Igbo Mass Readings for March 10 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 10 2025, Mọnde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:1-2, 11-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Levitikọs

Yahweh gwara Mosis okwu sị, “Gwa ọgbakọ Izrel niile okwu ndị a: Dịnụ nsọ n’ihi na mụ onwe m bụ Yahweh, Chineke ụnụ dị nsọ.” Ụnụ agaghị ezu ohi, ma ọ bụ tụọ asị, ma ọ bụ ghọgbuo ibe ụnụ.

Ụnụ agaghị eji aha m añụ iyi asị wee merụọ aha Chineke ụnụ. Abụ m Yahweh. Ụnụ emegbula ma ọ bụ nara onye agbataobi ụnụ ihe ya n’ụzọ na-ezighị ezi. Ụgwọ onye ọrụngo ụnụ agaghị anọ n’aka ụnụ chi abọọ.

Ụnụ agaghị akpọ onye ogbi iyi, ma ọ bụ dochiere onye isi ihe n’ụzọ. Ụnụ ga na-atụrụ Chineke ụnụ egwu. Abụ m Yahweh. “Ụnụ ekpela ikpe na-ezighị ezi. Ụnụ adọnyerela onye ọbụla ukwu n’ikpe, ma ọ bụ ogbenye ma ọ bụ ọgaranya.

Ụnụ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee onye agbataobi ụnụ ikpe.” Ụnụ agaghị ekwutọ ibe ụnụ. Ụnụ agaghịkwa eme ihe ọbụla ga-etinye ndụ onye agbataobi ụnụ na nsogbu. Abụ m Yahweh.

Ị gaghị eburu nwanne gị iwe n’obi, ị ga-eji obi ọcha gwa onye agbataobi gị mmehie ya, ka ị ghara iketa oke na mmehie ya, Achọla ka i megwara ihe mmadụ mere gị, ma ọ bụ buru iro n’obi megide nwanne gị, kama hụ onye agbataobi gị n’anya dịka i siri hụ onwe gị n’anya. Abụ m Yahweh.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 19: 8,9,10,15.

Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.

1. Iwu nke Onyenwanyị kwụ ọtọ;

Ọ na-enye mkpụrụobi ndụ ọhụrụ,

Atụmaatụ Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasị obi

Ọ na-enye ndị dị umeala amamihe.

Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.

2. Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ,

ọ na-enye obi añụrị;

Iwu nke Onyenweanyị pụtara ihe;

ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ.

Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.

3. Ịtụ egwu Onyenweanyị bụ ihe dị mma;

ọ na-adị ebeebe;

ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu;

Ha niile kwụkwa ọtọ.

Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.

4. Mee ka okwu niile si m n’ọnụ apụta oge niile,

na echiche obi m niile dị mma n’ihu gị,

Onyenweanyị, nkume m, na onye nzọpụta m.

Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.

MBEKU – Jọn 6: 64,69

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Okwu gị bụ mmụọ na ndụ, Ọ bụ gị ji ozi nke ndụ ebeebe.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 25:31-46

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu gwara ndị n’eso ụzọ ya sị: Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọọma niile, ọ ga-anọkwasị n’oche eze ya dị ebube. A ga-akpọkọta mba niile n’ihu ya, ọ ga-ekewa ha iche-iche dịka otu onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụta atụrụ n’etiti ewu.

Ọ ga-edobe atụrụ n’aka nri ya. dobe ewu n’aka ekpe ya. Mgbe ahụ, onye eze ga-asị ndị nọ n’aka nri ya: “Bịanụ, ụnụ ndị dị ngọzi nke nna m, bịanụ ka ụnụ were alaeze nke a kwadobere ụnụ site na mbido nke ụwa; n’ihi na mgbe agụụ na-agụ m ụnụ nyere m nri, mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ ụnụ nyere m mmiri.

A bụ m onye ọbịa, ụnụ nabatara m. Agba m ọtọ, ụnụ yibe m akwa, mgbe m nọ n’ọrịa, ụnụ bịara leta m, anọ m n’ụlọ mkpọrọ, ụnụ bịakwutere m. Mgbe ahụ ndị eziomume ga-aza ya sị: ‘Onyenweanyị, olee mgbe anyị hụrụ ka agụụ na-agụ gị, nye gị nri, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, nye gị mmiri?

Oleekwa mgbe anyị hụrụ ka ị bụ onye ọbịa, nabata gị, ma ọ bụ ka ị gba ọtọ, yibe gị akwa? Olee mgbe anyị hụrụ na ị nọ n’ọrịa, ma ọ bụ na mkpọrọ, bịa leta gị?

Onye eze ahụ ga-azakwa ha sị; N’ezie, agwa m ụnụ; mgbe ọbụla ụnụ meere ya ọ bụladị otu onye pekarịchara mpe n’ime ụmụnna m ndị a, mụ onwe m ka ụnụ meere ya.

Mgbe ahụ ọ ga-asị ndị ahụ nọ ya n’aka ekpe: ‘Pụọnụ n’ihu m, ụnụ ndị a bụrụ ọnụ! Gaanụ n’ọkụmmụọ ebeebe nke a kwadooro ekwensu na ndị mmụọozi ya!

N’ihi na mgbe agụụ na-agụ m ụnụ enyeghị m nri, mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, ụnụ enyeghị m mmiri. Mgbe m bụ onye ọbịa ụnụ anabataghị m, agba m ọtọ ụnụ eyinyeghị m akwa, mgbe m nọ n’ọrịa na n’ụlọmkpọrọ ụnụ abịaghị leta m.

Mgbe ahụ ha ga-aza ya sị: “Onyenweanyị olee mgbe anyị hụrụ na agụụ na-agụ gị, akpịrị na-akpọ gị nkụ, mgbe ị bụ onye ọbịa, ka ị gba ọtọ, nọrọkwa n’ọrịa ma ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ wee ghara inyeere gị aka?

Ma ọ ga-aza ha sị: ‘N’ezie agwa m ụnụ, ebe ụnụ emereghị ya ọ bụladị otu onye dịkarịchara nta n’ime ndị a, ụnụ emereghị m ya. Ha ga-apụ wee banye n’ahụhụ dị ebeebe, ma ndị eziomume ga-abanye na ndụ ebeebe.”

Igbo Mass readings for March 11 2025, Tuzde n’ime Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Igbo Mass Readings for March 10 2025, Mọnde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.