Igbo Mass Readings for March 2 2026, Mọnde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 2 2026, Mọnde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:4 -10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Daniel
Akpọkuru m Chineke, kwupụta njọ ndị nke m sị,”O Yahweh, Ị bụ Chineke dị ukwu, dịkwa egwu. Ị na-edobe ọgbụbandụ na-egosi ịhụnaanya n’ebe ndị hụrụ gị n’anya, na-edobekwa iwu gị nọ.
Anyị emeela njọ, gahie ụzọ ma nupụkwara gị isi, anyị jụrụ idobe iwu gị na iso nkuzi gị. Anyị egeghị ndị amụma gị ntị, ndị gwara ndị eze anyị, na ndị isi ọchịchị anyị na ndị Nnanna anyị ha na ndị mmadụ niile nke obodo a okwu n’aha gị.
Ikpe nkwụmọtọ bụ nke gị. Onyenweanyị, ma ihere bụ nke anyị, anyị bụ ndị Juda ndị bi na Jerusalem na Izrel niile, ma ndị nọ nso ma ndị nọ ebe tere aka, ebe ị chụgara ha n’ihi ajọ omume anyị.
Ihere bụ nke anyị na nke ndị eze anyị, ndị isi ọchịchị anyị na nke ndị nnanna anyị ha, maka na anyị emela njọ megide gị. N’aka gị ka mgbaghara na ebere dị O Yahweh, n’ihina anyị enupụrụla gị isi, site n’egeghị ntị n’okwu gị na na-edobeghị iwu gị, nke i nyere anyị site n’aka ndị amụma gị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 79: 8,9,11, 13.
Azịza: Onyenweanyị atala anyị ahụhụ etu njọ anyị kwesịrị.
1. Atala anyị ahụhụ maka njọ nnanna anyị ha mere;
Kama ka obi ebere gị bịakwute anyị ọsọsọ,
n’ihi na ha ewetuola anyị ala nke ukwuu.
Azịza: Onyenweanyị atala anyị ahụhụ etu njọ anyị kwesịrị.
2. Nyere anyị aka, O Chineke onye nzọpụta anyị,
maka otito nke aha gị,
zọpụta anyị, ma gbagharakwa anyị njọ anyị,
n’ihi aha gị!
Azịza: Onyenweanyị atala anyị ahụhụ etu njọ anyị kwesịrị.
3. Meenụ ka akwa arịrị ndị nọ na nga ruo gị ntị,
Were ike aka gị chekwaba ndị a mara ikpe ọnwụ!
Mgbe ahụ anyị bụ ndị nke gị, igwe atụrụ ị na-azụ,
ga-enye gị ekele ebeebe-ebeebe,
bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ,
anyị ga-ekwupụta otito gị.
Azịza: Onyenweanyị atala anyị ahụhụ etu njọ anyị kwesịrị.
MBEKU – Luk: 15, 18.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Agam ebili, lakwuru nna m, aga m asị ya: Nna, emeghiela m megide eluigwe megidekwa gị.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 6:36-38
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: Nweenụ obi ebere dịka Nna ụnụ nke eluigwe si nwee obi ebere. “Ụnụ ekpela mmadụ ibe ụnụ ikpe ka a ghara ikpe ụnụ ikpe,
Ụnụ amakwala mmadụ ibe ụnụ ikpe ka a ghara ịma ụnụ ikpe, nweenụ obi mgbaghara ka e wee gbaghara ụnụ. Gbasapụnụ aka nye, Chineke ga-enyeghachikwa ụnụ.
Ọ ga-ebunye ụnụ iheọma n’akpa buru ibu, nke ayọgharịrị ihe dị na ime ya, sụjue ya n’ọnụ, nke iheọma jupụtara, na-awụpụ. Chineke ga-adọba iheọma n’apata ụkwụ ụnụ abụọ. N’ihi na ụdị akpa ụnụ ji tụnyere ndị ọzọ ka a aga-eji tụnyere ụnụ.
Igbo Mass Readings for March 3 2026, Tuzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
Igbo Mass Readings for March 2 2026, Mọnde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.