Igbo Mass Readings for October 1 2025, Emume Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 1 2025, Emume Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:1-5,8-11, 16
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Abụọ Nke Samuel
Isi Okwu: Chineke ga-enye ya ocheeze nke nna nna ya Devid.
Mgbe Devid kwabara n’ụlọ ya, Dinwenụ mere ka ume na obi ruo ya ala. O wee zuoro ndị iro niile gbara ya gburugburu ike.
Mgbe ahụ ka eze gwara onye amụma Netan sị: “Lee, ebi m n’ụlọ sịda! Ma igbe ọgbụgba ndụ nke Chineke bi n’ime mkpuke!”
Netan gwara eze sị: “Ngwa, gaa mee ihe ị bu n’obi, n’ihi na Onyenweanyị nọnyere Gị.”
Ma, n’abalị ahụ, ka okwu Dinwenụ bịakwutere Netan sị: “Gaa gwa nwodibo M Devid sị: “Lee ihe Dinwenụ kwuru: “Ọ bụ gị ga-ewuru M ụlọ M ga-ebi?
Ọ bụ n’ebe ị na-esogharị atụrụ, n’ebe atụrụ na-ata ahịhịa, ka M si kpọpụta gị, ka ị bụrụ onye ndu ndị nke M bụ Izrel.
Anọnyere M gị na nje m gị niile; Egbupịala M ndị iro gị niile n’ihu gị. Aga M eme ka aha gị daa ụda karịa nke onye ọ bụla dị n’elu ụwa.
Aga M edoziri ndị nke M, Izrel, ebe ha ga-anọ.
N’ebe ahụ ka M ga-akụnye ha; ha ga-ebiri n’ebe ahụ n’enweghị nsogbu ọ bụla ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị akpagbukwa ha ọzọ,
otu e si kpagbuo ha na mbụ, mgbe M họpụtara ndị ikpe na-elekọta ndị nke M, Izrel. Aga m eme ka ha zuoro ndị iro ha niile ike.
Onyenweanyị ga-eme ka ị bụrụ onye a ma ama. Onyenweanyị ga-eji aka Ya e wuru gị obi.
Obi gị na ịbụ eze nke gị ga-akwụrụ chịm n’ihu M mgbe niile. Oche-eze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighi ebi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 1 Sam 2:1, 4-8
Azịza: Mkpụrụobi m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m.
1. Mkpụrụobi m na-añụrị na Dinwenụ.
Ike m lara elu na Chineke m.
Ọnụ m achịgbuola ndị iro m n’ọchị,
n’ihi na ana m añụrị n’enyemaka nzọpụta Gị.
Azịza: Mkpụrụobi m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m.
2. Ụta dikeọgụ ka a ggajiri,
mana ndị na-ejighi ume na obi, bụzi ndị ike ha dị egwu.
Ọgaranya jizi isi onwe ya na-agbanwota nri ọnụ;
ma ogbenye ọnụ ntụ akwụsịla idọlịgbu onwe ya.
Nwaanyị aga amụọla ụmụ mmaji asaa;
ma nne mụrụ ọtụtụ ụmụ gbazi aka nwa.
Azịza: Mkpụrụobi m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m.
3. Onyenweanyịna-enye ọnwụ na ndụ.
Ọ bụ Ya na-akwada ndị na-ala mmụọ,
bụkwa Ya na-ekulite ndị nkulite.
Onyenweanyị na-enye ụbịam na ụba.
Ya kwaturu onye nọ n’ala.
Ya bugooro onye nọ n’elu.
Azịza: Mkpụrụobi m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m.
4. Dinwenụ na-esi na ntụ kulite onye ụbịam,
bịakwa si n’ọbụ bugoo onye nọ na mkpa;
ka O nye ha ọnọdụ n’ebe e nyere ndị eze;
bịakwa nye ha oche dị ebube.
Azịza: Mkpụrụobi m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:25-32
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Efesọs
Isi Okwu: Wepụnụ ajọ omume niile dị n’etiti ụnụ
Site ugbu a gawa, hapụnụ okwu ụgha! Na-agwanụ ibe ụnụ naanị eziokwu, n’ihina onye ọ bụla bụ akụkụ ahụ onye nke ọzọ.
Ọ bụrụgodu na a kpasuru gị iwe, a dabakwala na njọ. E kwekwala ka ị bugide iwe n’obi ruo mgbe anyanwụ dara, ka ị ghara inye ekwensu ebe ọ ga-azodo ụkwụ.
Ka onye na-ezubu ohi kwusị izu ohi. Kama ya jisie ike chọta aka ọrụ , ọ ga-eji rụpụta ihe bara uru, iji nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.
Onye ekwekwala ka okwu rụrụ arụ si ya n’ọnụ pụta. Ka onye ọ bụla kwube okwu ga-enyere ndị ọzọ aka, mgbe ọ bụla ohere dapụtara; okwu ga-abara ndị nụrụ ya uru.
Ma ọ bụghị otu ahụ, ọ bụ naanị iwe ka ụnụ na-akpasu Mmụọ Nsọ Chineke, Onye jiri ihe ịrịba-ama Ya kaa ụnụ akara, a ga-eji azọpụta ụnụ, mgbe ụbọchị ahụ bịara.
Ụnụ eburula ndị ọzọ iro n’obi, ma ọ bụ wee iwe, ma ọ bụ gbọja onye ọ bụla, ma ọ bụ kọọ onye ọ bụla ọnụ, ma ọ bụ leda onye ọ bụla anya n’ụdị ọ bụla. Hụnụ ibe ụnụ n’anya.
Werenụ amara ghagharanụ ibe ụnụ, otu Chineke si were amara gbaghara ụnụ n’ime Kristi.
MBEKU
Alleluịa, Alleluịa:
Ngọzi dịrị gị Marịa dị asọ, nwaanyị na-amaghị nwoke, onye tosiri nsọpụrụ dị elu. N’ihi na gị mụrụ Anyanwụ nke eziomume, Onye bụ Kristi Chineke anyị.
Alleluịa.
OZIỌMA – Luk 11:27-28
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Ngọzi dịrị ime mụrụ Gị
Mgbe Jesu na-ekwu okwu, otu nwaanyị siri n’igwe mmadụ ahụ welie olu ya sị: “Jesu! Ngọzi dịrị afọ ime nke mụrụ Gị, na onye nyere Gị ara ị ñụrụ!”
Ma Jesu zara sị: “Ma ngọzi ga-adịkwara ndị nụrụ okwu Chineke, bịakwa debe ya.”
Igbo Mass Readings for October 2 2025, Ncheta Ndị Mmụọọma Ndị Nche
Igbo Mass Readings for October 1 2025, Emume Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa