Igbo Mass Readings for July 1 2030, Mọnde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 1 2030, Mọnde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:6-10, 13-16
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Amọs
Yahweh na-ekwu nke a: “maka mmehie nke ugboro atọ na nke anọ nke Izrel, emeela m iwu m na-agaghị m ahapụ ịta ha ahụhụ maka na ha erefuela onye eziomume n’ihi ego ọlaọcha na-erefukwa ụmụogbenye n’ọnụ ahịa akpụkpọ ụkwụ abụọ, ha na-echi ụmụogbenye ndị enweghị ndị enyemaka ọnụ n’ala na-anapụkwa ndị a na-emegbu emegbu oke ruuru ha, nna na nwa ya na-akwasa otu nwaagbọghọ iko, ha wee site otu a na-emetọ aha nsọ m.
Ha na-eyi akwa e ji gbara ha ibe na-edina n’akụkụ ekwuaja niile ma nọrọkwa n’ụlọnsọ Chi ha na-añụ mmanya ha jiri ego ha ritere na nha zụọ.
Ma ọ bụ m bụ onye mebiri ndị Amọ mgbe ha busoro ha agha, ndị toro ogologo dịka osisi dida ma dịkwa ike dịka osisi Ook, Ọ bụ m lara ha n’iyi bido na mkpụrụ ha ruo na mgbọrọgwu ha.
Ọzọkwa ọ bụ m kpọpụtara ụnụ n’ala ljipt duo ụnụ iri afọ anọ n’ọzara ka ụnụ gaa nọchie n’ala ndị Amọ. Lee, aga m abịada ụnụ ala n’ọnọdụ ụnụ otu ụgbọ anụ si alọda ala ma e bujuo ya ibu.
Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị ike ọsọ, onye gbasiri ike agaghị adịkwa ike ọzọ, onye ike ọgụ agaghị enwe ike ịzọpụta onwe ya.
Onye ọgba ụta agaghị enwe ike imelikwa ihe ọbụla, onye dị ike ọsọ agaghị enwe ike ịzọpụta onwe ya ọ bụladị onye nọ n’elu ịnyịnya enweghị ike ịzọpụta ndụ ya.
N’ụbọchị ahụ onye sikarịchara ike n’ime ndị bụ dike n’agha ga-atụfu ngwaọgụ ya gbara ọtọ gbafuo,” Ọ bụ Yahweh na-ekwu.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 50: 16-17,18-19, 20-21, 22-23
Azịza: Cheenụ echiche banyere ihe ndị a, ụnụ ndị na-echefu Chineke.
1. Kedụ ikikere ụnụ nwere iji na-agụgharị iwu m
iji na-ekwupụta maka ọgbụgbandụ m?
N’ihina ụnụ jụrụ ị nabata nkuzi m.
ma leghara okwu m anya.
Azịza: Cheenụ echiche banyere ihe ndị a, ụnụ ndị na-echefu Chineke.
2. Ụnụ na-emeta ndị ohi enyi.
na-anabatakwa ndị na-akwaiko.
Okwu ụnụ oge niile na-abụ okwu ọjọọ,
Okwu na-esikwa n’ọnụ ụnụ apụta bụ okwu ụgha.
Azịza: Cheenụ echiche banyere ihe ndị a, ụnụ ndị na-echefu Chineke.
3. Ụnụ na-adị nkwadebe ikwutọnwanne ụnụ,
na-ebokwa ya ebubo.
Ụnụ na-eme nke a chee na m ga-agba nkịtị?
Ụnụ chere na m dị ka ụnụ?
Ugbu a aga m abara ụnụ mba,
aga m eme ka o doo ụnụ anya.
Azịza: Cheenụ echiche banyere ihe ndị a, ụnụ ndị na-echefu Chineke.
4. Cheenụ echiche banyere ihe ndị a
ụnụ ndị na-echefu Chineke,
ma ọ bụghị otu a aga m adọkacha ụnụ
ma o nweghịkwa onye ga-azọpụta ụnụ.
Onye ọbụla na-achụnyere m aja ekele na-asọpụrụ m
ma aga m egosi nzọpụta nke Chineke
n’ebe ndị eziomume nọ.
Azịza: Cheenụ echiche banyere ihe ndị a, ụnụ ndị na-echefu Chineke.
MBEKU – Ps. 95:8
Alleluia, Alleluịa:
Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 8:18-22
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe Jesu hụrụ na oke igwe mmadụ gbara ya gburugburu, Ọ gwara ha sị, “Ka anyị gafeenụ n’akụkụ nke ọzọ”. Ma otu onye odeakwụkwọ bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị ebe ọbụla ị na-aga”.
Jesu zara ya sị, “Ufu nwere ọnụ ebe ha na-ebi, ụmụnnụnụ nwekwara akwụ ha, ma nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ na-edobe isi ya”.
Otu onye ọzọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwara ya sị, “Onyenweanyị ka m buru ụzọ gaa lie nna m”. Ma Jesu zara ya sị: “Sobe m, hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie onwe ha”.
Igbo Mass Readings for July 2 2030, Tuzde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for July 1 2030, Mọnde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.