Igbo Mass Readings for February 17 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 17 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-15, 25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Nwoke ahụ na nwunye ya bụ Eve nwere mmekọ, nwunye ahụ abịa dị ime mụọ Ken sị: “Amụtala m nwanwoke site n’enyemaka Yahweh”. Ọ bịa mụọ nwa nke abụọ, Ebel, nwanne nwoke Ken. Ugbu a Ebel bụ onyencheatụrụ, na-azụ igwe atụrụ ya, ebe Ken bụ onyeọrụugbo.
Ka ihe na-aga, Ken wetara ụfọdụ ihe oriri ndị si n’ubi ya wee chụnyere Yahweh aja, ebe Ebel n’ụzọ nke ya sitere n’igwe ewu na atụrụ ya weta otu atụrụ e bu ụzọ mụọ, nke gbara abụba, iji nye onyinye nke ya. Yahweh nabatara onyinye Ebel.
Ma ọ nabataghị onyinye Ken. N’ihi nke a ọnụma jupụtara ya obi, ihu ya wee gbarụọ. Yahweh ajụọ Ken sị, “Gịnị mere i ji jupụta n’iwe, kedu ihe i ji agbarụ ihu? Ọ bụ na a gaghị anabata gị ma ị na-eme ihe dị mma?
Ọ bụrụkwanụ na ị jụ irubeisi, lezie anya n’ihina i nwere ike ịdaba na njọ, ma i nwere ike imeri njọ ahụ” Ken agwa nwanne ya nwoke Ebel sị, “Ka anyị pụọ jee n’ọhịa”. Ka ha nọ n’ime ọhịa, Ken abagide nwanne ya nwoke Ebel gbuo ya. Yahweh ajụọ Ken sị, “o lee ebe nwanne gị nwoke Ebel nọ?”.
Ọ zaa ya sị, “Amaghị m; abụ m onye nche nwanne m?”. Yahweh ajụọ ya sị, “Olee ihe nke a i mere? Gee ntị, olu akwa nwanne gị nwoke i gburu esila n’ala ruo m ntị. Site ugbu a gaba n’ihu, ị bụrụla onye a bụrụ ọnụ site n’ala i jiri ọbara nwanne gị merụọ.
Mgbe ọbụla ị kọrọ ugbo ọ gaghị erutere gị dịka ike ya niile si dị; Ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abaghị n’ihe n’ụwa”. Ken sịrị Yahewh, “Ntaramahụhụ m kariri oke m nwere ike ibute.
Lee anya, ị chụpụla m n’elu ụwa taa; agaghịkwa m ahụ ihu gị ọzọ, abụzi m onye na-awagharị awagharị na onye na-enweghị ebe obibi n’elu ụwa nke na onye ọbụla hụrụ m ga akụgbu m”.
Yahweh zara ya sị, “Mba! ọ bụrụ na onye ọbụla egbuo Ken, a ga-abọ ya ọbọ okpukpu asaa”. Yahweh nyere Ken akara, ka a ghara inwe onye ọbụla ga-egbu ya.
E mechaa Adam na Eve nwere mmekọ ọzọ mụta nwa nwoke nke ha kpọrọ Seth, n’ihina nwaayị ahụ sịrị, “Chineke enyela m nwa ọzọ ga-anọchi ọnọdụ Ebel, n’ihina Ken kụgburu ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 50:1,8,16-17,20-21.
Azịza: Ka inye ekele gị bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke
1. Onyenweanyị, Chineke nke chi niile na-ekwu,
ọ na-akpọ ụwa niile bido n’ọwụwa anyawụ ruo n’ọdịda ya.
Ọ bụghị n’ihi aja ụnụ ka m ji wee na-abara ụnụ mba,
aja nsureọkụ ụnụ nọ n’ihu m oge niile.
Azịza: Ka inye ekele gị bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke
2. “Kedụ ikikere ụnụ nwere iji na-agụgharị iwu m,
iji na-ekwupụta maka ọgbụgbandụ m?
N’ihina ụnụ jụrụ ịnabata nkuzi m,
ma leghara okwu m anya.
Azịza: Ka inye ekele gị bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke
3. Ụnụ na-adị nkwadebe ikwutọ nwanne ụnụ,
na-ebokwa ya ebubo.
Ụnụ na-eme nke a, chee na m ga-agba nkịtị?
Ụnụ chere na m dịka ụnụ?
Ugbu a aga m abara ụnụ mba,
aga m eme ka o doo ụnụ anya.
Azịza: Ka inye ekele gị bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Naranụ ozi nke a, ọ bụghị dịka okwu mmadụ, kama okwu nke Chineke.
Alleluia.
OZIỌMA – 8:11-13
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere Jesu bido nrụrịtaụka, na-achọkwa ihe ịrịbaama si n’igwe bịa iji nwalee ya. Ọ mara ọsụ ruru na mmụọ, jụkwaa sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbaama?
N’ezie agwa m ụnụ, agaghị enye ọgbọ a ihe ịrịbaama ọbụla. Ọ hapụrụ ha, banyekwa ọzọ n’ụgbọmmiri, gafee n’ofe nke ọzọ.
Igbo Mass Readings for February 18 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for February 17 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.