Igbo Mass Readings for July 14 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 14 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:8-14, 22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
N’oge ahụ, otu eze nke na amaghị Josef bidoro chịwa ala ljipt. Eze a gwara ndị nke ya sị: “Leenụ, ndị Izrel akarịala anyị; ma n’ọnụọgụgụ ma n’ịgbasiike.
Ngwanụ ka anyị kpachapụ anya ma were mmegbu sobe ha, ma ọ bụghị ya, ha si otu a na-abawanye, ọ bụrụ na ndịiro anyị ebuso anyị agha, ha ga-adọnyere ha ukwu lụso anyị ọgụ iji wee si n’ala anyị gbalaga”.
Nke a mere ndị ljipt jiri kpọta ndị nlekọta ọrụ bụ ndị nọgidere ụmụ Izrel na-enye ha ọrụ kariri ha akarị; ụmụ Izrel wee si otu a rụọrọ Fero obodo Pitom na Raamses bụgasị ọba ebe ọ na-echedo ihe.
Ma ka e si na-emegbu ụmụ Izrel, otu aka ahụ ka ha ji na-aga n’ihu na abawanye n’ọnụọgụgụ ma na-agbasakwa n’ala ljipt niile.
Nke a mere na egwu ụmụ Izrel bịara tụwa ndị ljipt karịa, ha wee mee ka ụmụ Izrel tawa ahụhụ n’ọrụ ha karịa, ma mekwaa ka ndụ ha jupụta n’oke ihe uru site n’ọrụ iji mgba na ụrọ kpụọ ma na-ebugharịkwa aja e ji arụ ụlọ, na sitekwa n’ịrụ ọrụ ubi dị icheiche.
N’ọrụ ndị a niile, e mere ka ha na-ata oke ahụhụ. Mgbe ahụ ka Fero jikwara kpọkọọ ndị obodo ya sị ha, Ụnụ ga na-atụnyezi nwata nwoke onye Hibru ọbụla mụrụ ọhụrụ n’ime osimiri Nail, ma ọ bụrụ nwaanyị, a ga-ahapụ ya ka ọ dịrị ndụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 124:1-3, 4-6, 7-8
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị
1. A sị na Chineke anọnyeereghị anyị, Ka Izrel kwuo sị,
A sị na Chineke anọnyeereghị anyị,
mgbe ha lụsoro anyị ọgụ,
ha gaara elo anyị na ndụ, mụọ anyị ọkụ,
mgbe iwe were ha.
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị
2. Ide mmiri gaara eri anyị,
ebili mmiri gaara ekpudo anyị,
mmiri ahụ na-ekwo gaara eri anyị.
Ngọzi dịrị Onyenweanyị,
onye nke ekweghị ka ndịiro anyị laa anyị n’iyi!
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị
3. Anyị gbanarịrị ọnya ndịiro anyị kwere
dịka nnụnụ si agbapụ n’ọnya dịnta,
ọ gbajiri ọnya ha,
anyị wee nwee ike gbalaga.
Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị,
onye kere eluigwe na ala.
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị
MBEKU – 1 Thes 2:13
Alleluia, Alleluia:
Mgbe ụnụ nụrụ okwu Chineke nke anyị wetaara ụnụ, ụnụ naara ya, ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe ọ bụ n’onwe ya, okwu nke Chineke.
Alleluia.
OZIỌMA – 10:34-11:1
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị ụmụazụ ya iri na abụọ sị, Ụnụ echela na abịara m iweta udo n’elu ụwa, abịaghị m iweta udo kama mmaagha.
N’ihina abịara m ime ka nwa nwoke megide nna ya, nwa nwaanyị megide nne ya, ka nwunye nwa megide nne dị ya. Ndị iro mmadụ ga-abụkwa ndị ezinụụlọ ya.
Onye ọbụla na-ahụ nna mọbụ nne ya n’anya karịa m, etosịghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. Onye ọbụla na-ahụ nwa ya nwoke mọbụ nwa ya nwaanyị n’anya karịa m, etosịghị ịbụ onye na-eso ụzọ m; ọzọkwa, onye ọbụla na-eburughị obe ya so m n’azụ etosịghị m.
Onye ọbụla na-achọ ndụ ya ga-atụfu ya, ma onye ọbụla tụfuru ndụ ya n’ihi m ga-achọta ya. “Onye nabatara ụnụ nabatara m, onye nabatara m nabatara onye ahụ nke zitere m.
Onye ọbụla nabatara onye amụma n’ihina ọ bụ onye amụma, ga-anata ụgwọ ọrụ nke onye amụma. Onye ọbụla nabatara onye eziomume n’ihina ọ bụ onye eziomume ga-anata ụgwọ ọrụ nke onye eziomume.
Ọzọkwa, onye ọbụla nke ga-ekunye otu n’ime ndị a na-eso ụzọ m ọ bụladị otu iko mmiri ọñụñụ n’ihina ọ bụ onye na-eso ụzọ m, aghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.
Mgbe Jesu kuzichaara ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị a. O siri n’ebe ahụ pụọ jee ikuzi nkuzi n’ekwusa okwu Chineke n’obodo niile dị ebe ahụ.
Igbo Mass Readings for July 15 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for July 14 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.