Igbo Mass Readings for June 30 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 30 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:16-33
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Site ebe ahụ ụmụnwoke ndị ahụ zọpụrụ njem bịarute ebe obodo Sodọm pụtara ihe ile anya, Abraham sokwa ha na-egosi ha ụzọ.
N’oge ahụ Yahweh na-atụgharị n’echiechi ya sị, “Aga m ezonarị Abraham ihe a m gaje ime, ebe ọ bụ na Abraham ga-abụ otu nnukwu mba siri ike nke mba niile nọ n’elu ụwa ga-esi na ya enweta ngọzi?
N’ihina ahọpụtala m ya ka o duzie ụmụ ya ndị nwoke na ezinụụlọ ya, ndị ga-esochi ya ka ha dobe ụzọ nke Yahweh site n’ibi ndụ eziomume na ịkwụwa aka ọtọ.
Otu a ka Yahweh ga-eji mejupụta ihe o kwere Abraham na nkwa”. Yahweh wee sị, “Mkpu a na-eti gbasara Sodọm na Gomora dị ukwuu, njọ ha dịkwa ukwuu n’otu aka ahụ.
Aga m aga n’onwe m ka m mara ma omume ha ọ jọrọ njọ dịka mkpu a banyere ha si ru m ntị; ọ bụrụ na ọ dịghị otu ahụ, aga m ama”. Ụmụnwoke ndị ahụ hapụrụ ebe ahụ gaba Sodọm, ebe Abraham nọgidere n’ihu Yahweh.
Abraham gatụrụ n’ihu ya sị, “Ị ga-emebikodo ndị eziomume na ndị ajọomume ọnụ n’ezie? Ọ bụrụ na e nwere ndị eziomume iri mmadụ ise n’ime obodo ahụ. Ị ga emebi ya n’ezie?
Ọ bụ na ị gaghị azọpụta obodo ahụ n’ihi iri mmadụ ise ndị eziomume ahụ nọ n’ime ya? Echekwala ime ihe dị otu a: igbusị ndị eziomume na ndị ajọomume nke bụ ịkpaso ndị eziomume na ndị ajọomume otu agwa! Echekwala ihe dị otu a!
Ọ bụ na onye ọkaikpe nke ụwa niile agaghị enye ikpe nkwụmọtọ?” Yahweh zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ ise ndị eziomume n’obodo Sodọm, aga m ahapụ imebi obodo ahụ niile maka ihi ha”.
Abraham kwulitere ma sị, “Ọ bụ ịwa anya ka m ji agwa Onyenwe m okwu otu a, mụ, onye bụ aja na ntụ! Ọ bụrụkwanụ na e nweta ndị eziomume iri mmadụ anọ na ise, Ị ka ga-emebi obodo ahụ niile?”
Ọ zara sị, “Mba, agaghị m emebi ya ma ọ bụrụ na m chọta iri mmadụ anọ na ise ndị eziomume n’ime ya”. Abraham gbara isi akwara sị, “A sịkwanụ na e nweta iri mmadụ anọ n’ebe ahụ?
Ọ zara ya, “Agaghị m emebi ya, n’ihi iri mmadụ anọ ndị eziomume ahụ” Abraham sịrị, “Enwere m ntụkwasịobi na Onyenwe m agaghị ewe iwe, ma nye m ohere ka m kwuo ọzọ: Ọ bụrụkwanụ sọọsọ iri mmadụ atọ ka a ga-ahụ ebe ahụ?”
Ọ zara ya, “Agaghị m emebi ya, ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ atọ ebe ahụ”. Ọ sịkwa, “Ọ bụ ịwa anya n’ebe m nọ ịgwa Onyenwe m okwu otu a, e leghị anya a ga-enweta sọọsọ iri mmadụ abụọ?”
Ọ zakwara sị, “Agaghị m emebi ya, n’ihi iri mmadụ abụọ ahụ”. Ọ sịkwa, “Enwere m ntụkwasịobi na Onyenwe m agaghị ewe iwe ọ bụrụ na m ekwuo otu okwu ọzọ!
Ọ bụrụkwanụ naanị mmadụ iri”. Ọ zara sị, Agaghị m emebi ya n’ihi mmadụ iri ahụ”. Oge ọ gwachara Abraham okwu, Yahweh pụwara, ma Abraham laghachiri n’ụlọ ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 103:1-2, 3-4, 8-9, 10-11.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
1. Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,
gọzie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m!
Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,
echezọkwla obi ebere ya niile.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
2. Nke o ji gbaghara njọ gị niile,
ma gwọọ ọrịa gị niile,
nke o ji si n’olulu zọpụta ndụ gị
nke o ji were ịhụnaanya na obi ebere kpube gị okpueze.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
3. Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya,
ọ naghị ewe iwe ngwa ngwa, ịhụnaanya ya dị ukwuu,
iwe ya anaghị adị ebeebe,
ịkpọ asị ya na-adị sọ nwa ntịntị oge.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
4. Ọ naghị emeso anyị dị ka njọ anyị si dị,
ọ naghị ata anyị ahụhụ dịka amamikpe anyị si dị.
Dịka eluigwe siri dị elu n’ebe ụwa dị,
otu ahụ ka ịhụnaanya ya siri dị ukwuu
n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
MBEKU – Ps. 95:8
Alleluia, Alleluịa:
Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 8:18-22
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe Jesu hụrụ na oke igwe mmadụ gbara ya gburugburu, Ọ gwara ha sị, “Ka anyị gafeenụ n’akụkụ nke ọzọ”.
Ma otu onye odeakwụkwọ bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị ebe ọbụla ị na-aga”. Jesu zara ya sị, “Ufu nwere ọnụ ebe ha na-ebi, ụmụnnụnụ nwekwara akwụ ha, ma nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ na-edobe isi ya”.
Otu onye ọzọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwara ya sị, “Onyenweanyị ka m buru ụzọ gaa lie nna m”. Ma Jesu zara ya sị: “Sobe m, hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie onwe ha”.
Igbo Mass Readings for July 1 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for June 30 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.