Igbo Mass Readings for July 7 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 7 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 28:10-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis

Jekọb hapụrụ Biasheba gaba obodo Haran. Oge o rutere n’otu ebe, ọ kwụsịrị nọọ abalị ahụ n’ebe ọ bụ na anwụ adaala. Ka o weere otu nkume dị n’ebe ahụ, o jiri ya mere nhiweisi bịakwa dina ala n’ebe ahụ ọ nọ.

Ọ rọrọ nrọ; n’ime ya, ọ hụrụ otu mbube kwu ebe ahụ nke elu ya na-emetu Eluigwe, ma e nwekwara ndị mmụọọma Chineke na-arịgo nakwa arịda n’elu ya. Yahweh guzokwa n’akụkụ ya na-ekwu sị, “Abụ m Yahweh Chineke nke nna gị Abraham na Aịzik.

Aga m enye gị na ụmụụmụ gị ala ebe a i dina. Ụmụụmụ gị ga-adị ụba dịka mkpụrụ aja dị n’ala, ị ga-agbasa ruo n’akụkụ ọwụwa na ọdịda anyanwụ, nakwa n’ebe mgbago ugwu na ndịda ugwu, mba niile dị n’ụwa ga-eji gị na ụmụụmụ gị gọzie onwe ha.

Ka o wee gị anya na m nọnyeere gị, aga m echedo gị ebe ọbụla ị gara, kpọghachikwa gị azụ n’ala a, n’ihina agaghị m ahapụ gị”. Mgbe ahụ Jekọb siri n’ụra ya teta bịa tie mkpu sị: “N’ezie Yahweh nọ n’ebe a ma amaghị m”.

Ụjọ bịara ya n’ahụ, nke na o tiri mkpu sị, “Lee ka ebe a si dị egwu. Ebe a aghaghị ịbụ ụlọ obibi nke Chineke, ebe a bụkwa ọnụụzọ nke Eluigwe”.

Ka o tetara n’ụzọ ụtụtụ, Jekọb ewere okwute ahụ o ji mere nhiweisi gwunye n’ala ebe ahụ ka “ogidi ncheta.” Ọ wụsara mmanụ n’elu okwute ahụ. Ọ gụkwara ebe ahụ aha, kpọọ ya Betel nke a na-akpọ Lụz na mbụ.

Jekọb kwere nkwa sị: “Ọ bụrụ na Chineke anọnyere m, bịakwa chekwaa m na njem mụ na-eje, ọ bụrụ na o nye m ihe oriri na uwe, ọ bụrụkwa na m lọghachi n’udo n’ụlọ nna m, Yahweh ga-abụ Chineke m.

Okwute a m wuwere ka “ogidi ncheta” ga-abụ ụlọ Chineke, agakwa m akwụghachi gị ezie otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile i nyere m”.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 91:1-2, 3-4, 14-15

Azịza: Na gị, O Chineke m, ka m tụkwasara obi.

1. Onye bi na ndo nke onye kasị elu

na nchedo nke onyejiikeniile,

ga-asị Onyenweanyị, “Ị bụ onye nchedo m na ike m,

Chineke m, onye m tụkwasara obi!

Azịza: Na gị, O Chineke m, ka m tụkwasara obi.

2. Ọ ga-azọpụta gị n’ọnya niile nke ndịiro,

na ajọ ọrịa niile.

Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị,

Ọ bụ n’okpuru nku ya ka ị ga-enweta nchedo.

Azịza: Na gị, O Chineke m, ka m tụkwasara obi.

3. Ebe ọ bụ na ọ gbakwutere m, aga m azọpụta ya;

aga m echekwaba ya n’ihina ọ maara aha m.

Mgbe ọbụla ọ kpọkuru m aga m aza ya,

aga m anọnyere ya n’oge nsogbu.

Azịza: Na gị, O Chineke m, ka m tụkwasara obi.

MBEKU – Ps. 119:88

Alleluia, Alleluịa:

Onyenweanyị zọpụta m, ka m wee nwee ike idobe iwu gị.

Alleluịa.

OZIỌMA – 9:18-26

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu ka na-agwa ha ihe ndị a mgbe otu onyeisi ọchịchị bịara sekpuru n’ihu ya, rịọ ya sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwaanyị nwụrụ, biko bịa bikwasa ya aka, ka ọ dịkwa ndụ ọzọ”. Jesu biliri kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sobe ya.

Mgbe ha na-aga, otu nwaanyị rịarala mbiọbara afọ iri na -abụọ siri n’azụ metụ ọnụ uwe Jesu aka, n’ihina o kwuru n’obi ya sị, “Ọ bụrụ na m metụ naanị uwe ya aka, ahụ ga-adị m mma”. Mgbe Jesu tụgharịrị hụ nwaanyị ahụ, Ọ sịrị ya, “Obi sie gị ike nwa m nwaanyị, okwukwe gị agwọọla gị”.

Ozigbo ahụ, ahụ adị nwaanyị ahụ mma. Mgbe Jesu bịaruru n’ụlọ onye ọchịchị ahụ, ọ hụrụ ndị na-afụ ọja na igwe mmadụ ndị na-atụ ụzụ. Wee sị ha, “Sinụ ebe a pụọ, n’ihina nwaagbọghọ a anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra”.

Ha chịrị ya ọchị. Mgbe a chụpụchara igwe mmadụ ahụ n’ezi, Jesu banyere n’ime ụlọ, jide nwagbọghọ ahụ n’aka, o wee bilie. Akụkọ ihe a Jesu mere gazuru akụkụ ala ahụ niile.

Igbo Mass Readings for July 8 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for July 7 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.