Igbo Mass Readings for September 22 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 22 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi  Ezra

N’afọ mbụ nke ọchịchị Saịrus eze Peshịa, iji mejuo okwu nke Yahweh nke o si n’ọnụ Jeremaya kwuo, Chineke kpalitere mmụọ Saịrus eze Peshịa nke mere ka o tinye iwu n’alaeze ya niile, deekwa ya edee, Eze Saịrus na-ekwu nke a sị: “Osebụrụwa Chineke nke eluigwe enyela m alaeze niile n’ụwa, Ọ gwala m ka m rụọrọ ya ụlọ na Jerusalem nke dị na Juda.

Onye ọbụla n’ime ụnụ nọ n’etiti ndị nke ya, ka Chineke ya nọnyere ya, ya bilie laa na Jerusalem nke nọ na Juda maka ị rụgharị ụlọ nke Dinwenụ Chineke nke Izrel bụ ya bụ Chineke nke nọ na Jerusalem.

Ka ndị mmadụ were ọlaọcha na ọlaedo kwado ndị a fọdụrụ ndụ n’ebe ọbụla ha bi. Ha werekwa ụmụ anụmaanụ na ihe onwunwe ndịọzọ, tinyekwara onyinye obi ọma maka ụlọ nke Chineke dị na Jerusalem kwado ha.

Ndịisi ezinụụlọ niile nke Juda na Benjamin na ndị ụkọchukwu na ụmụ Levaị, na onye ọbụla Chineke kpalitere mmụọ ya, biliri gaba ịrụgharị ụlọ nke Osebụrụwa nke dị na Jerusalem.

Ndị agbataobi ha jiri ọlaọcha na ọlaedo, ihe onwunwe na ụmụanụ nyere ha aka. Ha nyekwara ha ihe ndịọzọ dara oke ọnụ, tinyekwara onyinye obi ọma.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 126: 1-2, 2-3, 4-5,6

Azịza: Onyenweanyị emeerela anyị nnukwu ihe.

1. Mgbe Osebụrụwa gbapụtara Zayọn n’ohu,

ọ dị anyị ka nrọ

Oge ahụ ọchị na ukwe juru anyị ọnụ.

Azịza: Onyenweanyị emeerela anyị nnukwu ihe.

2. ọbụladị ndị ọgọmmụọ na-ekwu n’onwe ha na-asị;

“Lee ọrụ ịtụnaanya Chineke rụụrụ ha”

Lekene ọrụ ịtụnaanya Onyenweanyị rụụrụ anyị

n’ezie anyị na-enwe añụrị.

Azịza: Onyenweanyị emeerela anyị nnukwu ihe.

3. Kpọghachi ndi nke anyị e ji eji azụ, O Osebụrụwa,

Dịka mmiri si alaghachi na Negeb

Ndị niile ji anya mmiri na-akụ mkpụrụ,

Ji mkpu ọñụ ugbu a aghọ mkpụrụ.

Azịza: Onyenweanyị emeerela anyị nnukwu ihe.

4. Mgbe ha na-apụ ha bu mkpụrụ akụkụ na-ebe akwa,

Mgbe ha na-alọta, ha bu ukwu ọka na-ekwe ukwe añụrị.

Azịza: Onyenweanyị emeerela anyị nnukwu ihe.

MBEKU – Phil 2:15-16

Alleluia, Alleluia:

Chawapụtanụ dị ka ihe n’ụwa; Ụnụ na-ebutere ya okwu nke ndụ.

Alleluia

OZIỌMA – 8:16-18

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “O nweghị onye ọbụla ga-etinyecha ọkụ na mmụọkụ, were efere kpuchie ya, mọbụ dọba ya n’okpuru akwa ndina; kama ọ na-adọba ya n’elu ihe e ji adọba ọkụ, ka ndị na-abata n’ụlọ hụ ihe mgbe ha na-abata.

N’ihina ọ nweghị ihe ọbụla e zoro eze nke a agaghị eme ka ọ pụta ihe. O nweghịkwa ihe nzuzo ọbụla nke mmadụ na-agaghị ama, mekwaa ka ọ pụta ihe.

Ya mere, lezienụ anya otu ụnụ si anụ, n’ihina onye ọbụla nwere enwe, ka a ga-enyewanye, onye ọbụla na-enweghị enwe, ọ bụladị nke ntakịrị ọ na-eche na ya nweere ka a ga-anapụ ya.

Igbo Mass Readings for September 23 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 22 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.