Igbo Mass Readings for May 25 2026, Mọnde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 25 2026, Mọnde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1, 3-9

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Pita nke Mbụ

Pita nwaazụ nke Jesu Kristi na-edegara ụnụ ndị niile gbara ọsọ ndụ gaa biri n’obodo niile nke pọntus Galeshịa Kapadoshịa, Eshịa, na Bitinia, akwụkwọ. Ngọzi dịrị Chukwu na Nna Onyenweanyị Jesu Kristi!

N’ihi oke ebere ya, o nyere anyị ndụ ọhụrụ ka anyị nwee nchekwube, site na mbilite n’ọnwụ nke Jesu Kristi. Chineke akwadobela onyinye ndụ ebighịebi ọ ga-enye ụmụ ya niile.

Onyinye a dị n’eluigwe ebe Chineke dobere ụnụ, n’ebe ahụ, ọ gaghị emebi emebi. Ọ gaghịkwa agbanwe ọdịdị ya ma ọ bụkwanụ ree ure. Ha ga-abụ nke ụnụ, bụ ndị e ji ike nke Chineke chebe site n’okwukwe.

Ka ha ruo nzọpụta ahụ nke a ga ekpughe n’oge ikpe azụ. Ñụrịanụ ọñụ n’ihi nke a, ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ugbu a ka ụnụ nwee mwute nwa oge n’ihi ahụhụ dị icheiche nke ụnụ na-ata.

Ihe mere e ji ata ụnụ ahụhụ ndị a bụ ka a mara ma ụnụ nwekwara ezi okwukwe: N’ihina, ọ bụladị ọlaedo nke pụrụ imebi emebi a na-eji ọkụ añụcha ya ka ọ dị mma karịa.

Otu aka ahụ, a ghaghị iji ahụhụ nwapụta okwukwe ụnụ, nke bụ ihe oke ọnụahịa karịa ọlaedo, ka ọ nọgide. Mgbe ahụkwa ụnụ ga-anata otito na ebube, na nsọpụrụ n’ụbọchị a ga ekpughe Jesu Kristi.

Ọ bụ ezie na ụnụ ejibeghị anya ụnụ hụ ya, ma ụnụ hụrụ ya n’anya. Ọ bụkwa ezie na ụnụ anaghị ahụ ya anya ugbu a, ma ụnụ kwere na ya.

N’ezie ọ bụladị ugbu a, ụnụ nwere obi nke jupụtara n’ụdị ọñụ ahụ nke ọnụ na-apụghị ịkọwa. Ụgwọ ọrụ ụnụ ga-enweta n’ihi ntụkwasịobi ụnụ n’ime ya, ga-abụ nzọpụta nke mkpụrụobi ụnụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 111: 1-2, 5-6, 9, 10

Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.

1. Alleluia Eji m obi m niile enye Onyenweanyị ekele,

n’ọgbakọ ndị eziomume.

Ọrụ Onyenweanyị niile dị ịtụnaanya,

ndị niile ọ na-amasị kwesịrị ilekwasa ya anya,

Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.

2. Ọ na-enye ndị na-atụrụ ya egwu nri;

ọ naghị echezọ ọgbụgbandụ ya.

Ọ na-echetara ndị nke ya ike ọna-akpa

site n’inye ha oke mba ndịọzọ.

Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.

3. Ọ na-abịa ịgbapụta ndị nke ya ọsọọsọ,

na-enye ọgbụgbandụ ya otu mgbe

aha ya dị nsọ, kwesị na anyị ga-atụrụ ya egwu.

A ga-ekwe ukwe otito ya ebeebe.

Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.

MBEKU – Ọrụ Ndiozi 16:14

Alleluia, Alleluia:

Dinwenụ meghe obi anyị ige ntị n’okwu Nwa Gị.

Alleluia

OZIỌMA – 10:17-27

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Ka Jesu na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere n’ala n’ihu ya, jụọ ya sị, “Ezigbo Onyenkuzi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighịebi? Jesu jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji akpọ m ezigbo onye?”

O nweghị onye bụ ezigbo onye belụsọ Chineke. Ị marala ihe ndị e nyere n’iwu: ‘Egbula ọchụ, Akwala iko, Ezula ohi, Agbala ama asị, Arụgbula mmadụ, sọpụrụ nna gị na nne gị’. Nwoke ahụ zara ya sị, “Onyenkuzi, ihe niile ndị a ka m debere site n’okorobịa m”.

Jesu lere ya anya nwee ịhụnaanya n’ebe ọ nọ, gwa ya sị, “Otu ihe fọdụụrụ gị ime. Laa, ree ihe niile i nwere were nye ndị ogbenye, ị ga-enwe akụ n’eluigwe, bịa sobe m”. Mgbe ọ nụrụ okwu a ihu gbarụrụ ya, o wee laa na nwute, n’ihina ọ bụ onye bara ụba nke ukwuu.

Jesu elegharịa anya sị ndị na-eso ụzọ ya, “Lee ka o si sie ike ndị ọgaranya ịba n’Alaeze Chineke!” Okwu ya a tụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya. Jesu gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị m, lee ka o si siere ndị tụkwasara obi n’akụnụụba ike ịba n’Alaeze Chineke!

Ọ dịkarịrị ịnyịnyaibu mfe ịgafe n’anya aga karịa ọgaranya ịba n’Alaeze Chineke! Okwu a tụrụ ha n’anya nke ukwuu, ha wee jụọ ya sị, “Onye kwanụ ka a pụrụ ịzọpụta?”

Jesu lere ha anya sị, “N’ebe mmadụ nọ nke a bụ ihe na-agaghị ekwe omume, ma ọ bụghị n’ebe Chineke nọ. N’ihina n’ebe Chineke nọ ọ pụrụ ime ihe niile”.

Igbo Mass Readings for May 26 2026, Tuzde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for May 25 2026, Mọnde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.