Igbo Mass Readings for March 24 2025, Mọnde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 24 2025, Mọnde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke abụọ nke Ndịeze
Naaman onye isi agha nke Siria bụ nwoke dị ukwu n’ihu nna ya ukwu, n’ihina site na mgbalị ya ka Yahweh ji nye Siria mmeri. Nwoke a bụ dike n’agha, ma ọ bụ onye ekpenta.
N’otu n’ime agha ha busoro Izrel na mberede, ndị Siria dọtara otu ntakịrị nwaagbọghọ, onye nke mechara bụrụ odibo nwunye Naaman. Nwata a gwara nne ya ukwu sị, “A sị na nna m ukwu ga-agakwuru onye amụma nke bi na Sameria!
Ọ ga-agwọ ya ọrịa ya.” Naaman jekwuru nna ya ukwu kọsara ya kpọmkwem, ihe niile nwatakịrị ahụ kwuru. Eze Siria zara ya sị, “Gaba ugbu a, aga m enye gị akwụkwọozi ị ga-enye eze Izrel.”
Ọ gabara, were talent ọlaọcha iri, puku shekel ọlaedo isii na uwe emume iri. O wetaara eze Izrel akwụkwọozi ahụ nke ihe e dere n’ime ya bụ, “Akwụkwọozi a bụ iji gwa gị na ezitere m nwodibo m bụ Naaman ka ị gwọọ ya ọrịa ekpenta ya.
Mgbe eze ndị Izrel gụrụ akwụkwọozi ahụ ọ dọwaa uwe ya kwuo sị, “Abụ m Chineke onye ọnwụ na ndụ dị n’aka mere nwoke a jiri zitere m ozi ka m gwọọ onye ekpenta?
Hụkwanụ otu Nwoke a si achọ m okwu!” Mgbe Elaịsha onye nke Chineke nụrụ ka eze ndị Izrel siri dọwaa uwe ya, o zigaara ya ozi jụọ ya sị, “Kedụ ihe kpatara I jiri dọwaa uwe gị?
Gwa nwoke ahụ ka ọ bịakwute m, ọ ga-amata na enwere onye amụma n’ala Izrel.” Ya mere, Naaman jiri ịnyịnya ya na ụgbọịnyịnya ya bịa guzoro n’ọnụụzọ ụlọ Elaịsha.
Elaịsha zipụrụ onyeozi ka ọ gwa ya sị, “Gaa saa ahụ n’osimiri Jọdan ugboro asaa, ahụ gị ga-adịkwa mma ọzọ.” Naaman jiri iwe na ọnụma tụgharịa laba, na-ekwu sị, “Echere m nnọọ na ọ gaara apụta, guzoro, kpọkuo aha Yahweh Chineke ya, fegharịa aka ya n’elu ebe ahụ, gwọọ ọrịa m.
Ọ bụ na osimiri Abana na Fapa nke dị na Damaskọs adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na enweghị m ike ịsa ahụ n’ime ha wee dị ọcha?” Ya mere, ọ tụgharịa laba n’iwe.
Ndị odibo ya bịakwutere ya sị ya, Nna anyị ukwu, a sị na ihe onye amụma gwara gị mee bụ ihe siri ike omume, ọ bụ na ị gaghị eme ya? Ma nke a bụna ọ gwara gị naanị saa ahụ ka ị dịkwa ọcha.
Ya mere ọ gara sụnye onwe ya n’ime osimiri Jọdan ugboro asaa dịka Elaịsha gwara ya. Anụahụ ya wee dịkwa mma dị ka ahụ nwatakịrị. Mgbe ahụ, Naaman na ndị ozi ya laghachiri jekwuru onye nke Chineke ahụ sị ya, Ugbu a, amatala m na enweghị chi ọzọ n’elu ụwa belụsọ n’ala Izrel. Biko nara ihe onyinye ekele sitere n’aka nwodibo gị.’
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 42:2, 3, 43: 3, 4.
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke, Chukwu nke ndị dị ndụ, kedụ oge m ga-ahụ ya ihu na ihu.
1. Dịka otu agụụ mmiri si na-agụ nne ele,
otu ahụ ka agụụ si na-agụ m maka gị O Chineke m.
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke, Chukwu nke ndị dị ndụ, kedụ oge m ga-ahụ ya ihu na ihu.
2. Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke,
Chukwu nke ndị dị ndụ,
kedụ oge m ga-enwe ike jee hụ ihu nke Chineke?
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke, Chukwu nke ndị dị ndụ, kedụ oge m ga-ahụ ya ihu na ihu.
3. Zipụta ihè gị na eziokwu gị,
ka ha na-edu m,
Ka ha dubata m n’ugwu gị dị nsọ,
ebe i jiri mere ebe obibi.
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke, Chukwu nke ndị dị ndụ, kedụ oge m ga-ahụ ya ihu na ihu.
4. Mgbe ahụ aga m aga n’ebe nchụaja nke Chineke,
Chineke nke bụ añụrị m.
Aga m eji añụrị were ụbọ too gị,
Onyenweanyị, Chineke m.
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke, Chukwu nke ndị dị ndụ, kedụ oge m ga-ahụ ya ihu na ihu.
MBEKU – Ps. 95:8.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 4:24-30
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe Jesu bịaruru Nazaret, ọ gwara ndị mmadụ nọ n’ụlọ nzukọ okwu sị: N’ezie agwa m ụnụ, anaghị anabata onye amụma ọbụla n’obodo a mụrụ ya.
E nwere ọtụtụ ụmụnwaanyị isimkpe n’Izrel n’oge Elaịja. Mgbe e mechiri eluigwe mmiri ezoghịkwa afọ atọ na ọnwa isii, mgbe oke ụganị dara n’ala ahụ niile; ma o nweghị onye n’ime ha e zigaara Elaịja ma ọ bụghị naanị otu nwaanyị ajadu nke bi n’obodo Zarefat, nke dị n’ala Saịdọn.
Ọtụtụ ndị ekpenta nọkwa n’ala Izrel n’oge Elaịsha; ma o nweghị onye ọbụla n’ime ha e mere ka ọ dị ọcha ma ọ bụghị Naaman, onye Siria.” Mgbe ndị niile nọ n’ụlọ nzukọ ahụ nụrụ okwu ndị a, iwe jupụtara ha n’obi.
Ha biliri, kwapụ ya n’obodo ha, kpụrụ ya ruo n’otu ugwu nta a rụkwasara obodo ha n’elu ya ka ha si ebe ahụ kwada ya. Ma ọ mịchapụrụ onwe ya n’aka ha, si n’etiti igwe mmadụ ahụ laa.
Igbo Mass readings for March 25 2025, Nnukwu Emume Ikwupụta Ịtụrụ-ime nke Onyeweanyị.
Igbo Mass Readings for March 24 2025, Mọnde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.