Igbo Mass Readings for October 19 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 19 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-10
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl degaara ndị Efesọs.
Chineke mere ka ụnụ dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụnụ nwụrụ anwụ site na njehie ụzọ, ya na njọ ụnụ, nke ụnụ biri n’ime ya na mbụ;
na-awagharị n’ụzọ na n’omume ọjọọ nke ndị bi n’ụwa ụnụ na-esokwa onye ọchịchị na-achị ike nke ikuku bụ mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụnụ bụ ụmụ nke nnupụisi.
Anyị niile ebitụla na mbụ n’etiti ihe ndị a mgbe anyị na -eso ọchịchọ nke anụahụ na nke mmụọ anyị. Anyị si ụzọ dị otu a soro ndị ọzọ niile bụrụ ndị e meere iwe nke Chineke.
Ma Chineke onye nke jupụtara n’ebere, site na nnukwu ịhụnaanya nke ọ hụrụ anyị. ọ bụladị mgbe anyị nwụrụ anwụ site na njọ anyị, mere ka anyị soro Kristi dịkwa ndụ ọzọ. (Site n’amara ụnụ enwetala nzọpụta).
O kulitekwara anyị na ya meekwaa ka anyị na ya nọrọ n’alaeze eluigwe n’ime Jesu Kristi; ka o wee bụrụ na ọgbọ na-abịa n’ihu na ọ ga-egosi ụba nke amara ya na-enweghị atụ n’obi ọma ya n’ebe anyị nọ n’ime Jesu Kristi.
N’ihina e jirila amara zọpụta ụnụ site n’okwukwe; ọ bụghị site n’ike ụnụ, kama ọ bụ onyinye nke Chineke, ọ bụghị site n’ọrụ ka onye ọbụla gharakwa ịnya isi.
Anyị bụ aka ọrụ ya e kere n’ime Jesu Kristi maka ezi ọrụ Chineke kwadobere site na mbụ, nke anyị kwesịrị ịga n’ime ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 100: 1-2, 3, 4, 4-5.
Azịza: Onyenweanyị bụ Chineke kere anyị, Ọ bụkwa ya nwe anyị.
1. Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ
Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu ya.
Azịza: Onyenweanyị bụ Chineke kere anyị, Ọ bụkwa ya nwe anyị.
2. Maranụ na Onyenweanyị bụ Chineke
ya kere anyị, Ọ bụkwa ya nwe anyị,
anyị bụ ndị nke ya, anyị bụkwa igwe atụrụ ya.
Azịza: Onyenweanyị bụ Chineke kere anyị, Ọ bụkwa ya nwe anyị.
3. Werenụ ekele baa n’ọnụụzọ ama ya niile,
Werenụ otito ba n’ogige ya niile.
Azịza: Onyenweanyị bụ Chineke kere anyị, Ọ bụkwa ya nwe anyị.
4. Kelenụ ya gọziekwanụ aha ya n’ihina
Onyenweanyị dị mma, ịhụnaanya ya na-adị ebeebe
ntukwasịobi ya na-adịgide bido
na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.
Azịza: Onyenweanyị bụ Chineke kere anyị, Ọ bụkwa ya nwe anyị.
MBEKU – Matt 4:4
Alleluịa, Alleluịa:
Ọ bụghị naanị site na nrị ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.
Alleluịa.
OZIỌMA – 12:13-21
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Otu onye n’ime igwe mmadụ sịrị Jesu, “Onye nkụzi, gwa nwanne m nwoke ka anyị kee ihe anyị nwetara n’aka nna anyị.”
Ma Jesu zara ya sị, “Nwoke m, onye mere m onye ikpe mọbụ onye na-eke ihe n’ebe ụnụ?”
Ọ gwara ha sị, “Kpacharanụ anya, zerekwanụ anyaukwu niile; n’ihina ihe mejupụtara ndụ mmadụ abụghị oke akụnụụba o nwere.”
Ọ gwakwara ha okwu n’ụkabụilu sị, “Ala ubi otu nwoke bara ọgaranya wetara ọtụtụ ihe; o wee na-eche n’ime obi ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme n’ihina enweghị m ebe m ga-echekwa ihe ubi m ndị a?’
O kwuru sị, ‘Nke a ka m ga-eme: aga m akwatu ọba m niile, rụọ ndị nke ha obosara, ebe ahụ ka m ga-echekwa ọka m niile na akụnụụba m niile.
Mgbe ahụ aga m asị mkpụrụobi m, ‘Mkpụrụobi I nwere ọtụtụ akụnụụba e debeere gị maka ọtụtụ afọ; dere jụụ, rie ñụọ, nwee obi añụrị.
Ma Chineke sịrị ya, ‘Onye nzuzu! N’abalị taa ka m ga-achọ mkpụrụobi gị n’aka gị; ihe niile ị kpakọrọ nke onye ka ha ga-abụ?
Otu a ka ọ dị onye ọbụla na-akwadoro onwe ya akụ ma ọ bụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”
Igbo Mass Readings for October 20 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for October 19 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.