụmụ nne m,

k’anyị je rie ñụọ, k’anyị je rienụ, ñụọnụ,

Ahụ na ọbara Nwatụlụ Chukwu.

1. Ọbara ya bụ akụ, O nwere ihe ụsọ

O nwere ihe ụsọ nile ya

Akụ nwere n’ime ya ihe ụsọ nile

O nwere ihe ụsọ nile

Oriri na ọñụñụ n’enye ndụ ebeghịebi

O nwere ihe ụsọ nile

Cheta na oriri anyị na-anata bụ Ahụ na Ọbara, Kristi

O nwere ihe ụsọ, O nwere ihe ụsọ nile,

Cheta na ọbụ Sakramenti nke Eucharịstịa.

2. Lokenenụ ka osi bụl’uche Chukwu

Sop: I were Onwe ya meere anyị nri,

Mere anyị nri, mere anyị nri.

Nri nke ndụ ebebe.

Lokenenụ ka o si bụlụ uche Chukwu,

uche Chukwu uche Chukwu.

Lokenenụ ka o si bụlụ uche Chukwu,

uche Chukwu uche Chukwu,

I were onwe ya meere anyị nri,

Nri mkpụrụobi, meere anyị nri Nri mkpụrụobi,

meere anyị nri, Nri nke ndụ ebebe.

3. K’anyị sekpuere Dinwenụ Kristi

K’anyị sekpuere Dinwenụ Kristi

K’anyị sekpuere Dinwenụ Kristi,

Na Sakramenti nke kachasị nsọ

K’anyị sekpuere Dinwenụ,

k’anyị tie isi ala gbue ikpere nye Dinwenụ,

K’anyị sekpuere Dinwenụ,

Onye gosịgoro anyị ebere ya.

Ndị otu Kristi bukọtanụ ihe egwu dị mma,

Bukọtanụ ihe egwu dị oke ọnụ,

chịrịnụ une na ụbọ akwara too ya,

wetanụ ọja, wetanụ ụbọ, wetanụ opi na une,

werenụ egwu otito too ya,

bụọrọ Eze ebube Chukwu anyị abụọma,

bụọrọ Eze ebube Chukwu anyị abụọma.

4. Otito na Ngọzi dịrị Chukwu Nna na Nwa,

Otito na Ngọzi dịrị Chukwu Nna na Nwa, na Chukwu Mmụọ Nsọ,

Nsọpụrụ dịrị Chineke, Atọ n’ime otu dị Ngọzi,

Ugwu na ịdị nsọ dịrị Ha, ugwu na ịdị nsọ dịrị Ha,

ugwu na ịdị nsọ dịrị Ha ebebe, ugwu na ịdị nsọ,

ugwu na ịdị nsọ ugwu na ịdị nsọ ugwu na ịdị nsọ

ugwu na ịdị nsọ dịrị Ha ebebe,

Ugwu na ịdị nsọ dịrị ha Amen, Amen, Amen.

Other Igbo Communion Hymns

Other Catholic Hymns