Igbo Mass Readings for August 15 2025, Nnukwu Emume Mbugoro N’Eluigwe nke Marịa dị Ngọzi.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 15 2025, Nnukwu Emume Mbugoro N’Eluigwe nke Marịa dị Ngọzi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:19:12:1-6, 10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Mkpughe
E mechaa meghee ụlọnsọ Chineke nke dị n’eluigwe. M wee hụ igbe ọgbụgbandụ nke Chineke n’ime ụlọnsọ ya. Amụma, na ọtụtụ olu, na ụda egbeigwe, na ala ọmajijiji, na akụmmiriigwe, wee sọọ.
Ihe ịrịbaama dị oke egwu pụtara ihe n’eluigwe, otu nwaanyị nke yikwasara anyanwụ n’ahụ ya dịka uwe, ọnwa dị n’okpuru ụkwụ ya abụọ, kpakpando iri na abụọ bụkwa okpueze dị ya n’isi.
Nwaanyị ahụ dị ime. Ime na-emekwa ya. O tiri mkpu n’ihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa. Ihe ịrịbaama ọzọ dị oke egwu pụtakwara ihe n’ihu eluigwe, Nke a bụ otu anụndọgbu ukwu nwere nku, a na-akpọ Dragọn.
Anụ ahụ na-acha uhie uhie. O пwere isi asaa, na mpi iri. O kpukwa okpu asaa n’isi ya asaa. O jiri ọdụ ya kụtuo otu ụzọ n’ụzọ atọ nke kpakpando nke igwe, kụdaa ha n’ala.
O guzokwara n’ihu nwaanyị ahụ ime na-eme, na-eche ka ọ mụpụta nwa ya ka o rie ya. Nwaanyị ahụ mụpụtara nwa nwoke onye ga-eji mkpara igwe achị mba niile.
E kuuru nwa ahụ kugara Chineke n’ocheeze ya. Nwaanyị ahụ jiri ọsọ gbaba n’ime ọzara, ebe Chineke kwadoro a ga-anọ lee ya ọmụgwọ otu puku narị abụọ na ụbọchị iri isii.
Anụrụ m oke olu na-ada n’eluigwe sị, “Ugbu a nzọpụta na ike na alaeze nke Chineke anyị na ike ọchịchị nke Kristi ya abịala; n’ihina a chụdala onye nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo ehihie na abalị n’ihu Chineke anyị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 45: 9, 10, 11, 15.
Azịza: Ezenwaanyị guzoro n’aka nri gị, e jiri ọlaedo chọọ ya mma.
1. Ezenwaanyị guzoro n’aka nri gị
yiri ọlaedo nke ọfii.
Azịza: Ezenwaanyị guzoro n’aka nri gị, e jiri ọlaedo chọọ ya mma.
2. Gee ntị ada m, chee ntị n’okwu m ma nụrụ,
chefuo ndị ala gị na ndị ụlọ nna gị.
Azịza: Ezenwaanyị guzoro n’aka nri gị, e jiri ọlaedo chọọ ya mma.
3. Mgbe ahụ ka onye eze ga-ahụ gị na mma gị n’anya
Ọ bụ ya bụ nna gị ukwu, sọpụrụ ya.
Azịza: Ezenwaanyị guzoro n’aka nri gị, e jiri ọlaedo chọọ ya mma.
4. Ha ji nnukwu añụrị
na-abata n’obi eze.
Azịza: Ezenwaanyị guzoro n’aka nri gị, e jiri ọlaedo chọọ ya mma.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 15:20-26
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Ma otu ọ dị, Chineke emeela ka Kristi si na ndị nwụrụ anwụ bilie, bụrụ onye mbụ sirila na ọnwụ bilie. N’ihi ọnwụ sitere n’aka otu nwoke bịa n’ụwa, mbilite na ọnwụ sitekwara n’aka otu nwoke bịa.
Dịka ọnwụ dịịrị mmadụ niile site n’aka Adam, otu aka ahụ ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ n’ime Kristi. Ma a ga-eme ka onye ọbụla bilie ebe ọnọdụ ruru ya n’usoro, Kristi, mkpụrụ mbụ si n’ọnwụ bilie;
E mechaa, ọ bụrụ ndị nke Kristi ga-esote mgbe Ọ ga-abịa. E mechaa, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa: Mgbe Ọ ga-ewere eze nyefee Chukwu Nna n’aka, mgbe O merichara ịbụ isi niile, na ịchị isi niile, na ike niile nke ụwa.
N’ihina Kristi ga-abụgịde eze ruo mgbe O merichara ndịiro ya niile, weda ike ha na okpuru ụkwụ ya. Onye iro nke ikpeazụ Ọ ga-emeri bụ ọnwụ, n’ihina O tinyela ihe niile n’okpuru ụkwụ ya.
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ebugoole Maria n’eluigwe, igwe ndị Mmụọọma Chineke na-ekwe ukwe añụrị.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 1:39-56.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
N’oge ahụ Marịa biliri, gaa ọsịsọ n’otu obodo dị n’ugwu n’ala Judia. Ọ banyere n’ụlọ Zekarịa, kelee Elizabet. Mgbe Elizabet nụrụ olu Marịa, nwa o bu n’afọ wụliri elu.
Elizabet jupụtara na Mmụọ Nsọ wee tie mkpu ọñụ sị, “Ị dị ngọzi n’etiti ụmụnwaanyị niile, ọ dịkwa ngọzi bụ nwa afọ gị bụ Jesu. Olee otu nke a si rute m aka na nne nke Onyenwe m bịara ileta m?
Lee, mgbe m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m n’afọ wụliri elu n’ọñụ. Ngọzi na-adịrị nwaanyị ahụ nke kwere n’ihe niile Dinwenụ gwara ya, ga-emezu.” Marịa kwere ukwe sị: “Mkpụrụobi m na-eto Dinwenụ m, mmụọ m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m.
Maka na o leele anya n’umeala odibo nwaanyị ya, site taata ndụdụgandụ niile ga na-akpọ m onye dị ngọzi; maka na onye dị ike emeerela m nnukwu ihe, aha ya dị asọ.
Obi ebere ya si na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ maka ndị na-atụrụ ya egwu, O gosila ike aka ya, ọ chụsachaala ndị nganga dị n’obi; O sila n’ocheeze budaa ndị ukwu, bulie ndị umeala; O nyejuola ndị agụụ na-agụ afọ hapụ ndị ọgaranya ka ha gbara aka laa.
O nyerela Izrel nwodibo ya aka, ma ncheta ebere ya, Dịka o si gwa nna anyị Abraham na mkpụrụ ya ebeebe.” Marịa nọnyeere Elizabet ihe dị ka ọnwa atọ tupu ọ lọghachi n’ụlọ ya.
Igbo Mass Readings for August 15 2025, Nnukwu Emume Mbugoro N’Eluigwe nke Marịa dị Ngọzi.