Igbo Mass Readings for August 14 2028, Mọnde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 14 2028, Mọnde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:2-5,24-28

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel

N’ụbọchị nke ise n’ọnwa ahụ, (ọ bụ n’afo nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoyakim jee mba ọzọ) Okwu nke Yahweh bịakwutere Izikel onye ụkọchukwu nwa Buzi, n’ala nke ndị Kaldia, n’akụkụ mmiri Keba; ebe ahụ ka Yahweh kpọrọ ya.

Ka m na-ele anya oke ufufe si na mgbago ugwu bịa, ahụkwara m igwe ojii na ihe na-egbuke egbuke nke ukwu gbara m gburugburu, ọkụ si n’ime ya na-achawapụta, n’etiti ọkụ ahụ e nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke. N’etiti ya ahụrụ m ihe anọ e kere eke dị ndụ.

Otu a ka ha dị ha; dịka mmadụ. Mgbe ha gagharịrị anụrụ m ụda nku ha dịka nke ebili mmiri, dịkwa ka ụda egbeigwe nke onye ji ike niile, dịkwa ka mkpọtụ nke igweagha, mgbe ha kwụsịrị, ha chịturu nku ha.

Ma a ka nwere mkpọtụ si n’igwe na-abịa n’elu isi ha, mgbe ha kwụsịrị ma chịtuo nku ha. N’elu mbara igwe ahụ dị n’elu isi ha; e nwere ihe dịka ocheeze, nke dịka nkume a na-akpọ Safire. N’elu ihe a dịka ocheeze, e nwere ihe dịka mmadụ.

Site n’ebe dịka ụkwụ ya gbagowe elu, ahụrụ m ihe dịịka ọlaọkụ na egbuke egbuke dịka ọkụ e kpuchiri gburugburu; site n’ebe dịka ukwu ya gbadawa, ahụrụ m ihe dịka ọkụ nke na-egbuke egbuke n’akụkụ ya niile.

lhe ahụ na-egbuke egbuke nke gbara ya gburugburu dịka egwurugwu nke pụtara n’igwe ojii n’ụbọchị mmiri na-ezo. Otu ahụ ka ebube nke Yahweh na-adị. Mgbe m hụrụ ya akpọrọ m isi ala, anụrụ m olu na-ekwu okwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 148:1-2, 11-12, 13,14

Azịza: Eluigwe na ụwa jupụtara n’ebube gị

1. Si n’eluigwe too Onyenweanyị,

toonụ ya n’ebe kacha elu

Toonụ ya ndị mmụọozi ya niile,

toonụ ya igwe ndịagha ya niile.

Azịza: Eluigwe na ụwa jupụtara n’ebube gị

2. Ndịeze niile nọ n’ụwa na mba niile;

ụmụ ndịeze niile na ndị ọchịchị nọ n’ime ụwa

Ụmụokorobịa na ụmụ agbọghọbịa,

ndị okenye nakwa ụmụ ntakịrị.

Azịza: Eluigwe na ụwa jupụtara n’ebube gị

3. Ka ha niile too aha Onyenweanyị,

n’ihina sọọsọ aha ya dị omimi,

ebube ya kariri eluigwe na ụwa.

Azịza: Eluigwe na ụwa jupụtara n’ebube gị

4. Ọ na-ewelite ike nke ndị nke ya

maka otito ndị ya dị nsọ,

nke ụmụ Izrel bụ ndị ọ hụrụ n’anya.

Azịza: Eluigwe na ụwa jupụtara n’ebube gị

MBEKU – 2 Thes 2:14

Alleluia, Alleluia:

Site n’oziọma anyị, Chineke kpọrọ ụnụ ka ụnụ wee nweta otito nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

Alleluia.

OZIỌMA – 17:22-27

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ma mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jesu gwara ha sị, “A ga-aranye Nwa nke mmadụ n’aka ndị mmadụ. Ha ga-egbu ya, ma n’ụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie.”

Nke a wutere ha nke ukwuu. Oge ha rutere na Kapanaum, ndị ọnaụtụ ọkara Shekel gakwuuru Pita jụọ ya sị “Ọ bụ na Nna ụnụ ukwu anaghị atụ ụtụ ụlọnsọ?”

Pita zara ya sị “Ọ na-atụ.” Mgbe Pita batara n’ụlọ, Jesu buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka I chere, Saịmọn? Ole ndị ka ndịeze nke ụwa a na-ana ụtụ ahịa mọbụ ụtụ isi?

Ọ bụ ụmụ ha ka ọ bụ ndị ọbịa?” Mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ ndị ọbịa.” Jesu sịrị ya, “Ọ dị mma, iwu a ejighị ndị bụ ụmụ.

Ma ka anyị ghara ịkpasu ha iwe, gaa n’osimiri tụnye nkoazụ gị; were azụ nke ọbụla buru ụzọ banye na nko gị. Mgbe I meghere ọnụ azụ ahụ Ị ga ahụ otu Shekel, were ya nye ha maka mụ na gị.”

Igbo Mass Readings for August 15 2028, Emume Mbugoro N’Eluigwe nke Marịa dị Ngọzi

Igbo Mass Readings for August 14 2028, Mọnde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.