Igbo Mass Readings for September 25 2028, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 25 2028, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:27-34
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ilu
Ajụla imere ndị chọrọ iheọma n’aka gị ọgọ mgbe ị nọ n’ọnọdụ ime ya. Agwala onye agbataobi gị, “Gaba, bịa ọzọ echi,” ebe i nwere ike ime ya ugbu a. Echela ihe ọjọọ megide onye agbataobi gị, onye weere gị ka enyi ya.
Gị na mmadụ ibe gị esela okwu na nkịtị, mgbe o meghị gị ihe ọjọọ ọbụla. Enwekwala anya ukwu n’ebe onye ajọomume nọ, eñomikwala ihe ọjọọ ya ọbụla; n’ihina onye ihe ọjọọ bụ arụ n’ihu Yahweh, ndị eziomume ka ọ na-achọ.
Yahweh na-abụ ụlọ onye ajọomume ọnụ, ma ọ na-agọzi ebe obibi onye eziomume. Ọ bụ ndị na-akwa emu ka ọ na-akwa emu, ọ na-egosi ndị umeala amara ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 15:2-3, 3-4, 5
Azịza: Onye na-ebi ndụ eziomume ga-ebi n’ugwu nsọ nke Onyenweanyị.
1. Onye nwere ikike ịbata n’ụlọ gị?
Ọ bụ nwoke ahụ na-ebughị njọ ọbụla na ndụ ya,
onye na-eme ihe dị mma,
onye ji obi ya niile ekwu eziokwu
onye na-anaghị ekwutọ ndịọzọ.
Azịza: Onye na-ebi ndụ eziomume ga-ebi n’ugwu nsọ nke Onyenweanyị.
2. Onye anaghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ
mọbụ bo ya ebubo asị
Onye na-eleda ndị amaghị Chineke anya
ma na-enye ndị na-atụ Yahweh egwu nsọpụrụ.
Azịza: Onye na-ebi ndụ eziomume ga-ebi n’ugwu nsọ nke Onyenweanyị.
3. Onye na-ebinye ego n’anaghị ọmụrụ nwa,
Onye anaghị eri ngarị iji megide Onye enweghị ihe ọjọọ o mere
Ọ bụrụ na mmadụ e mee ihe ndị a
O nweghị ihe ọbụla ga-eme ka egwu tụọ ya.
Azịza: Onye na-ebi ndụ eziomume ga-ebi n’ugwu nsọ nke Onyenweanyị.
MBEKU – Phil 2:15-16
Alleluia, Alleluia:
Chawapụtanụ dị ka ihe n’ụwa; Ụnụ na-ebutere ya okwu nke ndụ.
Alleluia
OZIỌMA – 8:16-18
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “O nweghị onye ọbụla ga-etinyecha ọkụ na mmụọkụ, were efere kpuchie ya, mọbụ dọba ya n’okpuru akwa ndina; kama ọ na-adọba ya n’elu ihe e ji adọba ọkụ, ka ndị na-abata n’ụlọ hụ ihe mgbe ha na-abata.
N’ihina ọ nweghị ihe ọbụla e zoro eze nke a agaghị eme ka ọ pụta ihe. O nweghịkwa ihe nzuzo ọbụla nke mmadụ na-agaghị ama, mekwaa ka ọ pụta ihe.
Ya mere, lezienụ anya otu ụnụ si anụ, n’ihina onye ọbụla nwere enwe, ka a ga-enyewanye, onye ọbụla na-enweghị enwe, ọ bụladị nke ntakịrị ọ na-eche na ya nweere ka a ga-anapụ ya.
Igbo Mass Readings for September 26 2028, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for September 25 2028, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.