Igbo Mass Readings for March 3 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 3 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:23-32

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak

Ọrụ ha niile pụtara ihe dịka anyanwụ n’ihu ya; anya ya dị n’omume ha oge ọbụla. Ajọomume ha niile ezoghị ezo n’ihu ya. Mmehie ha niile pụtara ihe n’ihu Yahweh. Mana Yahweh dị afọọma.

Ọ maara ihe niile O kere, Ọ naghị ala ha n’iyi kama Ọ na-echekwaba ha. Onyinye ebere mmadụ na-enye dịka mgbanaka n’ihu ya. Yahweh hụrụ afọọma mmadụ na-eme n’anya dịka mkpụrụanya ya.

E mechaa, Ọ ga-ekuli, kwụọ ha ụgwọ, onye ọbụla ka ọrụ ya si dị. Mana ndị mere ebere chegharịa, Ọ ga-anabata ha. Ma Ọ na-agba ndị ike na-agwụ, obi na ekolopụ ume.

Tụgharịa, laghachi azụ n’ebe Yahweh nọ, hapụ njọ gị, rịọ arịrịọ n’ihu ya, ma belata mmehie gị ga. Laghachikwuru Onye kachaelu. Wepụ anya n’ebe ihe arụ dị, jiri ike obi gị niile kpọ njọ asị.

Onye pụrụ ikwere Onye kachaelu ukwe otito n’ala mmụọ dịka ndị dị ndụ si ekele ya? Inye ekele adịghị n’ebe ndị nwụrụ anwọ nọ, ha dịka ndị ekeghị eke, sọọsọ onye dị ndụ, nwee ahụ ike na-ekwe ukwe otito.

Lee ka o si buo ibu bụ ebere Yahweh na mgbaghara Ọ na-egosị ndị laghachiri azụ n’ebe Ọ nọ. Mmadụ apụghị inwe ihe niile, maka na nwa nke mmadụ abụghị anwụ anwụ.

Kedụ ihe na-amụkesị karịa anyanwụ? Mana ihe ya ahụ na-emechaa daa. N’otu aka ahụ ka mmadụ bụ sọ ahụ na ọbara si echepụta ihe ọjọọ. Yahweh na-ahụzu, na-elekọtakwa igwe ndịagha nke eluigwe, mana o nweghị ihe mmadụ niile bụ karị sọ aja na ntụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 32:1-2, 5, 6, 7

Azịza: Ụnụ ndị eziomume, nwebenụ añụrị n’Onyenweanyị.

1. Ngọzi na-adịrị onye nke a gbaghaara njọ ya

onye nke e kpochapụrụ mmehie ya.

Ngọzi dịrị onye ahụ Onyenweanyị amaghị ikpe,

onye aghụghọ adịghị n’ime obi ya.

Azịza: Ụnụ ndị eziomume, nwebenụ añụrị n’Onyenweanyị.

2. N’ikpeazụ, ekwere m na m mere njọ,

anakwaghị m ezo njọ m ezo,

a sịrị m, “Aga m ekwupụtara Onyenweanyị njọ m”

I wee gbaghara m njọ m niile.

Azịza: Ụnụ ndị eziomume, nwebenụ añụrị n’Onyenweanyị.

3. Ya mere ndị nke gị niile ji ebeku gị,

mgbe ọbụla ha nọ na nsogbu,

ọ bụrụgodụ na nsogbu ekworo ka idee mmiri bịa,

Ọ gaghị eru ha ahụ.

Azịza: Ụnụ ndị eziomume, nwebenụ añụrị n’Onyenweanyị.

4. Gị bụ ebe mgbaba m,        

Ị na-echebe m n’oge nsogbu,

I ji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.

Azịza: Ụnụ ndị eziomume, nwebenụ añụrị n’Onyenweanyị.

MBEKU – Ọrụ Ndiozi 16:14

Alleluia, Alleluia:

Dinwenụ meghe obi anyị ige ntị n’okwu Nwa Gị.

Alleluia

OZIỌMA – 10:17-27

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Ka Jesu na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere n’ala n’ihu ya, jụọ ya sị, “Ezigbo Onyenkuzi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighịebi? Jesu jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji akpọ m ezigbo onye?”

O nweghị onye bụ ezigbo onye belụsọ Chineke. Ị marala ihe ndị e nyere n’iwu: ‘Egbula ọchụ, Akwala iko, Ezula ohi, Agbala ama asị, Arụgbula mmadụ, sọpụrụ nna gị na nne gị’.

Nwoke ahụ zara ya sị, “Onyenkuzi, ihe niile ndị a ka m debere site n’okorobịa m”. Jesu lere ya anya nwee ịhụnaanya n’ebe ọ nọ, gwa ya sị, “Otu ihe fọdụụrụ gị ime.

Laa, ree ihe niile i nwere were nye ndị ogbenye, ị ga-enwe akụ n’eluigwe, bịa sobe m”. Mgbe ọ nụrụ okwu a ihu gbarụrụ ya, o wee laa na nwute, n’ihina ọ bụ onye bara ụba nke ukwuu.

Jesu elegharịa anya sị ndị na-eso ụzọ ya, “Lee ka o si sie ike ndị ọgaranya ịba n’Alaeze Chineke!” Okwu ya a tụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya. Jesu gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị m, lee ka o si siere ndị tụkwasara obi n’akụnụụba ike ịba n’Alaeze Chineke!

Ọ dịkarịrị ịnyịnyaibu mfe ịgafe n’anya aga karịa ọgaranya ịba n’Alaeze Chineke! Okwu a tụrụ ha n’anya nke ukwuu, ha wee jụọ ya sị, “Onye kwanụ ka a pụrụ ịzọpụta?”

Jesu lere ha anya sị, “N’ebe mmadụ nọ nke a bụ ihe na-agaghị ekwe omume, ma ọ bụghị n’ebe Chineke nọ. N’ihina n’ebe Chineke nọ ọ pụrụ ime ihe niile”.

Igbo Mass Readings for March 4 2025, Tuzde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for March 3 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.