Igbo Mass Readings for July 26 2025, Ncheta Joachim na Ann dị Asọ – Ndị mụrụ Vegin Marịa dị Ngọzi.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 26 2025, Ncheta Joachim na Ann dị Asọ – Ndị mụrụ Vegin Marịa dị Ngọzi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 44:1, 10-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak

Ugbu a, ka anyị toonụ ndị ahụ aha ha na-ada ụda, ndị nna anyị ha n’agbụrụ ha. Mana ndị a bụ ndị obiebere; ndị eziomume ha enweghị nchefu. Agamnihu ha nwere ga-esi n’aka ha fere n’aka ụmụụmụ ha.

Oke ha ga-esikwa n’ụmụ fere n’ụmụ. Ụmụ ha kwụsiri ike na ọgbụgbandụ ndị ahụ; n’ihina ụmụụmụ ha sokwara otu ụzọ ahụ. Mkpụrụ ha ga-adịrị gaba ebighịebi, otito ha adịghị nhichapụ.

E liela ha n’udo, mana aha ha na-adịrị ndụdụgandụ niile. Ndị mmadụ ga na-akọ maka amamihe ha. Ọgbakọ ha ga na-ekwupụta otito ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 132: 11, 13-14, 17-18.

Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze Nna ya Devid.

1. Onyenweanyị ñụọrọ Devid iyi,

ọ ghaghị echegharị na ya,

“Otu n’ime ụmụ gị

ka m ga-akwụba n’ocheze gị.

Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze Nna ya Devid.

2. N’ihina Onyenweanyị ahọrọla Zayọn,

ọ họrọla ya ka ọ bụrụ ebe obibi.

“Ebe a ka m ga-anọ ebeebe,

ebe a bụ ebe obibi m họọrọ.

Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze Nna ya Devid.

3. N’ebe a, aga m akpọlite otu eze n’agbụrụ Devid,

aga m eme ka ọkụ nke onye m tere ude na-achawapụta ebeebe.

Aga m eji ihere kpuchie ndịiro ya ihu,

mana ọchịchị ya ga na-aga n’ihu.

Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze Nna ya Devid.

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Ọ nọ na-elekwa anya maka nkasịobi nke Izrel, Mmụọ Nsọ nọnyekwaara ya.

ALLEUIA.

OZIỌMA – 13: 16-17.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ngọzi dịịrị anya ụnụ, n’ihina ha na-ahụ ụzọ, na ntị ụnụ, n’ihina ha na-anụ ihe.

N’ezie agwa m ụnụ, ọtụtụ ndị amụma na ndị eziomume chọsiri ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ ma ha ahụghị ya, ịnụ ihe ụnụ na-anụ ma ha anụghị ya.

Igbo Mass Readings for July 27 2025, Ụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Atọ

Igbo Mass Readings for July 26 2025, Ncheta Joachim na Ann dị Asọ – Ndị mụrụ Vegin Marịa dị Ngọzi.