Igbo Mass Readings for July 20 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 20 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:1-4, 6-8

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Micah

Ugbu a nụrụnụ ihe Chineke na-ekwu. Kulienụ, kwuonụ ka m siri megide ụnụ, ka ugwu ukwu nụrụ mkpesa ụnụ, ka ugwu nta niile nụrụkwa ihe ụnụ nwere ikwu.

Geenụ ntị ugwu ukwu niile, n’ihe Chineke nwere ikwu, geenụ ntị ebe ntọala niile nke ụwa n’ihina Chineke nwere okwu megide ndị nke ya. Ya na Izrel ga-arụpụtakwa n’ụka. Ndị nke m, gịnị ka m mere ụnụ?

Kedụ ụzọ m siri mee ka ike m gwụ ụnụ? Zaanụ m. N’ihina akpọpụtara m ụnụ n’ala ljipt, esiri m n’ala ohu ahụ gbapụta ụnụ, eziteere m ụnụ Mosis, Erọn na Miriam ka ha bụrụ ndị ndu ụnụ.

Kedụ ihe m ga-eji bịa n’ihu Chineke, were hulata ala n’ihu Chineke onye kacha elu? Aga m eji aja nsureọkụ ka ọ bụ nwa ehi gbara otu afọ?

Ọ ga-amasị ya ịnara ebube dị nnụkwurunnụ ka ọ bụ uju mmanụ na asọpụta ka iyi? Aga m ejiri ọkpara m chụọ aja maka njọ m mere, nwa nke afọ m maka mmehie m?

A gwala gị rịị ihe bụ ezi ihe nakwa ihe Chineke chọrọ n’aka gị. Ọ bụ naanị nke a. Ime ihe ziri ezi, ị hụ irubeisi n’anya, ya na iji umeala na-eso Chineke.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 50:5-6, 8-9, 16-17, 21, 23

Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.

1. Kpọkọtaranụ m ndị nke m kwere ekwe,

ndị mụ na ha gbara ndụ site n’aja ha chụrụ!

Ka eluigwe niile kwupụta eziomume ya;

Mgbe Chineke n’onwe ya bụ onye ọkaikpe.

Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.

2. Ọ bụghị n’ihi aja ụnụ ka m ji wee na-abara ụnụ mba

aja nsureọkụ ụnụ nọ n’ihu m oge niile;

agaghị m anabata oke ehi ọbụla nke si n’ụlọ ụnụ,

mọbụ ewu ọbụla nke si n’ụlọanụ ụnụ.

Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.

3. Kedụ ikikere ụnụ nwere iji na-agụgharị iwu m,

iji na-ekwupụta maka ọgbụgbandụ m?

N’ihina ụnụ jụrụ ịnabata nkuzi m,

ma leghara okwu m anya.

Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.

4. Ụnụ na-eme nke a chee na m ga-agba nkịtị?

Ụnụ chere na m dịka ụnụ?

Ugbu a aga m abara ụnụ mba, aga m eme ka o doo ụnụ anya.

Onye ọbụla na-achụnyere m aja ekele na asọpụrụ m,

ma aga m egosi nzọpụta nke Chineke

n’ebe ndị eziomume nọ.

Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.

MBEKU – Ps. 119:27

Alleluia, Alleluia:

Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwe ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.

Alleluia.

OZIỌMA – 12:38-42

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii gwara Jesu sị, “Onyenkuzi, anyị chọrọ ka i gosị anyị ihe ịrịbaama”.

Ma ọ zara ha sị, “Ọgbọ jupụtara n’ihe ọjọọ na ịkwaiko na-achọ ihe ịrịbaama, ma o nweghị ihe ịrịbaama a ga-egosị ha karịa nke onye amụma Jona.

N’ihina otu Jona siri nọọ n’afọ azụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị, otu a ka Nwa nke mmadụ ga-anọ n’ime ala ụbọchị atọ, ehihie na abalị.

N’ụbọchị ikpe, ndị obodo Ninive ga-ebili maa ọgbọ a ikpe, n’ihina ha chegharịrị mgbe ha nụrụ okwuchukwu Jona; ma lee, onye karịrị Jona nọ n’ebe a.

N’ụbọchị ikpe, ezemwaanyị nke Sheba ga-ebili maa ọgbọ a ikpe, n’ihina o si ebe dị anya bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma lee, onye ka Solomọn nọ ebe a.

Igbo Mass Readings for July 21 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for July 20 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.