Igbo Mass Readings for September 15 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 15 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara Timoti
Na mbụ ana m arịọ, ka ụnụ bulite ntiku ụnụ, ekpere niile, na arịrịọ niile ụnụ na-arịọrọ ndịọzọ, nye Chineke ekele n’ihi mmadụ niile.
Na-ekpekwanụ ekpere maka ndịeze na ndị niile na-achị achị, ka anyị biri n’udo na ịdị nwayọọ, bụrụ ndị kwesịrị nsọpụrụ, na ndị na-adị ndụ otu Chineke chọrọ.
Ime otu a dị mma, ọ bụkwa ihe na-atọ Chineke onye nzọpụta anyị ụtọ. Onye chọrọ ka mmadụ niile nweta nzọpụta, bịa mara eziokwu ahụ.
N’ihina e nwere otu Chineke, otu onye ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ, onye ogbugbo ahụ bụ Jesu Kristi.
Onye nyere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke mmadụ niile, Ọ bụkwa ihe akaebe nke a gbara mgbe oge ruru.
Nihi nke a ka Chineke ji họpụta m, ka m bụrụ onye na-agbasa oziọma, na onye ozi (Ana m ekwu eziokwu anaghị m ekwu okwu asị), na onye nkuzi nke ndị mba ọzọ n’okwukwe na eziokwu.
Achọrọ m ka ndị nwoke na-edu n’ekpere n’ebe niile, na-achili aka ha dị nsọ n’ekpere n’enweghị iwe na esemokwu.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 28: 2, 7, 8-9
Azịza: Ngọzi dịrị Chineke n’ihina Ọ na-anụ olu arịrịọ m.
1. Nụrụ olu arịrịọ m na-arịọ gị
na akwa m n’ebere gị maka enyemaka
mgbe m na-asara gị aka
n’ebe Gị dịkarịsịrị nsọ.
Azịza: Ngọzi dịrị Chineke n’ihina Ọ na-anụ olu arịrịọ m.
2. Onyenweanyị bụ ike m na onye ogbugbo m,
Mkpụrụobi m chekwubere na ya, Onyerem aka
Ahụ wee dịkwa m mma ọzọ
Ejim obi m niile ekele ya.
Azịza: Ngọzi dịrị Chineke n’ihina Ọ na-anụ olu arịrịọ m.
3. Chineke bụ ike ndị nke ya.
Ya bụ ebe mgbaba ndị O tere mmanụ
Zọpụta ndị nke gị Onyenweanyị, ndị ị họtara
Bụrụ onyendu ha, ma kuru ha n’aka, ebeebe.
Azịza: Ngọzi dịrị Chineke n’ihina Ọ na-anụ olu arịrịọ m.
MBEKU – Ps. 147:2, 15
Alleluia, Alleluia:
Jerusalem too Onyenweanyị; Ọ na-ezisara ụwa niile okwu ya.
Alleluia
OZIỌMA – 7:1-10
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka Jesu gwachara ndị mmadụ okwu. Ọ banyere na Kapanaum. E nwere otu onye ọchịagha onye nwere ohu nke ọ hụrụ n’anya, ohu ahụ rịara ọrịa nke mere o ji nọdụ n’ọnụ ọnwụ.
Mgbe ọ nụrụ maka Jesu, o ziri ndị okenye nke ndị Juu, ka ha gakwuru Jesu rịọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya. Mgbe ndị okenye nke ndị Juu bịakwutere Jesu ha rịọsiri ya ike sị, “Ọchịagha nke a kwesịri ka i meere ya ihe a ọ rịọrọ gị, n’ihina ọ hụrụ obodo anyị n’anya, o wukwaara anyị ụlọnzukọ anyị.”
Jesu sooro ha, ma mgbe Jesu bịaruru nso n’ụlọ onye ọchịagha ahụ, o zipụrụ ndị enyi ya ka ha zute Jesu gwa ya sị, “Dinwenụ m, enyela onwe gị nsogbu, n’ihina etosighị m ka ị bata n’okpuru ụlọ m, ya bụ echeghị m ịbịakwute gị, ma kwuo naanị okwu ka ahụ dị nwodibo m mma.
N’ihina mụ onwe m bụ onye nọ n’okpuru ike ọchịchị, nwekwa ndịagha nọ n’okpuru m. Ana m enye otu onye iwu sị Gaa, ọ gaba; gwa onye nke ọzọ sị, Bịa ọ bịa; gwakwa ohu m, Mee nke a o mee ya.”
Mgbe Jesu nụrụ nke a, o juru ya anya, o wee tụgharịa sị igwe mmadụ ndị na-eso ya, “Agwa m ụnụ, ahụbeghị m ụdị okwukwe dị otu a ọ bụladị n’lzrel.”
Ma mgbe ndị ọchịagha ahụ zitere lọghachiri n’ụlọ ya, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.
Igbo Mass Readings for September 15 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.