Mma Mma Jesus [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Mma Mma Jesus‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Offertory Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Mma Mma Jesus Lyrics

Chorus: Mma mma Jesus ekele, mma mma ana m asị gị mma mma Jesus ekele onye nwụrụ n’obe maka mmehie m wee zọọ mo.  Eze m Jesus nara ekele mo. Otito mo, nara mbuli mo Ị zọrọ mụ n’agbụ nke njọ.

1. Ekele, ekele O kelere mụ eze Jesus nwoke dị ike odogwu. Eze ka eze nwoke mara mma. (Dike meriri ọnwụnwa biko nara otito nke m n’ebunye gị o. Ana mekele gị o. DC.

2. Apịara gị ihe n’ihi mo. Agbara gị ọtọ n’ihi mo (Ekpubere gị okpu ogwu n’ihi mo) Amara gị ube (n’ihi mo) akpọgidere gị n’obe (n’ihi mo) Ị nwụrụ ọnwụ (n’ihi mo) nọọ abalị atọ n’ili (n’ihi mo) ma ibilitere n’ọnwụ (Ekele dịrị Eze ka eze ekele) Merie Ekwensu (Ekele dịrị Eze k’eze, ekele) sachapụ mmehie mo (Ekele dịrị eze k’eze ekele) Ana m ekele gị o.

3. N’ime ihe ọma nile ndị a imeere m Dinwenụ,  ọnụ m ezughị oke iji we kelee gị. Ma site n’ịhụnanya n’ebere inwere n’ebe m nọ nabata nwa gị o nabata ekele mo. Ana m ekele gị o.

4. Ana m ekwe gị nkwa na site taa eze Jesus, na m ga-edobe iwu Chukwu Nna, hụ mmadụ ibe m n’anya, jụ ekwensu na ọlụ ya nile n’otito ya nile, na nduhie ya nile, nyere m aka biko, biko Jesu.

Other Igbo Offertory Hymns

Other Catholic Hymns