Igbo Mass Readings for May 5 2025, Mọnde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 5 2025, Mọnde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:8-15
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Ebe Stivin jupụtara n’amara na ike nke Mmụọ Nsọ, ọ rụrụ oke ọrụ ịtụnaanya na ihe ịrịbaama dị iche-iche n’etiti ndị Juu. Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu ndị si n’ụlọ nzukọ nke “Ndị nweere onwe ha” (dịka esị akpọ ya) na nke ndị Saịriin, na nke ndị Elegzandrịa, na nke ndị si Silisia na Eshịa bịara rụsa Stivin ụka.
Ma ha enweghị ike ịkwụgidenwụ amamihe ike nke Mmụọ Nsọ Stivin ji agwa ha okwu. Ihe ha mere bụ isi na nzuzo kpalie ndị mmadụ ndị kwuru sị: “Anyị nụrụ mgbe ọ na-ekwu okwu megide Mosis, na Chineke.”
Ka ha kpalitechara ndị mmadụ, ndị okenye na ndị odeakwụkwọ megide Stivin, ha jidere Stivin na mberede kpụga ya n’ụlọikpe. Ha kpọtara ndị bịara gbaa akaebe na-asị, “Nwoke a enwebeghị mgbe ọ kwụsịrị ikwu okwu megide ụlọ nsọ na iwu Mosis.
Anyị nụrụ mgbe ọ na-ekwu na Jesu onye Nazaret ga-akwatu ụlọnsọ nke a, gbanwekwaa omenaala niile nke Mosis nyere anyị n’aka idobe.” Mgbe ha legidere ya anya n’ihu, ndị niile nọ n’ụlọikpe ahụ hụrụ na ihu ya na-amuke ka nke mmụọọma.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119: 23-24, 26-27, 29-30.
Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị omume ha kwụ ọtọ.
1. N’agbanyeghị na ndị ọchịchị na-agba izu imegide m,
aga m na-achịgharị okwu gị n’uche m.
Iwu gị na-atọ m ụtọ, na-adụkwa m ọdụ.
Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị omume ha kwụ ọtọ.
2. Mgbe m kwupụtara omume m, ị zara m,
ugbu a, kuziere m iwu gị.
Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara,
ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanyị gị n’obi m.
Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị omume ha kwụ ọtọ.
3. Ekwela ka m soro ụzọ na-akwụghị ọtọ,
ma nye m amara nke iwu gị.
Ahọrọla m ịkwụdosiike,
atụkwasịrị m obi n’iwu gị.
Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị omume ha kwụ ọtọ.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Jesu kwuru sị, “Atụrụ m na-anụ olu m, a maara m ha, ha na-esokwa m.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 6:22-29.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
N’ụbọchị nke ọzọ ndị mmadụ nọọrọ n’ofe nke ọzọ nke osimiri hụrụ na naanị otu ụgbọ dịzi n’ebe ahụ. Ha matakwara na Jesu esoghị ndị na-eso ụzọ ya baa n’ụgbọ, kama naanị ndị na-eso ụzọ ya jere.
Ka osila dị, ụgbọ ndị ọzọ si Tiberias bịaruru nso n’ebe ahụ igwe ndị mmadụ riri achịcha ahụ ka Onyenweanyị nyechara ekele. Mgbe ha hụrụ na Jesu na ndị na-eso ụzọ ya anọghị n’ebe ahụ, ha banyere n’ụgbọ ndị ahụ gaa Kapanaum, na-achọ Jesu.
Mgbe ha hụrụ Jesu n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ, ha jụrụ ya sị, “Rabaị (onye nkuzi) Olee mgbe ị bịara ebe a?” Jesu zara ha: “Ana m agwa ụnụ eziokwu, ọ bụghị maka ọrụ ebube ụnụ hụrụ ka ụnụ ji achọ m kama ọ bụ maka na ụnụ ji achịcha rijuo afọ.
Ụnụ adọgbula onwe ụnụ maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke ga-adịgide ruo ndụ ebeebe, nke nwa nke mmadụ ga-enye ụnụ. N’ihi na ọ bụ na ya ka Chineke Nna kara akara nke ịrịbaama.”
Nke a mere ha ji jụọ Ya sị, “Kedụ ihe anyị ga na-emerịrị ka ọ bụrụ na anyị na-arụ ọrụ Chineke?” Jesu zaa ha, “Nke a bụ ọrụ nke Chineke: ka ụnụ kwenye na onye ahụ nke o zitere.”
Igbo Mass Readings for May 6 2025, Tuzde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
Igbo Mass Readings for May 5 2025, Mọnde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.