Igbo Mass Readings for December 7 2026, Mọnde Izuụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 7 2026, Mọnde Izuụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 35:1-10
Ihe ọgụgụ ewetara na akwụkwọ onye amụma Aịzaya
Ka ịkpa na ala kpọrọ nkụ ñụrịa ọñụ, ka ala ọkpọọ nweta obi añụrị wee mịpụta ifuru osisi mara mma. Ọ ga-achawapụta nke ukwuu, were ukwe tie mkpu ọñụ. A ga enye ya otito nke Lebanọn, ebube nke Kamel na Sharọn. Ha ga ahụ otito nke Osebụrụwa anyị. Meenụ ka aka na esighi ike sie ike, ka ikpere na-ama jijiji sie ike.
Ụnụ ga-agwa ndi niile egwu na-atụ, “Obi sie ụnụ ike, ụnụ atụla egwu, lee Chineke ụnụ na-abịa ịbọrọ ụnụ ọbọ site n’ịkwụghachi ndị iro ụnụ ụgwọ. Ọ ga-abịa zọpụta ụnụ.
Mgbe ahụ, anya ndị kpuru isi ga-emepe, ndị ntị chiri ga-anụ ihe. Mgbe ahụ onye ngwọrọ ga-awụli elu dịka ele, ndị ogbi ga-ekwe ukwe añụri. Mmiri ga-esi n’ọzara sọpụta, iyi ga-ejukwa n’ịkpa. Ala ọkpọọ ga-abụ ebe ọdọ mmiri, ala kpọrọ nkụ ga-abụ isiyi.
Ebe obibi nkịta-ọhịa ga-aghọ apịtị. Achara niile ga-adị ka eriri na ụdọ. Ụzọ awara awara ga-adị ebe ahụ, a ga-akpọ ya ụzọ Nsọ. Onye adịghị ọcha agaghị esi ebe ahụ gafee.
Ndị nzuzu agaghị eme ihe nzuzu ọbụla n’ebe ahụ. A gaghị enwe ọdụm ọbụla n’ebe ahụ, a gaghịkwa enwe anụọhịa ọbụla nke na-eyi egwu n’ime ya. Ọ bụ sọọsọ ndị a zọpụtarala ga-aga na ya.
Ndị nke Osebụrụwa a gbapụtara agbapụta ga-alọghachi azụ, na-ekwe ukwe ọñụ na Zayọn, ha ga-enwe añụrị ebeebe n’onwe ha. Ha ga-enweta obi añụrị na nke ha. Iru uju na ịma ọsụ niile ga-agbafu n’ebe ha nọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 85: 9-10. 11-12. 13-14.
Azịza: Chineke ụnụ ga-abịa ịzọpụta ụnụ.
1. Ana m ege ntị n’ihe Chineke, Onyenweanyị na-ekwu
ihe ọ na-ekwu bụ udo maka ndị nke ya
N’ezie nzọpụta ya dị nsọ maka ndị na atụrụ ya egwu,
ka ebube ya wee nọgide n’ala anyị.
Azịza: Chineke ụnụ ga-abịa ịzọpụta ụnụ.
2. Ịhụnanya na okwukwe amakụọla,
eziomume na udo ebiela ọma.
Irube isi ga-esi n’ala pulite,
eziomume ga-esi n’elu ledata anya.
Azịza: Chineke ụnụ ga-abịa ịzọpụta ụnụ.
3. Ee, Onyenweanyị ga-enye anyị ọganaihu,
ala anyị ga-amịta mkpụrụ, bawanye.
Eziomume ga-aga n’ihu ya,
udo ga na-eso nzọ ụkwụ ya.
Azịza: Chineke ụnụ ga-abịa ịzọpụta ụnụ.
MBEKU
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Meenụ ka ụzọ ya kwụrụ ọtọ mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta nke Chineke.
ALLELUỊA.
OZIỌMA – 5:17-26
Ihe ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Otu ụbọchị, mgbe Jesu na-akụzi ihe, ndị Farisii na ndị nkụzi iwu nọ ebe ahụ, ndị si n’obodo niile nke Galili, Judia na Jerusalem bịa, ike nke Dinwenụ dịnyekwaara Jesu ka o wee gwọọ ndị ọrịa.
Ụfọdụ ụmụnwoke butere otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ n’elu akwa ya, ha chọrọ ụzọ ibubata ya n’ụlọ, dọba ya n’ụkwụ Jesu. Ebe ọ bụ na ha enweghị ike ibuba ya n’ime ụlọ ha meghee oghere n’elu ụlọ buda ya n’akwa ya n’etiti ebe Jesu nọ.
Ma mgbe Jesu hụrụ okwukwe ha, Ọ sịrị, “Nwoke, a gbagharala gị njọ gị niile!” Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bidoro jụba sị, “Onye bụ nwoke a na-ekwu arụ?
Onye pụrụ ịgbaghara njọ ma ọ bụghị Chineke?” Mgbe Jesu matara ihe ha na ajụ, Ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụnụ ji ajụ ajụjụ a n’obi ụnụ? Olee nke ka mfe, ị sị: ‘A gbagharala gị njọ gị niile, ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie, were ụkwụ gị gagharịba?
Ma iji mee ka ụnụ mara na nwa nke mmadụ nwere ike n’elu ụwa ịgbaghara njọ,” Ọ sịrị nwoke ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Ana m agwa gị, bilie buru akwa gị laba.”
Nwoke ahụ biliri ozigbo, buru ihe o ji edina ala lawa, na-eto Chineke. Ihe a tụrụ igwe mmadụ ahụ n’anya nke mere ha ji too Chineke sị, “Anyị ahụla ihe anyị na-ahụbeghị mbụ taa.”
Igbo Mass Readings for December 8 2026, Nnukwu Emume Ịtụ Ime Marịa dị Ngọzi N’Ejighị Njọ.
Igbo Mass Readings for December 7 2026, Mọnde Izuụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.