Igbo Mass Readings for August 3 2026, Mọnde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 3 2026, Mọnde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 28:1-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah

N’otu afọ ahụ, na mbido ọchịchị nke Zedekaya eze nke Juda n’ime ọnwa nke ise n’ime afọ nke anọ, Hananaya nwa Azọ, onye amụma nke Gibon gwara m okwu n’ime ụlọ nke Yahweh n’ihu ndị ụkọchukwu na ndị mmadụ niile sị, “Lee ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu, Chineke nke Izrel; emebiela m ọchịchị nchịgbu nke eze Babịlọn.

N’ime afọ abụọ ugbu a, aga m eweghachite azụ n’ebe a, ngwongwo niile nke dị n’ụlọ nke Chineke nke Nebukadneza eze Babịlọn si n’ebe a buru buga na Babịlọn.

Aga m akpọghachikwa azụ n’ebe a Jekonaya nwa Jehoyakim eze nke Juda, ya na ndị soro ya gbaa ọsọ agha site na Juda, ọ bụ Yahweh na-ekwu, maka na-aga m emebi ọchịchị nchịgbu nke eze Babịlọn.”

Mgbe ahụ onye amụma Jeremaya wee gwa onye amụma Hananaya okwu n’ihu ndị ụkọchukwu na ndị mmadụ niile ndị nọ n’ime ụlọnsọ nke Yahweh.

Onye amụma Jeremaya ekwuo sị, “Amen! Ka Yahweh mee nke a, ka o mejupụta ihe ndị a i buru n’amụma ma weghachi azụ n’ebe a, site na Babịlọn, ngwongwo niile nke ụlọ nke Chineke ya na ndị niile a kpụụrụ n’agha.

Ma ugbu a nụrụ okwu a nke m na-agwa gị, nke m na-agwakwa mmadụ niile. Ọtụtụ ndị amụma bu anyị ụzọ site na mgbe ochie buru amụma maka agha, ọnwụ na ọrịa ọgwụrụmba megide ọtụtụ mba ya na ọtụtụ alaeze.

Gbasara onye amụma nke na-ebu amụma udo, a ga-amata na ọ bụ Yahweh zitere ya n’eziokwu mgbe e mejupụtara ihe o buru n’amụma.” Otu ihu ahụ, onye amụma Hananaya weere ịyagba ahụ Jeremaya nya n’olu, dobie ya.

Hananaya ekwuo okwu n’ihu ndị mmadụ sị, “Lee, ọ bụ Yahweh na-ekwu, otu a ka m ga-esi mebie ọchịchị nchịgbu Nebukadneza n’ebe mba niile dị n’ụwa nọ n’ime afọ abụọ na-abịanụ, ma Jeremaya onye amụma jewaara onwe ya.

Ka obere oge gachara mgbe onye amụma Hananaya jiri dọbichaa ịyagba onye amụma Jeremaya nya n’olu, okwu nke Yahweh bịakwutere Jeremaya sị, “Gaa, ma gwa Hananaya sị, ‘Lee, ọ bụ Yahweh na-ekwu, ị kụjiela mgbaolu nke osisi, mana mụ onwe m ga-eji mkpọ nke igwe dochie n’ọnọdụ ya.’

Otu a ka Yahweh nke igwe ndịagha, Chineke nke Izrel siri kwuo: Etinyela m n’olu mba ndị a niile, mgbaolu igwe nke ọchịchị nchịgbu ga-esite n’aka Nebukadneza eze nke Babịlọn, ha ga-efe ya, n’ihina enyela m ya ọbụladị ụmụ anụọhịa.”

Onye amụma Jeremaya gwara Hananaya onye amụma sị, “Gee ntị gị bụ Hananaya, ọ bụghị Chineke zitere gị, ma i meela ka ndị mmadụ kwenye n’ozi asị. Ya mere, ọ bụ Yahweh na ekwu, ‘Ugbu a aga m ewepụ gị n’elu ụwa.

N’ime afọ a, ị ga-anwụ, n’ihina i kwuola okwu megidere Yahweh.” N’ime afọ ahụ, n’ọnwa nke asaa, onye amụma Hananaya anwụọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:29, 43, 79, 80, 95, 102

Azịza: Onyenweanyị kuziere m iso ụzọ gị

1. Ekwela ka m soro ụzọ na-akwụghị ọtọ,

ma nye m amara nke iwu gị.

Azịza: Onyenweanyị kuziere m iso ụzọ gị

2. Anapụla m eziokwu gị,

n’ihina nchekwube m dị n’iwu gị.

Azịza: Onyenweanyị kuziere m iso ụzọ gị

3. Ka ndị niile na-atụrụ gị egwu bịakwute m,

ndị niile maara iwu gị.

Azịza: Onyenweanyị kuziere m iso ụzọ gị

4. Ka obi m ghara inwe ntụpọ ọbụla n’idobe iwu gị,

Ka ihere ghara ime m.

Azịza: Onyenweanyị kuziere m iso ụzọ gị

5. Ndị ajọ mmadụ nọ na-eche ka ha gbuo m,

Mana ana m achịgharị iwu gị n’obi m.

Azịza: Onyenweanyị kuziere m iso ụzọ gị

6. Anaghị m agbakụta iwu gị azụ,

n’ihina gị onwe gị kuziere m ya!

Azịza: Onyenweanyị kuziere m iso ụzọ gị

MBEKU – Matiu 4:4

Alleluia, Alleluia

Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.

Alleluia.

OZIỌMA – 14:13-21

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe Jesu nụrụ nke a o jiri ụgbọmmiri si n’ebe ahụ pụọ, gaa ebe dara Jụụ, nọrọ naanị ya. Ma mgbe igwe mmadụ dị icheiche nụrụ ya, ha siri obodo dị icheiche were ụkwụala sobe ya.

Ka ọ pụtara n’elu ala, ọ hụrụ oke igwe mmadụ, o meere ha ebere ma gwọkwaa ndị ahụ na-adịghị ike nọ n’etiti ha.

N’oge mgbede, ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya sị, “Ebe a bụ ọzara, oge agakwaala; zipụ igwe mmadụ ndị a ka ha jee n’ime obodo dị icheiche zụrụ nri ha ga-eri.”

Jesu zara ha sị, Ọ dịghị mkpa ka ha si ebe a pụọ, kama nyenụ ha ihe ka ha rie.” Ha zara ya sị, “Ihe anyị nwere bụ naanị ogbe achịcha ise na mkpụrụ azụ abụọ.”

Jesu wee sị ha, “Wetaranụ m ha n’ebe a.” O nyere iwu ka ha nọdụ ala n’elu ahịhịa. O were ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ, leelite anya elu, gọzie ha, nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya achịcha ahụ, ha wee keere ha igwe mmadụ ndị ahụ.

Ha niile rijuru afọ. Ha kpokọtara iberibe achịcha fọdụrụnụ, nkata iri na abụọ. Ndị riri achịcha ahụ dị puku mmadụ ise, ma e wezuga ụmụnwaanyị na ụmụntakịrị.

Igbo Mass Readings for August 4 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for August 3 2026, Mọnde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.