Igbo Mass Readings for January 13 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 13 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-6
Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
N’oge ochie, Chineke sitere n’ụzọ dị icheiche gwa nna anyị ha okwu site n’ọnụ ndịamụma; n’ọgwụgwụoge ndị a, ọ gwala anyị okwu site na nwa ya, onye Chineke họpụtara ka ọ bụrụ onye nketa nke ihe nile, onye o si na ya kee ụwa.
Ọ na-achawapụta otito nke Chineke na akara nke ụdị ya, site n’ike nke okwu ya ka o ji jide ụwa. Mgbe ọ sachapụchara njọ, ọ nọdụrụ n’aka nri nke onye kacha elu. Ugbu a ọ bụ onye di elu karịa mmụọọma dịka aha o nwetara si karịa nke ha elu.
Olee mmụọọma Chineke gwarala sị, “Ị bụ nwa m, taa amụtara m gị mọbụ, “Aga m abụ nna ya, ya onwe ya ga-abụkwa nwa m.” Ọzọkwa, mgbe o zitere nwa ya n’ụwa, o kwuru sị, “Ka ndị mmụọọma Chineke niile kpọọrọ ya isiala”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 97:1-2 6-7, 9.
Azịza: Tookwanụ aha Onyenweanyị ụnụ ndị eziomume
1. Onyenweanyị bụ eze! Ka ụwa ñụrịba;
Nụrịanụ, ala niile mmiri gbara gburugburu.
O jiri eziomume na ikpe nkwụmọtọ were tọọ ntọala ocheeze ya.
Azịza: Tookwanụ aha Onyenweanyị ụnụ ndị eziomume
2. Eluigwe na-ekwupụta eziomume ya,
mba niile na-ahụkwa otito ya.
chi niile sekpuọrọnụ Onyenweanyị.
Azịza: Tookwanụ aha Onyenweanyị ụnụ ndị eziomume
3. N’ihina ị bụ Onyenweanyị,
onye kachasị elu n’ụwa niile,
onye kachasị chị ndịọzọ elu.
Azịza: Tookwanụ aha Onyenweanyị ụnụ ndị eziomume
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Site n’oziọma anyị, Ọ kpọrọ ụnụ ka ụnụ wee nweta otito nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi.
Alleluia.
OZIỌMA – 1:14-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Ka e jidechara Jọn, Jesu bịara na Galili na-ekwusa oziọma nke Chineke. Wee na-asị, “Oge ezuola. Alaeze Chineke abịala nso, Chegharịa ma kwerenụ n’oziọma”.
Mgbe ọ na-aga n’ụzọ osimiri Galili, ọ hụrụ ndị ọkụazụ abụọ, Saịmọn, na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha na mmiri. Ma Jesụ sịrị ha, “Sobenụ m, aga m eme ụnụ ndị na-akụta mmadụ.”
Ngwangwa, ha hapụrụ ihe niile ha ji egbu azụ sobe ya. Ka ọ gatụrụ n’ihu ntakịrị, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Jemis na Jọn, ụmụ Zebedi ka ha nọ n’ụgbọ, na-edozi ihe ha ji akụ azụ.
Ozigbo ahụ ọ kpọrọ ha; ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị ọrụ ngo ha n’ụgbọ, sobe ya.
Igbo Mass Readings for January 14 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for January 13 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.