Igbo Mass Readings for September 27 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 27 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:1-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Zecharịa

Okwu nke Yahweh nke igwe ndịagha bịakwutere m sị; “Osebụrụwa Chineke nke igwe ndịagha kwuru sị: Ekworo m dị ọkụ n’ihi Zayọn. Ekworo m nwere n’ebe ọ nọ na-anụ m ọkụ n’obi. Yahweh sịrị, Ana m alọghachi azụ na Zayọn.

Aga m ebi n’etiti Jerusalem. A ga-akpọ Jerusalem obodo kwesịrị ntụkwasịobi, a ga-akpọkwa ugwu nke Yahweh, nke igwe ndịagha, ugwu dị nsọ. Chineke nke igwe ndịagha kwuru sị: Ndị okenye nwoke na ndị okenye nwaanyị ga-anọdụkwa ọdụ ọzọ na mbara ama Jerusalem, onye ọbụla n’ime ha ga-enwe mkpara nke ọ ga-eji na-ejide onwe ya n’ihina ha emeela okenye nke ukwuu.

A ga-enwekwa ụmụokorobịa na ụmụagbọghọbịa ndị ga na-egwurị egwu na mbara ezi a. Osebụrụwa nke igwe ndịagha kwuru sị: Ọ bụrụ na ihe ndị a bụụrụ ụnụ ihe ịtụnaanya nye ndị ga-afọ (n’ụbọchị ahụ) ọ ga abụrụ m ihe ịtụnaanya?

Ọ bụ Yahweh na-ekwu. Yahweh nke igwe ndịagha kwuru sị: Lee, aga m azọpụta ndị nke m n’aka mba ndị dị n’ọwụwa anyanwụ, ma ndị nke dị n’ọdịda ya. Aga m akpọghachi ha azụ ka ha biri n’ime Jerusalem.

Ha ga-abụ ndị nke m, aga m abụkwa Chineke ha, onye obiọma na onye kwesịrị ntụkwasịobi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 102: 16-18, 19-21, 29, 22-23

Azịza: Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn, mekwaa ka a hụ ebube ya

1. Mba niile ga-atụ aha nke Onyenweanyị egwu

ndịeze ụwa niile ga-asọpụrụ otito gị:

n’ihina Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn

meekwa ka ahụ ebube ya

Ọ ga-aza ekpere ndị ogbenye,

ọ gaghị ajụ arịrịọ ha.

Azịza: Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn, mekwaa ka a hụ ebube ya

2. Ka e debaa ihe ndị a n’akwụkwọ

maka agbụrụ ndị ga-abịa n’ihu,

Ka ndị niile amụbeghị amụ were nwee ike too Onyenwenyị.

Onyenweanyị sitere n’ebe nke ya dị asọ were ledata anya

O sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya

Ka o were nụrụ ude ndị nọ na mkpọrọ na-asụ,

Ka o were tọhapụ ndị a mara ikpe ọnwụ.

Azịza: Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn, mekwaa ka a hụ ebube ya

3. Ụmụodibo gị ga-ebi n’udo,

ụmụ ụmụ ha ga-akwụdosikwa ike n’ihu gị.

N’ihi nke a aha Onyenweanyị

ga-ewu ewu na Zayọn,

otito ya ga-adịkwa na Jerusalem;

Mgbe mba niile na alaeze niile

ga-agbakọta ọnụ ife Onyenweanyị.

Azịza: Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn, mekwaa ka a hụ ebube ya

MBEKU – Jọn 14:5

Alleluịa, Alleluịa:

Mụ onwe m bụ ụzọ eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na m.

Alleluịa.

OZIỌMA – 9:46-50

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Ịrụụka dapụtara n’etiti ndị na-eso ụzọ Jesu, maka onye ka ibe ya ukwuu n’etiti ha. Ma mgbe Jesu matara ihe ha na-eche n’obi ha, O kuuru nwatakịrị, guzobe ya n’akụkụ ya.

Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nke ga-anara nwatakịrị a n’aha m, naara m. Onye ọbụla nke naara m, narakwara onye ahụ zitere m.

N’ihina onye dịkarịsịrị   nta n’etiti ụnụ niile bụ onye kacha ukwu. Jọn azaa sị, “Onye nkuzi anyị hụrụ otu na-achụpụ ajọ mmụọ n’aha gị, anyị wee gbochie ya, n’ihina ọ bụghị onye otu anyị.”

Ma Jesu sịrị ha, “Ụnụ egbochila ya, n’ihina onye ba-adịghị emegide ụnụ, nọnyere ụnụ.

Igbo Mass Readings for September 28 2027, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 27 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.