Igbo Mass Readings for November 13 2028, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 13 2028, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Titus
Mụ onwe m bụ Pọl, odibo nke Chukwu, na nwaazụ nke Jesu Kristi. Chukwu kpọrọ m ịkwalite okwukwe nke ndị ahụ ọ họpụtara, na iduzi ha n’ụzọ ịmazu eziokwu ahụ banyere ezi ofufe nke Chineke.
Nke a dabeere n’olileanya maka ndụ ebeebe nke Chineke kwere anyị na nkwa n’oge gara aga. Mgbe oge ya ruru, Chineke mere ka ihe ndị a pụta ihe n’okwu ya, nke ya bụ onye Nzọpụta anyị hanyere m n’aka ikwusa.
Ana m edegara gị Taịtus, ezigbo nwa m n’otu okwukwe, akwụkwọozi a. Ka amara na udo nke Chukwu Nna na onye Nzọpụta anyị bụ Jesu Kristi dịrị gị.
Ihe m ji hapụ gị na Kret bụ ka i nwee ike dozie ihe ụfọdụ a na-edozibeghị, ka ị họpụtakwa ndị okenye n’obodo niile, dịka m si gwa gị. Ya bụ, onye ọbụla n’ime ha ga-abụrịrị onye na-enweghị ntụpọ.
Ọ ga-abụkwa onye na-alụ otu nwaanyị. Ụmụ ya ga-abụ ndị kwere n’Onyenweanyị, ndị a ma na ha anaghị ebi ndụ ọjọọ mọbụ na-eme isiike. N’ihina onye na-elekọta nzukọ Kristi, dịka onye na-agbara Chineke odibo, ga-abụrịrị onye na-enweghị ntụpọ ọbụla.
Ọ gaghị abụ onye na-anaghị asọpụrụ mmadụ ibe ya, onye iweọkụ, onye añụrụma, onye na-eme mmadụ ihe n’ike mọbụ onye ji anya ukwu achọ akụ nke ụwa nke a.
Ọ ga-abụrịrị onye na-eleta ndị ọbịa nke ọma, na onye ihe dị mma na-amasị. Ọ ga-abụkwa onye uche ya zuru oke, onye eziomume, onye dị nsọ na onye na-ejide onwe ya.
Ọ ga-ejidesi eziokwu nke okwukwe a kụziere ya ike. Nke a ga-eme ka o nwee ike ịkụziri ndịọzọ eziokwu ahụ, nwekwaa ike igosi ndị nkuzi asị ebe ha si gahie ụzọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 24:1-2, 3-4, 5-6
Azịza: Onyenweanyị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ihu Chineke nke Jekọb.
1. Chineke nwe ụwa na ihe niile dị na ya,
Ụwa na ndị niile bi n’ime ya;
Ọ bụ ya wukwasara ya n’elu mmiri
Ọ bu ya wuru ya n’elu osimiri.
Azịza: Onyenweanyị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ihu Chineke nke Jekọb.
2. Onye nwere ike irigoro n’ugwu nke Onyenweanyị?
Onye nwere ike ịnọ n’ebe ya dị nsọ?
Onye aka ya na obi ya dị ọcha
Onye anaghị etinye obi ya n’ihe efu,
Onye anaghị añụ iyi asị.
Azịza: Onyenweanyị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ihu Chineke nke Jekọb.
3. Onye dị otu a ga-anata ngọzi n’aka Onyenweanyị,
Ọ ga-anatakwa eziomume n’aka
Chineke onye nzọpụta ya.
Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị,
Ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekọb!
Azịza: Onyenweanyị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ihu Chineke nke Jekọb.
MBEKU – 1 Thes 2:13
Alleluia, Alleluia:
Naranụ ozi nke anyị wetaara ụnụ, ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe ọ bụ n’onwe ya, okwu nke Chineke.
Alleluia
OZIỌMA – 17:1-6
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọnwụnwa dị icheiche nke ga-eduba mmadụ na njọ ga-abịarịrị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ha ga-esi n’aka ya bịa.
Ọ ga-akara ya mma ma a sị na a nyanyere ya nkume e ji akwọ ihe nri n’olu, tụba ya n’ime oke osimiri, karịa na ọ ga-eduba otu n’ime ụmụaka ndị a na njọ. Kpacharanụ anya ụnụ.
Ọ bụrụ na nwanne gị mee ihe ọjọọ, dụọ ya ọdụ. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. Ọ bụrụ na o mehie gị ugboro asaa sị, ‘Echegharịala m,’ ị ga-agbaghara ya.”
Ndị ụmụazụ Jesu gwara ya sị, “Mee ka okwukwe anyị bawanye.” Onyenweanyị azaa ha, “Ọ bụrụ na ụnụ nwere okwukwe buru ibu ka mkpụrụ osisi dịkarịchara nta a na-akpọ mọstad, ụnụ nwere ike inye osisi ọjị iwu sị, ‘ka e fopụ gị, kụkwaa gị n’ime osimiri!’ Ọ ga-erubekwara ụnụ isi.”
Igbo Mass Readings for November 14 2028, Tuzde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for November 13 2028, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.