Igbo Mass Readings for July 21 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 21 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 14:5-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ

Mgbe a gwara eze ndị ljipt na ụmụ Izrel agbaala ọsọ, obi Fero na ụmụazụ ya gbanworo n’ebe ha nọ, ha ekwuo sị, “Gịnị ka anyị mere nke a, nke na anyị ahapụla ụmụ Izrel ndị na-agbara anyị odibo ka ha lawa?”

O wee kwado ịnyịnya agha, kpọrọkwa ndị ọchịagha ya, ọ kpọọrọ narị ịnyịnya agha isii, na ịnyịnya ndịọzọ nke ljipt na ndịisi agha ndị ga-ahụ maka ha. Yahweh kpọchiri obi Fero eze Ijipt, o wee chụsie ụmụ Izrel ike.

Ndị Ijipt chụrụ ndị Izrel, ha na ịnyịnya ha, na ndị ọchịagha na elekọta ha, bịaruo n’ebe ha na-ezu ike n’akụkụ osimiri dị na Pihahirot, n’ihu Baal-zefọn.

Mgbe Fero bịaruru nso, ụmụ Izrel legharịrị anya hụ na ndị ljipt na-abịa ha n’azụ, ha jupụtakwara n’ụjọ wee kpọkuo Yahweh.

Ha gwara Mosis sị, “Ọ bụ na e nweghị ili n’ala ljipt mere i ji kpọpụta n’ime ịkpa ebe a ka anyị nwụfuo? Gịnị bụ ihe a i mere anyị ịkpọpụta anyị n’ala ljipt?

Ọ bụ na anyị agwaghị gị n’ljipt sị, ‘Hapụ anyị ka anyị gbaara ndị Ijipt odibo?’ Ọ gaara akara anyị mma ịgbara ndị Ijipt odibo karịa ịnwụ n’ime ịkpa”.

Ma Mosis gwara ụmụ Izrel sị, “Ụnụ atụla egwu. Kwụsienụ ike, ụnụ ga-ahụ otu Yahweh ga-esi zọpụta ụnụ taa; maka na ndị ljipt a ụnụ na-ahụ taa, ụnụ agaghịkwa ahụ ha ọzọ.

Nọrọnụ jụụ, Yahweh ga-alụrụ ụnụ ọgụ a”. Yahweh gwara Mosis sị, “Gịnị mere i ji akpọku m? Gwa ụmụ Izrel ka ha gaba n’ihu: Welie mkpara gị, ma gbatịa aka gị n’elu osimiri ahụ ka o kewaa abụọ, ka ụmụ Izrel wee gaa n’ala ọkpọrọ n’etiti osimiri.

Aga m akpọchi obi ndị ljipt ka ha chụrụ ha banye n’etiti osimiri ahụ, aga m enweta otito n’ebe Fero, ịnyịnya agha ya, na ndị ọchịagha ya nọ.

Ma mgbe m nwetechara onwe m otito n’isi Fero, ịnyịnya agha ya na ndịagha ya ndị ljipt ga-ama na m bụ Yahweh”.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ex. 15:1-2, 3-4, 5-6.

Azịza: Anyị ga ekwere Yahweh ukwe ọñụ n’ihi mmeri ya dị otito

1. Aga m ekwere Yahweh ukwe ọñụ n’ihi mmeri ya dị otito;

o meela ka ịnyịnya agha ndị ọchịagha Fero dakpuo n’osimiri.

Yahweh bụ ike m na ukwe m,

bụrụkwa onye nzọpụta m.

Ọ bụ Chineke m, aga m eto aha ya,

Chineke nke nnanna anyị ha, aga m ebuli aha ya elu.

Azịza: Anyị ga ekwere Yahweh ukwe ọñụ n’ihi mmeri ya dị otito

2. Yahweh bụ dike n’agha,

Yahweh bụ aha ya.

Ịnyịnya agha Fero na ndị otu ya ka ọ tụnyere n’oke osimiri,

ndịisi agha ka ọ tụnyekwara n’osimiri uhie.

Azịza: Anyị ga ekwere Yahweh ukwe ọñụ n’ihi mmeri ya dị otito

3. Osimiri kpuchikwara ha,

ha wee dakpuo n’ala mmiri ka okwute.

Aka nri Gị Yahweh dị ike na ebube,

aka nri gị na-akụrikwa ndịiro gị.

Azịza: Anyị ga ekwere Yahweh ukwe ọñụ n’ihi mmeri ya dị otito

MBEKU – Ps. 119:27

Alleluia, Alleluia:

Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwe ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.

Alleluia.

OZIỌMA – 12:38-42

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii gwara Jesu sị, “Onyenkuzi, anyị chọrọ ka i gosị anyị ihe ịrịbaama”.

Ma ọ zara ha sị, “Ọgbọ jupụtara n’ihe ọjọọ na ịkwaiko na-achọ ihe ịrịbaama, ma o nweghị ihe ịrịbaama a ga-egosị ha karịa nke onye amụma Jona.

N’ihina otu Jona siri nọọ n’afọ azụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị, otu a ka Nwa nke mmadụ ga-anọ n’ime ala ụbọchị atọ, ehihie na abalị.

N’ụbọchị ikpe, ndị obodo Ninive ga-ebili maa ọgbọ a ikpe, n’ihina ha chegharịrị mgbe ha nụrụ okwuchukwu Jona; ma lee, onye karịrị Jona nọ n’ebe a.

N’ụbọchị ikpe, ezemwaanyị nke Sheba ga-ebili maa ọgbọ a ikpe, n’ihina o si ebe dị anya bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma lee, onye ka Solomọn nọ ebe a.

Igbo Mass Readings for July 22 2025, Emume Ncheta Meri Magdalin dị Asọ.

Igbo Mass Readings for July 21 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.