Igbo Mass Readings for April 21 2025, Mọnde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 21 2025, Mọnde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:14, 22-32
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi
N’ụbọchị Pentikọst, Pita guzoro, ya na ndịozi iri na otu ahụ welie olu ya gwa ọgbakọ ahụ okwu sị, “Ndị Juu ibe m, na ụnụ niile ndị bi na Jerusalem matanụ nke a! Gekwaanụ m ntị!.
“Ndị Izrel! Geenụ m ntị! Jesu onye Nazaret bụ Nwoke nke Chukwu gosiri ụnụ site n’ọrụ dị ike na ọrụ ebube na ihe ịrịbaama, nke Chukwu rụrụ n’etiti ụnụ site n’aka ya dịka ụnụ ji anya ụnụ hụ.
Jesu a, onye a raara nye dịka Chineke siri n’uche aka ya chepụta, na dịka Chineke siri n’amamihe ya buru ụzọ mazuo, ka ụnụ kpọgidere n’obe, gbukwaa ya, site n’aka ndị na-amaghị iwu anyị.
Chineke mere ka o si n’ọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ya ihe mgbu nke ọnwụ, n’ihi na ọnwụ enweghị ike ijideli ya. Devid na-ekwu maka ya sị, Ahụrụ m Onyenweanyị ka ọ nọ n’ihu m mgbe niile.
N’ihi na ọ nọ n’aka nri m, aga m akwụdosiike. N’ihi nke a mkpụrụobi m ñụrịrị ọñụ, ire m kọkwara akụkọ banyere ọñụ m ọzọkwa, anụahụ ga-ebikwa n’olileanya.
N’ihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m n’ime ala mmụọ, Ị gaghị ekwe onye Nsọ gị ka o ree ure. I meela ka m mata ụzọ na-eduba na ndụ. Ị ga-emekwa ka m jupụta n’ọñụ site na nnọnye nke gị.
Ụmụnna m! O kwesịrị ka m were nkwuwa okwu chetara ụnụ ihe banyere nna nna anyị Devid. Ọ nwụrụ e lie ya, ili ya dịkwa n’etiti anyị ruo ụbọchị taa.
N’ihi na ọ bụ onye amụma, ọ makwaara na Chineke ñụrụ iyi, kwe ya nkwa, na ọ ga-eme otu onye si n’agbụrụ ya pụta ka ọ nọdụ n’oche eze ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 16:1-2, 5, 7-8, 9-10, 11
Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ nchekwube m.
1. Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ ebe mgbaba m.
Agwara m Onyenweanyị sị, “Gịnwa bụ Chineke m,
Iheọma niile m nwere sị n’aka gị bịa.”
Sọ Gị Onyenweanyị bụ ihe m nwere,
Ị na-enyekwa m ihe niile m chọrọ.
Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ nchekwube m.
2. Ana m eto Onyenweanyị bụ onye na-agbaziri m,
n’ime abalị, mmụọ m na-enye m ndụmọdụ;
Ana m eche echiche banyere Onyenweanyị mgbe niile,
n’ebe Ọ nọ n’aka nri m, egwu agaghị atụ m.
Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ nchekwube m.
3. N’ihi nke a mkpụrụobi m nọ n’ọñụ,
mmụọ m na-enwe añụrị,
ahụ m na-ezukwa ike n’enweghị nsogbu ọ bụla.
N’ihi na Ị gaghị agbahapụ mkpụrụobi m n’ala mmụọ,
ma ọ bụ kwe ka onye Ị hụrụ n’anya ree ure.
Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ nchekwube m.
4. Ị ga-akuziri m ụzọ nke ndụ,
Ị ga-enye m añụrị na-enweghị ube n’ihu gị,
n’aka nri gị, aga m enwe añụrị dị ebeebe.
Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ nchekwube m.
MBEKU – Ps. 118:24.
ALLELUIA ALLELUIA:
Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee añụrị, ka obi dị anyị ụtọ na ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 28:8-15.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Ụmụnwaanyị ahụ ewere ọsọ si n’ili pụọ n’ihi egwu na oke ọñụ, gaa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe merenụ. Na mberede Jesu zutere ha n’ụzọ sị ha, “Ekele!”
Ha wee bịa makụọ ya n’ụkwụ abụọ kpọọrọ ya isi ala. Jesu gwara ha sị: “Ụnụ atụla egwu! Gaanụ, kọọrọ ụmụnna m. Gwa ha ka ha gaa Galili, n’ebe ahụ ka ha ga-ahụ m.”
Mgbe ụmụnwaanyị ahụ na-aga, ụfọdụ n’ime ndị agha na-eche ili ahụ nche laghachiri n’ime obodo kọọrọ ndịisi nchụaja ihe niile merenụ. Mgbe ha na ndị okenye zukọrọ gbachaa izu, ha nyere ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego, sị ha: “Ihe a bụ ihe ụnụ ga na-ekwu:
‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara n’abalị zuru ya n’ohi mgbe anyị nọ n’ụra. Ọ bụrụ na nke a eruo Gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma wee wepụ ụnụ na nsogbu.” Ha naara ego ahụ, mee dịka a gwara ha. Akụkọ a ka a gbasara n’etiti ndị Juu ruo taa.
Igbo Mass readings for April 22 2025, Tuzde n’ime Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
Igbo Mass Readings for April 21 2025, Mọnde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.