Igbo Mass Readings for October 27 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 27 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:12-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Ụmụnna m, anyị ji ụgwọ. Ma ọ bụghị anụahụ ka anyị ji ụgwọ ịdị ndụ dịka ọchịchọ ya si dị. Ọ bụrụ na ụnụ na-ebi ndụ dịka anụahụ si chọọ, ụnụ ga-anwụ.

Ma ọ bụrụ na ụnụ ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụahụ nwụọ, ụnụ ga-adị ndụ. N’ihina ndị niile Mmụọ nke Chineke na-edu bụ ụmụ Chineke.

Mmụọ nke ụnụ natara abụghị mmụọ nke ịbụ ohu, nke ga-eme ka ụnụ laghachi n’ịtụ egwu. Mmụọ nke ụnụ natara bụ mmụọ nke ụmụ Chineke, nke na-eme ka ụnụ tikuo Chineke sị, ‘Abba! Ezi nna.’

Mmụọ Nsọ ahụ n’onwe ya sokwa mmụọ anyị na-agba ama na anyị bụ ụmụ Chineke. Ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ Chineke, anyị sokwa na ndị ha na Kristi ga-eketa alaeze ya. Ọ bụrụ na anyị soro Kristi taa ahụhụ, anyị ga-esokwa ya keta oke otito ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 68: 2, 4, 6-7, 20-21

Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.

1. Ka Chineke bilie, ka ndịiro ya gbasasịa,

Ka ndị niile kpọrọ ya asị gbapụ n’ihu ya

ndị eziomume na-añụrị ọñụ,

ha na-añụrị oke ọñụ na-ekwekwa ukwe añụrị.

Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.

2. Nna ndị na-enweghị nne na nna,

Onye ogbugbo ndị ajadu

Otu ahụ ka Chineke sị dị n’ebe obibi ya dị nsọ;

Onye na-enye ndị nọ na mkpọrọ añụrị

Site n’ime ka ha nwere onwe ha.

Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.

3. Ngọzi dịrị Onyenweanyị ụbọchị niile,

Chineke na-azọpụta anyị, na-ebukwa ibu anyị

Chineke anyị a bụ Chineke na-azọpụta

ọ bụ Onyenweanyị Chineke nweụzọ e si agbanarị ọnwụ.

Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.

MBEKU – Ps. 119:27

Alleluịa, Alleluịa:

Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.

Alleluịa.

OZIỌMA – 13:10-17.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

N’otu ụbọchị izu ike, Jesu nọ n’otu ụlọnzukọ ndị Juu na-akuzi ihe. N’ebe ahụ, e nwere nwaanyị nke mmụọ nrịanrịa ji ihe dịka afọ iri na asatọ.

Ọ rọọla nwanyị ahụ o nweghịkwa ike iguzozi eguzo.  Mgbe Jesu hụrụ ya, Ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwaanyị, e meela ka ị pụọ na nrịanrịa gị.” Jesu bikwasara ya aka ya abụọ, ozigbo nwaanyị guzozie, wee too Chineke.

Iwe were onyeisi ụlọnzukọ ahụ, n’ihina Jesu gwọrọ ọrịa n’ụbọchị Sabat; maka nke a ọ gwara ndị mmadụ sị, “Ọ dị ụbọchị isii iwu nyere mmadụ ike ịrụ ọrụ, bịanụ n’ụbọchị ndị ahụ ka a gwọọ ụnụ, ọ bụghị n’ụbọchị sabat.”

Onyenwenayị zara ya sị, “Ụnụ ndị ihu abụọ! O nwere onye n’ime ụnụ na-anaghị atọpụ ehi ya mọbụ ịnyịnyaibu ya n’ụlọ anụ, duga ya ka ọ ñụọ mmiri n’ụbọchi izuike?

Ọ bụ na nwaanyị a bụ ada nke si n’agbụrụ Abraham, onye Ekwensu kere agbụ, kamgbe afọ iri na asatọ ekwesịghị ka a tọpụ ya agbụ n’ụbọchị izuike?”

Ka ọ na-ekwu nke a, ihere mere ndịiro ya niile, ma ndị mmadụ niile nwere añụrị maka ihi ọrụ ebube nke ọ rụrụ.

Igbo Mass Readings for October 28 2025, Emume Ncheta Saịmọn na Jude dị Asọ – Ụmụazụ.

Igbo Mass Readings for October 27 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.