Igbo Mass Readings for September 7 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 7 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Anụrụ m na e nwere ọtụtụ ịkwaiko n’etiti ụnụ, nke ụdị ya n’adịghị, ọ bụladị n’etiti ndị na-efe arụsị. Anụrụ m na otu onye n’ime ụnụ kpọọrọ nwunye nna ya, ha abụọ ebiri.

Ebe ọ dị otu a, olee isi nganga ụnụ na akpa? Gịnị mere ụnụ erughị ụjụ, kpuchie ihu ụnụ n’ihere? Biko chụpụnụ onye mere ihe dị otu a ọsịịsọ!

Ọ bụ eziokwu na anọghị m n’etiti ụnụ ugbu a, ma anọ m n’etiti ụnụ na mmụọ. Amala m onye ahụ mere ihe dị otu a ikpe dịka m ga-eme mgbe m nọ ya.

Eji m aha Dinwenụ Jesu ma ya ikpe. Mgbe ụnụ zukọrọ, aga m anọnyere ụnụ na mmụọ. N’oge ahụ, sitenụ n’ike nke Onyenweanyị Jesu, raranụ onye dị otu a nye ekwensu, ka ọ laa anụahụ ya n’iyi, ka e wee zọpụta mmụọ ya n’ụbọchị nke Onyenweanyị Jesu.

Ịnya isi ụnụ ezighị ezi. Ọ bụ na ụnụ amaghị na nwantakịrị ihe iko achịcha na-eko nnukwu akpa ntụ ọka? Ya mere, sachapụnụ ihe iko achịcha ochie ka ụnụ bụrụ ogbe achịcha ọhụrụ dịka ụnụ bụ achịcha ekoghị eko n’ezie.

N’ihina Kristi onye bụ nwa atụrụ nke oriri ngabiga anyị abụrụla ihe e jiri chụọ aja. N’ihi ya ka anyị mee omume a n’ejighị ihe na-eko achịcha ochie nke bụ ihe ọjọọ na obi ọjọọ, kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko nke bụ obi ọcha na eziokwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 5:4-6,6-7, 11

Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ eziokwu gị

1. Ị bụghị Chineke nke ajọomume na-amasị;

Ị naghị anabata ndị ajọ mmadụ n’ụlọ gị

Ndị na-anya isi anaghị akwụdosiike n’ihu gị.

Ị na-akpọ ndị ajọ mmadụ niile asị.

Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ eziokwu gị

2. Ị na-ekpochapụ ndị ụgha.

Onyenweanyị na-akpọ ndị na-egbu mmadụ

na ndị aghụghọ asị.

Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ eziokwu gị

3. Mana añụrị na-adịrị ndị niile ji gị mere ebe nchedo ha

añụrị ha enweghị ọgwụgwụ,

ebe ị na-echekwaba ha bụ ndị

na-añụrị na gị ndị hụrụ aha gị n’anya.

Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ eziokwu gị

MBEKU – Ps. 119:18

Alleluia, Alleluia:

Meghee anya m ka m wee hụ ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị.

Alleluia.                               

OZIỌMA – 6:6-11

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

N’ụbọchị Sabat nke ọzọ, mgbe Ọ banyere n’ụlọnzukọ ikuzi ihe, e nwere otu nwoke nọ n’ebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ.

Ndị Odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ na-ele ka ha hụ ma Ọ ga-agwọ mmadụ n’ụbọchị Sabat ka ha hụ ihe ha ga-eji bo ya ebubo.

Ebe ọ bụ na Ọ maara echiche obi ha, Jesu gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, “Bịa guzoro ebe a.”

O bilie guzoro ebe ahụ. Jesu asị ha, “Ana m ajụ ụnụ, o ziri ezi n’iwu ụbọchị Sabat ime ihe ọma ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ imebi ya?

O lezuru ha niile anya bịa si nwoke ahụ, “Gbatịa aka gị.” O mere nke a, aka ya wee dịkwa mma. Iwe na ọnụma jupụtara ha obi nke mere ha ji na-ekwukọrịta n’etiti onwe ha ihe ha ga-eme Jesu.

Igbo Mass Readings for September 8 2026, Emume nke Ọmụmụ nke Vegin Marịa dị Ngọzi

Igbo Mass Readings for September 7 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.