Igbo Mass Readings for September 1 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 1 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:13-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl Degaara Ndị Tesalonịka

Ụmụnna m, anyị achọghị ka ụnụ ghara ịmata ihe banyere ndị otu anyị nwụrụ anwụ, ka ụnụ ghara iru ụjụ dịka ndị ọzọ, ndị enweghị nchekwube.

Ebe anyị kwere na Jesu nwụrụ ma sikwa n’ọnwụ bilie ọzọ, n’otu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jesu na Chineke ga akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ.

N’ihi nke a anyị na-agwa ụnụ, site n’okwu nke Dinwenụ, na anyị bụ ndị dị ndụ ndị ga-anọ ruo n’ọbịbịa nke Dinwenụ agaghị aka ndị nwụrụ anwụ mma.

Dinwenụ n’onwe ya ga-esi n’eluigwe gbadata, Ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị Mmụọọma na ụda opiike nke Chineke; mgbe ahụ ndị niile nwụrụ n’ime Kristi ga-ebu ụzọ bilie.

Mgbe ahụ anyị bụ ndị dị ndụ, ndị a hapụrụ, ka a ga-ewelite, anyị na ha ezukọọ n’urukpu izute Onyenweanyị na mbara igwe.

Otu a ka anyị na Dinwenụ anyị ga-esi nọrọ oge niile. Ya bụ, werenụ okwu ndị a na-akasịrịta onwe ụnụ obi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 96: 1, 3, 4-5, 11-12, 13

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe

1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ

ụwa niile kweere Onyenweanyị ukwe.

Mee ka ụwa niile mara maka otito ya

Kwupụtakwa ọrụ ịtụnaanya ya

n’ebe ndị mmadụ nọ.

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe

2. N’ihina Onyenweanyị dị ukwuu,

Ma kwesịkwa inye nnukwu otito;

O kwesịrị ịtụrụ ya egwu karịa ihe niile.

N’ihina chi niile nke ndị mba ọzọ bụcha arụsị!

mana Onyenweanyị kere eluigwe.

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe

3. Eluigwe ñụrịba, ka ụwa goribekwa,

Oke osimiri na ihe niile dị n’ime ya tienụ mkpu

Ala-ubi niile na ihe niile dị n’ime ya ñụrịbanụ,

Ka osisi niile dị n’oke ọhịa kwebe ukwe añụrị.

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe

4. n’ihu nke Onyenweanyị n’ihi ọ na-abịa,

ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe,

Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ na eziokwu

were kpee ụwa na ndị mmadụ ikpe.

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe

MBEKU – 2 Kọr 5:19

Alleluia, Alleluia:

Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na ụwa dị na mma; o tinyela n’aka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.

Alleluia

OZIỌMA – 4:16-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu bịaruru Nazaret ebe ọ nọrọ too; banye n’ụlọnzukọ, n’ụbọchị izuike dịka o si eme. O wee bilie igụ ihe; ha nyere ya akwụkwọ Aịzaya onye amụma.

O meghere akwụkwọ hụ ebe e dere sị, “E nyela m Mmụọ nke Dinwenụ, makana Dinwenụ eteela m ude ka mụ bugara ndị ogbenye oziọma, ka m kwusaara ndị e ji eji na ha enwerela onwe ha, ka m kwusaara ndị kpuru isi na ha ahụbala ụzọ, ka m mee ka ndị a na emegbu emegbu nwere onwe ha.

Ka m kwupụta afọ amara nke Dinwenụ.” O kpuchiri akwụkwọ ahụ, nyeghachi ya onye na-aga ozi, bịa nọdụ ala. Mmadụ niile nọ n’ụlọnzukọ lekwasịrị ya anya.

Ọ malite ịgwa ha okwu sị, “Taa, ka e mezuru na ntị ụnụ ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ a.” Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya.

Okwu ebube niile si n’ọnụ ya pụta tụkwara ha n’anya nke mere ha jiri jụọ sị, “Onye a, ọ bụghị nwa Josef?” Ma Jesu sịrị ha, “Ama m na ụnụ ga-atụrụ m ilu a: Dịbịa gwọọ onwe gị; ụnụ ga-asịkwa m, Mee ka anyị hụ n’obodo a mụrụ gị ụdị ihe ahụ anyị nụrụ na I mere na Kapanaum.

N’ezie agwa m ụnụ, a naghị anabata onye amụma ọbụla n’obodo a mụrụ ya. E nwere ọtụtụ ụmụnwaanyị isimkpe n’lzrel n’oge Elaịja, mgbe e mechiri eluigwe, mmiri ezoghịkwa afọ atọ na ọnwa isii, mgbe oke ụganị dara n’ala ahụ niile; ma o nweghị onye n’ime ha e zigaara Elaija ma ọ bụghị naanị otu nwaanyị ajadu nke bi n’obodo Zarefat nke dị n’ala Saịdọn.

Ọtụtụ ndị ekpenta nọkwa n’ala Izrel n’oge Elisha; ma o nweghị onye ọbụla n’ime ha e mere ka ọ dị ọcha ma ọ bụghị Neeman Onye Siria.”

Mgbe ndị niile nọ n’ụlọnzukọ ahụ nụrụ okwu ndị a, iwe jupụtara ha n’obi. Ha biliri kwapụ ya n’obodo ha, kpụrụ ya ruo n’otu ugwu nta a rụkwasara obodo ha n’elu ya, ka ha si ebe ahụ kwada ya. Ma ọ mịchapụrụ onwe ya n’aka ha si n’etiti igwe mmadụ ahụ laa.

Igbo Mass Readings for September 2 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 1 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.