Igbo Mass Readings for February 9 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 9 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:1-7, 9-13

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ndịeze nke mbụ

Solomọn kpọkọtara ndị okenye ụmụ Izrel niile na ndịisi agbụrụ niile, na ndị ndu ogbe niile nke Izrel na Jerusalem ka ha bute ihe Igbe ọgbụgbandụ nke Yahweh site n’obodo Devid bụ Zayọn.

Ụmụnwoke niile nke Izrel gbakọtara n’ihu Solomọn na mmemme nke a na-eme n’ọnwa Etanim nke bụ ọnwa nke asaa. Ndị okenye niile nke Izrel bịara, ndị Ụkọchukwu buuru Igbe ọgbụgbandụ.

Ha butere Igbe ọgbụgbandụ nke Yahweh n’ụlọ nzukọ na ite nsọ niile ndị dị n’ụlọnzukọ ahụ, ndị ụkọchukwu na ndị Levaị butere ha.

Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile nọ n’ihu Igbe ahụ, were igwe atụrụ na ehi karịrị ịgụta ọnụ na-achụ aja. Ndị Ụkọchukwu butere Igbe ọgbụgbaandụ nke Yahweh n’ebe ọnọdụ ya n’ebe kachasị nsọ nke ụlọnsọ n’okpuru nku cherubim.

N’ihi cherubim gbasapụrụ nku ha n’ebe igbe dị, nke a meree na nku ha kpuchiri igbe ahụ na osisi ya. O nweghị ihe dị n’ime igbe ahụ karịa ibe okwute abụọ nke Mosis dobere ebe ahụ na Horeb, ebe Chineke na ụmụ Izrel gbara ndụ mgbe ha si n’ljipt pụta.

Mgbe ndị ụkọchukwu si n’ebe nsọ ahụ pụta urukpu jupụtara n’ime ụlọ nke Yahweh, nke mere na ndị ụkọchukwu enweghị ike ịnọdụ chụọ aja n’ihi urukpu ahụ; maka na ebube nke Yahweh jupụtara n’ụlọnsọ nke Chineke.

Solomọn wee kwuo sị, “Osebụrụwa emeela ka anyanwụ dị n’eluigwe, ma kwuo na ya ga-ebi n’oke ọchịchịrị. Arụọlara m gị ụlọ dị elu, ka ọ bụrụ ebe obibi gị ebeebe.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 132: 6-7, 8-10

Azịza: Bilie, Onyenweanyị gaa n’ebe ezumike gị

1. Lee, anyị nụrụ maka ya n’obodo Efrata,

anyị hụrụ ya n’obosara ala nke Yiarim.

Ka anyị gaa n’ụlọ obibi ya

wee kpọọ isi ala nye ya n’ihu ocheeze ya!

Azịza: Bilie, Onyenweanyị gaa n’ebe ezumike gị

2. Bilie O Onyenweanyị gaa n’ebe ezumike gị;

gị na igbe ọgbụgbandụ nke ike gị.

ka ndị ụkọchukwu gị yiri eziomume dịka uwe,

ka ndị nsọ gị tikwaa mkpu añụrị.

N’ihi nwodibo gị bụ Devid,

a chụpụla onye nke gị i tere mmanụ.

Azịza: Bilie, Onyenweanyị gaa n’ebe ezumike gị

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Jerusalem, toonụ Onyenweanyị: okwu ya na-agazu ụwa niile ọsọọsọ.

Alleluia.

OZIỌMA – 6:53-56

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Mgbe ha kwọfechara n’ofe nke ọzọ, Jesu na ndị na-eso ụzọ ya rutere n’ọnụ mmiri Genesaret ebe ha kedoro ụgbọ ha. Mgbe ha si n’ụgbọ rịdata, otu ihu ahụ ndị mmadụ matara Jesu.

Ha we gbagharịa n’ala ahụ niile, na-ebutere ya n’ute ndị ahụ na-adịghị, ebe ọbụla ha nụrụ na ọ nọ. Ebe ọbụla ọ bịara n’obodo nta, obodo ukwu, mọbụ n’ala ubi, ndị mmadụ na-ebupụtara ya ndị ọrịa tọgbọ ha n’ọmaahịa ma rịọ Jesu ka ha metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka. Ndị niile metụrụ ọnụ uwe ya aka ka e mere ka ahụ dị mma.

Igbo Mass Readings for February 10 2026, Tuzde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 9 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.