Igbo Mass Readings for October 20 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 20 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:20-25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Abraham e jighịkwa ekweghịekwe nwe obi abụọ banyere nkwa ahụ Chineke kwere ya. Kama okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na enye Chineke otito.
Obi siri ya ike nke ukwu na Chineke pụrụ imezu ihe o kwere na nkwa. N’ihi nke a ka Chineke ji site n’okwukwe ‘gụọ Abraham n’onye eziomume.’ E deghị okwu a bụ, ‘A gụnyere ya n’onye eziomume’ maka naanị Abraham.
Edekwara ya maka anyị bụ ndị kwere n’onye ahụ mere ka Dinwenụ anyị Jesu Kristi si n’ọnwụ bilie. Jesu Kristi onye e gburu n’ihi mmehie anyị, sikwa n’ọnwụ bilie n’ihi nzọpụta anyị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Luk 1:69-70, 71-72, 73-75
Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel, maka na Ọ bịara leta ndị nke ya.
1. O weliterela anyị onye nzọpụta
site n’agbụrụ Devid, nwodibo ya;
Otu o siri kwuo n’oge ochie,
site n’ọnụ ndị amụma ya.
Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel, maka na Ọ bịara leta ndị nke ya.
2. Na a ga-azọpụta anyị site n’aka ndị iro anyị,
Gosi ebere nke o kwere nnanna anyị ha na nkwa,
bịa chetakwa ọgbụgbandụ ya dị nsọ.
Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel, maka na Ọ bịara leta ndị nke ya.
3. Ọ ñụụrụ nnanna anyị bụ Abraham iyi
Kwekwa nkwa na ya ga-azọpụta anyị n’aka ndị iro anyị
Ka anyị nwee ike na-ekpere ya atụghị egwu ọbụla
ụbọchị niile nke ndụ anyị.
Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel, maka na Ọ bịara leta ndị nke ya.
MBEKU – Matt 4:4
Alleluịa, Alleluịa:
Ọ bụghị naanị site na nrị ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.
Alleluịa.
OZIỌMA – 12:13-21
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Otu onye n’ime igwe mmadụ sịrị Jesu, “Onye nkụzi, gwa nwanne m nwoke ka anyị kee ihe anyị nwetara n’aka nna anyị.”
Ma Jesu zara ya sị, “Nwoke m, onye mere m onye ikpe mọbụ onye na-eke ihe n’ebe ụnụ?”
Ọ gwara ha sị, “Kpacharanụ anya, zerekwanụ anyaukwu niile; n’ihina ihe mejupụtara ndụ mmadụ abụghị oke akụnụụba o nwere.”
Ọ gwakwara ha okwu n’ụkabụilu sị, “Ala ubi otu nwoke bara ọgaranya wetara ọtụtụ ihe; o wee na-eche n’ime obi ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme n’ihina enweghị m ebe m ga-echekwa ihe ubi m ndị a?’
O kwuru sị, ‘Nke a ka m ga-eme: aga m akwatu ọba m niile, rụọ ndị nke ha obosara, ebe ahụ ka m ga-echekwa ọka m niile na akụnụụba m niile.
Mgbe ahụ aga m asị mkpụrụobi m, ‘Mkpụrụobi I nwere ọtụtụ akụnụụba e debeere gị maka ọtụtụ afọ; dere jụụ, rie ñụọ, nwee obi añụrị.
Ma Chineke sịrị ya, ‘Onye nzuzu! N’abalị taa ka m ga-achọ mkpụrụobi gị n’aka gị; ihe niile ị kpakọrọ nke onye ka ha ga-abụ?
Otu a ka ọ dị onye ọbụla na-akwadoro onwe ya akụ ma ọ bụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”
Igbo Mass Readings for October 20 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.