Igbo Mass Readings for August 25 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 25 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:2-5, 8-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl Degaara Ndị Tesalonịka
Anyị na-ekele Chineke mgbe ọbụla banyere ụnụ niile na-echetakwa ụnụ oge niile anyị na-ekpe ekpere. Anyị na-echeta n’ihu Chineke Nna anyị ọrụ okwukwe ụnụ, na nke ịhụnaanya na nkwụdosịike nke okwukwe, n’ime Dinwenụ anyị Jesu Kristi.
Anyị maara ụmụnna m ndị Chineke hụrụ n’anya, na ọ họrọla ụnụ. Oziọma ahụ anyị wetaara ụnụ abụghị naanị site n’okwu ọnụ, kama ọ bụkwa n’ike nke Mmụọ Nsọ.
Ọ bụkwa oziọma ahụ nke eziokwu ya were anya. Ụnụ matakwara ụdị mmadụ anyị gosipụtara n’etiti ụnụ. Ụnụ ñomikwara anyị na Dinwenụ.
Ọ bụ ezie na ụnụ tara nnukwu ahụhụ, ma ụnụ jiri ọñụ nke sitere n’aka Mmụọ Nsọ nara ozi ahụ; nke mere ụnụ ji bụrụ ihe ịmaatụ nye ndị niile kwere ekwe na Masedonia na Akaya.
Ọ bụghị naanị na okwu nke Dinwenụ esila n’aka ụnụ gbasaa na Masedonia na Akaya; kama okwukwe ụnụ n’ime Chineke agazuola ebe niile nke na ọ dịghịkwa mkpa anyị ikwu ihe ọbụla.
Ha onwe ha na-ekwu banyere anyị, ụdị nnabata ụnụ nyere anyị n’etiti ụnụ, na otu ụnụ siri hapụ ife arụsị ma febe ezi Chukwu dị ndụ, na ichere Nwa ya nke si n’eluigwe onye O siri na ndị nwụrụ anwụ kulite, onye na-azọpụta anyị n’iwe nke ga-abịanụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 149:1-2, 3-4, 5-6, 9
Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.
1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
ka ọgbakọ ndị kwere na ya kweere ya ukwe otito.
Ka Izrel ñụrịa ọñụ n’ihi onye kere ya,
Ka ụmụ Zayọn ñụrịa n’ihi onyeeze ha.
Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.
2. Ka ha were ịgba egwu too aha ya
ka ha were ịgba na ụbọ akwara gbaara ya egwu.
N’ihina Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ
O kpubela ndị umeala okpu nke mmeri.
Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.
3. Ka ndị nke ya ñụrịa na mmeri ha
Ka ha daa n’ala n’ihu Chineke
Na-eto ya oge niile
Ka nnukwu ukwe otito Chineke jupụta n’ọnụ ha
nke a bụ otito nke ndị nke ya kwere ekwe.
Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.
MBEKU – Ps. 27:11
Alleluia, Alleluia:
Kuziere m ụzọ gị O Dinwenụ, dube m n’ụzọ kwụ ọtọ.
Alleluia
OZIỌMA – 23:13-22
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu kwuru sị: “Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ụnụ, bụ ndị ihuabụọ. Ụnụ na-akpọchibido ndị mmadụ ọnụụzọ nke eluigwe makana ụnụ onwe ụnụ anaghị abanye nke ụnụ na-ekwe ka ndịọzọ baa.
Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ụnụ bụ ndị ihuabụọ, ụnụ na-apụnarị ụmụnwaanyị ajadu ihe ndị ha nwere n’aka ike n’agbanyeghị na ụnụ na-egosipụta na ụnụ na-ekpe oke ekpere.
Ahụhụ dị egwu ga-abụ ụgwọ ụnụ ga-anata. Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ụnụ ndị ihuabụọ. Ụnụ na-agafe oke osimiri na mba dị icheiche iji tọghata otu onye ga-esonyere ụnụ.
Mgbe ụnụ tọghatara ya ụnụ emee ya ka ọ bụrụ nwa nke ọkụmmụọ okpukpu abụọ dịka ụnụ onwe ụnụ bụ. Azị gbakwa ụnụ, ndị ndu kpuru isi.
Ụnụ na-asị na onye ọbụla jiri ụlọnsọ ñụọ iyi o nweghị ihe ọbụla ọ bụ, ma ọ bụrụ na onye ọbụla ejiri ọlaedo nke dị n’ụlọnsọ ñụọ iyi iwu ji ya. Ụnụ ndị nzuzu kpuru isi!
Olee nke ka ibe ya, ọlaedo dị n’ụlọnsọ ka ọ bụ ụlọnsọ nke mere ọlaedo ahụ ka ọ dị nsọ? Ụnụ na-akụzikwa sị, ọ bụrụ na onye ọbụla ejiri ekwuaja ñụọ iyi, ọ dịghị ihe ọ bụ.
Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ewere onyinye dị n’elu ya ñụọ iyi iwu ji ya. Ụnụ ndị kpuru isi. Olee nke ka ibe ya, onyinye ka ọ bụ ekwuaja nke mere ya ka ọ dị nsọ?
Ya mere, onye ọbụla ji ekwuaja ñụọ iyi jikwazi ma ekwuaja ma ihe niile dị n’elu ya ñụọ iyi. Ọzọkwa onye ọbụla jiri ụlọnsọ ñụọ iyi jikwazi ma ụlọnsọ ma onye bi n’ime ya ñụọ iyi. Onye ọbụla nke ji eluigwe ñụọ iyi jikwazi ma ocheeze Chineke ma onye nọ na ya ñụọ iyi.
Igbo Mass Readings for August 25 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.