Igbo Mass Readings for August 4 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 4 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:4-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọnụọgụgụ

Ugbu a, ndị nnupụisi nọ n’etiti ha malitere nwewe oke akpịrị nke mere na ụmụ Izrel ndịọzọ sooro ha tamuwekwa ntamu na-asị: “Onye ga-enye anyị anụ anyị ga-ata?

N’ala ljipt, anyị riri ụdị azụ ọbụla anyị chọrọ, n’akwụghị ụgwọ; anyị rikwara ụgbọgụrụ, ọkwụrụ, egwusi mmiri na ụdị yabasị a na-akpọ Lik, na nke a na-akpọ Galik. Ụnụ chetakwara ihe ndị a?

Ma ugbu a, ike agwụla anyị, ọ dịghịkwa ihe oriri ọbụla ọzọ anyị nwere, e wepụ mana, nke anyị na-eri kwa ụbọchị!” Mana ahụ dịka mkpụrụ osisi nta dị ọcha, na-achatụ edo edo.

Ndị Izrel na-ejegharị na-achịkọta ya were nkume gwerie ya mọbụ surie ya n’ikwe. Mgbe ahụ ha ga-esi ya n’ite, were ya mee achịcha. Ọ na-atọkwa ka achịcha e ji mmanụ oliv mee.

Mana ahụ so igirigi na-ada n’ abalị n’ebe ha bi. Mosis nụrụ ka ndị Izrel na-ebe akwa; ezinụụlọ ọbụla guzo n’ihu ụlọikwu ha; Yahweh were nnukwu iwe n’ebe ha nọ.

O wutere Mosis nke ukwuu. O wee sị Yahweh, “Gịnị mere i jiri mee nwodibo gị ihe ọjọọ dị otu a? Gịnị mere na m enwezịghị ihuọma n’ebe ị nọ, nke na i borom ibu nile dị n’ilekọta ndị nke a anya?

Ọ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ bụ m mụrụ ha? Gịnị mere i ji sị m bụụrụ ha nwa na-eku nwa, nke na aga m na-eku ha n’aka m abụọ dịka ụmụ ọhụrụ, ruo ala ahụ i kwere nnanna ha ochie na nkwa, inye ha?

Olee ebe m ga-azụta anụ ga-ezu igwe mmadụ ndị a? Ha ji anya mmiri, na-arịọ ka m nye ha anụ ha ga-eri. Naanị m agaghị ebuli ibu dị n’ilekọta ndị nke a anya, n’ihina ibu ha kariri m.

Ya mere, ọ bụrụ otu a ka ị chọrọ imeso m, ọ kaara m mma na i gburu m karịa ịnọ ndụ na-ahụ ahụhụ ndị a.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 81: 12-13, 14-15, 16-17

Azịza: Tierenụ Chineke bụ ike anyị mkpu ọñụ, kwerenụ Chineke nke Jekọb ukwe ọñụ!

1. Ndị nke m egeghị m ntị;

Izrel ekweghị erubere m isi.

Ya mere m jiri hapụ ha n’ isiike ha

ka ha mebe ihe masịrị ha.

Azịza: Tierenụ Chineke bụ ike anyị mkpu ọñụ, kwerenụ Chineke nke Jekọb ukwe ọñụ!

2. A sị na ndị nke m ga-ege ntị;

a sị na Izrel ga-eso ụzọ m!

N’otu ntabi anya, aga m emeri ndịiro ha

Lụso ndị na-ebuso ha agha ọgụ.

Azịza: Tierenụ Chineke bụ ike anyị mkpu ọñụ, kwerenụ Chineke nke Jekọb ukwe ọñụ!

3. Ndị niile kpọrọ Onyenweanyị asị

ga-abụ ndị ga-ada ụjọ n’ihu ya,

ntaramahụhụ ha ga-adị ebeebe.

Mana aga m eji ọka dị mma zụọ ụnụ nri,

Were mmanụ añụ si n’okwute nyejuo ụnụ afọ.

Azịza: Tierenụ Chineke bụ ike anyị mkpu ọñụ, kwerenụ Chineke nke Jekọb ukwe ọñụ!

MBEKU – Matiu 4:4

Alleluia, Alleluia

Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.

Alleluia.

OZIỌMA – 14:13-21

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe Jesu nụrụ nke a o jiri ụgbọmmiri si n’ebe ahụ pụọ, gaa ebe dara Jụụ, nọrọ naanị ya. Ma mgbe igwe mmadụ dị icheiche nụrụ ya, ha siri obodo dị icheiche were ụkwụala sobe ya.

Ka ọ pụtara n’elu ala, ọ hụrụ oke igwe mmadụ, o meere ha ebere ma gwọkwaa ndị ahụ na-adịghị ike nọ n’etiti ha.

N’oge mgbede, ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya sị, “Ebe a bụ ọzara, oge agakwaala; zipụ igwe mmadụ ndị a ka ha jee n’ime obodo dị icheiche zụrụ nri ha ga-eri.”

Jesu zara ha sị, Ọ dịghị mkpa ka ha si ebe a pụọ, kama nyenụ ha ihe ka ha rie.” Ha zara ya sị, “Ihe anyị nwere bụ naanị ogbe achịcha ise na mkpụrụ azụ abụọ.”

Jesu wee sị ha, “Wetaranụ m ha n’ebe a.” O nyere iwu ka ha nọdụ ala n’elu ahịhịa. O were ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ, leelite anya elu, gọzie ha, nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya achịcha ahụ, ha wee keere ha igwe mmadụ ndị ahụ.

Ha niile rijuru afọ. Ha kpokọtara iberibe achịcha fọdụrụnụ, nkata iri na abụọ. Ndị riri achịcha ahụ dị puku mmadụ ise, ma e wezuga ụmụnwaanyị na ụmụntakịrị.

Igbo Mass Readings for August 5 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for August 4 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.