Nara Onyinye Gọzikwa Ụmụ Gị [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Nara Onyinye Gọzikwa Ụmụ Gị‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Offertory Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Nara Onyinye Gọzikwa Ụmụ Gị Lyrics

Chorus: Chineke dị ndụ, Chineke dị ndụ nara onyinye

K’ịgọzikwa ụmụ gị, K’ịgọzikwa ụmụ gị Nna biko,

Ngọzi gị ka anyị n’arịọ.

1. Onye ọbụla bur’onyinye bịa n’ihu Chineke

tụọrọ ya mma mma maka ndụ ya n’ihe ọma ya nile.

2. Onye ọbụla wer’obi ọcha kelekwa Chineke

tụọrọ ya mma mma ọ gọziri anyị bido na mbọchị mbụ.

3. Onye ọ bụla were arịrịọ daa n’ụkwụ Chineke

rịọ ya mgbaghara maka njọ nile anyị mere megide ya.

4. Nna biko nara arịrịọ n’ekpere anyị nile gọzikw’anyị ọzọ ma chekwaba anyị ruo na njedebe.

5. Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ

ka ọdị na mbụ mana ugbu a rukwe mgbe ebighịebi.

Other Igbo Offertory Hymns

Other Catholic Hymns