Mkpụrụobi m na-achọ Dinwenụ [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Mkpụrụobi m na-achọ Dinwenụ‘ is one of the popular Igbo Hymns composed from Psalms 41/42 by Msgr Ezendụka which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Mkpụrụobi m na-achọ Dinwenụ Lyrics
/l:d’:l:t:s:l:f:-:s:-:s:s:m:-:m:-/
d’:d’:d’:t:s:l:l:s:s:-
Chorus: Mkpụrụobi m na-achọ Dinwenụ kedụ oge mụ na-ya ga-ahụ, ihu na ihu.
1. Dika etu nne Ele agụụ mmiri na-agụ si achọ mmiri, etu a ka mkpụrụobi m si achọ Gị Chukwu. Azịza.
2. Mkpụrụobi m na-achọ Chukwu, Chukwu nke na-enye ndụ, kedụ oge m ga eji hụ ihu nke Chukwu. Azịza.
3. Enwerọ m nri ọzọ beeresọ anya mmiri ehihe na anyasị, Ogologo ụbọchị nile ndị mmadụ na-ajụ mụ: “Ebee ka Chukwu gị nwa nọ?” Azịza.
4. M lọta Ọ na-elili sị m obi, Ana ma ga n’ụzọ nke ụlọ dị egwu, ụlọ obibi nke Chukwu. Oge ukwe añụrị na otito na-ana elu n’igwe ndị na ekwe ukwe añụrị. Azịza.
5. Ọ gịnị ka iji ajụ oyi mkpụrụobi m Ọ gịnị mere iji akwa arịrị? Nwee nchekwube na Chukwu. Aga m na-etorịrị ya, onye nzọpụta mụ na Chukwu m. Azịza.
6. Oge obi jụrụ m oyi n’ime mmụọ, ana m echeta Gị na ala nke Jordan na Hermon, na gị-nwa na ugwu Miza. Azịza.
7. Omimi mmiri na-akpọtụ ruo omimi mmiri ebe ndaji na mmiri Gị na-akpọtụ ebili mmiri Gị nile, Na mmalite mmiri Gị, adadogo m. Azịza.
8. N’oge ehihie ka Yahweh mee ka ịhụnanya Ya bịa. N’anyasị ka m kpụrụ ukwe ya n’ọnụ too Chukwu onye okike mụ. Azịza.
9. Ka m si Chukwu okwute m, gịnị mere Iji lozọ m? Gịnị mere m ga-eji na aga na uru, Ndị ilo na-akpagbu m? Azịza.
10. Ọfọdụru nwa ntị-ntị ka ọkpụkpụ m gbajie mgbe ndị iro m n’akarụ m mgbe ha n’ajụ m ogologo ụbọchị nile, “Ebee ka Chukwu gị nwa nọ? Azịza.
11. Ọ gịnị a iji ajụ oyi mkpụrụobi m, ọ gịnị mere iji akwalịlị? Nwee nchekwube na Chukwu. Aga m na-etorịrị Ya, Onye nzọpụta m na Chukwu m. Azịza.
12. Zaa ọnụ m kpee ọnụ m na-aka ndị amaghị ebere, n’aka onye ntụ na aghụghọ, Zọpụta m Chukwu. Azịza.
13. Ọ bụ Gịnwa Chukwu bụ oche ndo m. Gịnị mere I ji gbanarị m, Gịnị mere Iji gbanarị m? Gịnị mere m ga-eji na-aga n’uru ndị ilo a na-akpagbu m? Azịza.
14. Zite ifé Gị na eziokwu Gị ka ha na-edu m, Duga m n’ugwu Gị dị asọ n’ebe Ibi. Azịza.
15. A ga m aba n’Alta Chukwu, Chukwu na-enye m añụrị, A ga m eji ụbọ akwala too ya. Yahweh Chukwu m. Azịza.
Other Igbo Communion Hymns
- Kulienụ ka Anyị Jenụ Rie
- Lee ka Aha Gị si dị Ebube
- Mba Nile ga-akpọ Isiala
- Mkpụrụobi m na-achọ Dinwenụ
- Mmirichukwu nke Dinwenụ
- Mkpụrụobi m Tobe Osebụrụwa
- Lee Ezigbo Nwatụrụ
- Keleenụ Chukwu
- N’oriri Dị Asọ Eligwe na ụwa na-emekọrịta
- N’oriri Ikpeazụ
- Ndị na-eme Uche Chineke
- Ngị Jesu bụ Ndụ nke Anyị
- Nna bata Nọnyere m
- Obi Jesu dị Asọ
- Ọ bụ Mbọsị Añụrị
- Ọ bụ Onye ga-adịrị Mụ ka Kristi Onye nwe m
- O Chukwu nke M
- Ọ Dịghị Onye Nwere ike ka Chineke
- Onye Nwe Ụwa biko Nụrụ Olu m
- O Nwere Ịhụnanya dị ka nke a
- Oriri Ahụ na Ọbara Kristi
- Oriri Ụmụ Eligwe
- Ihe Ọbụla I meere Otu Onye na Ụmụnna m
- Otu Achịcha, Otu Iko
- Sekpulu Nalụ M
- Site n’ahụ Kristi
- Sọ Ngị O Chineke
- Sọ otu Ihe ka m na-arịọ n’aka Dinwenụ
- Tobe Dinwenụ Mba Nile
- Tobe Jesu bi n’ime m
- Onyenweanyị Meenụ ka ime Uche Gị Bụrụ Nri m
- Anyị Nile bụ Otu na Dinwenụ
- Aga m Eje Nara Ahụ Kristi
- Aga m n’ihu ndị ụrụ ala Enweghị isi
- Dozie m Chukwu ka Mmebe Uche Gị
- Bịanụ Ndị Dị Nsọ
- Chukwu Gọzie ndị Nwere Ịhụnanya
- Chukwu Nwa si n’igwe Bịa n’ime ụwa nke a
- Ihe Nile I mere Anyị Dinwenụ
- Ihe Nile dị n’uche Gị O Dinwenụ
- Ọ bụrụ na Ị hụrụ m n’anya debe iwu m