Igbo Mass Readings for October 12 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 12 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:22-24, 26-27, 31-5:1
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl degaara ndị Galeshịa
E dere ya n’akwụkwọ na Abraham nwere ụmụnwoke abụọ, otu n’ime ha bụ nwa onye ohu nke nwaanyị nke ọzọ bụ nwa nke nwaanyị ahụ nwe onwe ya.
A mụrụ nwa nke nwaanyị ohu ahụ site n’anụahụ, mụọ nwa nke nwaanyị ahụ new onwe ya site na nkwa.
Ugbu a, nke a bụ ihe ọmụma atụ: Ụmụnwaanyị abụọ ahụ bụ ọgbụgbandụ abụọ. Otu n’ime ha, nke bụ Haga, si n’ugwu Sinaị; ụmụ ọ na-amụ bụkwa ndị ohu.
Ma Jerusalem nke eluigwe new onwe ya, ọ bụ ya bụ nne anyị. N’ihina e dere sị, “ñụrịanụ ọñụ gị nwaanyị aga anaghị amụ nwa, tiwe mkpu ọñụ gị onye ime anaghị eme; n’ihina ụmụ nke nwaanyị ahụ a hapụrụ naanị ya dị ọtụtụ karịa ụmụnwaanyị nke nwere dị.
Ya bụ ụmụnna m anyị abụghị ụmụ nke nwaanyị ohu ahụ, kama anyị bụ ụmụ nke nwaanyị ahụ nke new onwe ya.
Anyị enwerela onwe anyị, n’ihina Kristi agbapụtala anyị n’ohu. Ya bụ kwụdosienụ ike dịka ndị nwerela onwe ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 113:1-2, 3-4, 5-7
Azịza: Ngọzi dịrị aha nke Chineke bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
1. Too, ụmụodibo nke Chineke
too aha nke Onyenweanyị
Ngọzi dịrị aha nke Chineke,
bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
Azịza: Ngọzi dịrị aha nke Chineke bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
2. Bido n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda ya,
Otito dịrị aha nke Osebụrụwa!
Onyenwenyị dị elu karịcha uwa niile,
Otito ya karịchakwara eluigwe niile.
Azịza: Ngọzi dịrị aha nke Chineke bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
3. Onye dịka Onyenweanyị bụ Chineke anyị?
ocheeze ya dị n’elu,
mana ọ na-eledata anya n’eluigwe na ụwa.
Ọ na-esi n’aja ebuli ndị ogbenye
ọ na-esikwa na ntụ ewelite ndị enweghị ka ọ dị ha.
Azịza: Ngọzi dịrị aha nke Chineke bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
MBEKU – Ps. 147:2, 15
Alleluịa, Alleluịa:
Jerusalem toonụ Onyenweanyị; Ọ na-ezipụ okwu ya n’ụwa niile.
Alleluịa.
OZIỌMA – 11:29-32
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe igwe mmadụ ahụ na-abawanye, Jesu bidoro na-ekwu sị: “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ; ọ na-achọ ihe ama, ma ọ dịghị ihe ama a ga-enye ya karịa ihe ama nke Jona.
N’ihina otu Jona si bụụrụ ndị obodo Ninive ihe ama, otu ahụ ka Nwa nke Mmadụ ahụ ga-esi bụụrụ ọgbọ a ihe ama.
N’ụbọchị ikpe ahụ, Ezenwaanyị Ndịda ugwu ga-ebili so ọgbọ a guzo n’ikpe, kpegbue ya. N’ihina o si nsọtụ nke ụwa bịa ịnụ okwu amamiihe Solomọn.
Ma lee, ihe karịrị Solomọn nọ ebe a. Ndị obodo Ninive ga-eso ọgbọ a kulie n’ụbọchị ikpe, kpegbue ya, n’ihina ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkuzi Jona, ma lee, ihe ka Jona dị n’ebe a.
Igbo Mass Readings for October 13 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for October 12 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.