Igbo Mass Readings for July 29 2024, Ncheta Martha dị Asọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 29 2024, Ncheta Martha dị Asọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:7-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ nke Jọn

Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị hụrịtanụ onwe anyị n’anya, n’ihina ịhụnaanya si na Chineke pụta. Onye ọbụla nwere ịhụnaanya bụ nwa nke Chukwu. Ọ makwaara Chukwu.

Onye na-enweghị ịhụnaanya amaghị Chukwu, n’ihina Chukwu bụ ịhụnaanya. Otu a ka ịhụnaanya Chineke si pụta ihe n’ebe anyị nọ, na o zitere naanị otu nwa ya n’ụwa ka anyị nwee ndụ site na ya.

N’ụdị a ka ịhụnaanya dị: Ọ bụghị na anyị ahụla Chineke n’anya, kama ọ hụrụ anyị n’anya ma zite nwa ya, ka ọ bụrụ onye a ga-esi n’aka ya gbaghara njọ anyị.

Ndị m hụrụ n’anya, ebe ọ bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otu a, anyị kwesịkwara ịhụrịta onwe anyị n’anya. O nwebeghị onye hụrụla Chineke. Ọ bụrụ na anyị hụrịta onwe anyị n’anya, Chineke na-anọgide n’ime anyị, ma na-emekwa ka ịhụnaanya ya zuo oke n’ime anyị.

Otu a ka anyị ga-esi mara na anyị bi n’ime ya, ya onwe ya ebiri n’ime anyị n’ihina o nyela anyị mmụọ ya. Anyị ahụla, na-agbakwa akaebe na Nna ezitela nwa ya ka ọ bụrụ onye nzọpụta nke ụwa.

Onye ọbụla na-ekwupụta na Jesu bụ nwa Chineke, Chineke na-ebi n’ime ya, ya onwe ya na-ebikwa n’ime Chineke. Anyị maara, ma kwerekwa n’ịhụnaanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ.

Chineke bụ ịhụnaanya, onye ọbụla na-anọgide n’ịhụnaanya na-anọgide na Chineke, Chineke na-anọgidekwa n’ime ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 33: 2-3, 4-5, 6-7, 8-9, 10-11.

Azịza: Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile

Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla

Mkpụrụobi m na-egori n’Onyenweanyị

Ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa. Azịza

2. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị

Soronụ m too aha ya

Akpọkuru m Onyenweanyị, Ọ za m

Ọ zọpụtara m n’egwu niile na-atụ m. Azịza

3. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke amụke

ihere anaghị eme ya ma ọlị

Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye

Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile. Azịza

4. Mmụọọma nke Onyenweanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche

Ọ na-azọpụta ha

Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma

Añụrị na-adịrị onye gbabara n’Onyenweanyị. Azịza

5. Ụnụ ndị nsọ niile, tụọnụ Onyenweanyị egwu

n’ihina ndị niile na-atụ Onyenweanyị egwu enweghị ihe na-akpa ha

Agụụ nwere ike gụọ ụmụ ọdụm

mana iheọma anaghị akọ n’ebe ndị na-achọ Onyenweanyị nọ. Azịza

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ihe nke ndụ.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 11: 19-27.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Ọtụtụ ndị Juu bịara ka ha kasie Mata na Meri obi maka ọnwụ nwanne ha nwoke, Mgbe Mata nụrụ na Jesu na-abịa, ọ gara zute ya, ma Meri nọdụrụ n’ụlọ.

Mata gwara Jesu sị, “Onyenweanyị, ọ bụrụ na Ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke akaraghị ịnwụ. Ọ bụladị ugbu a, ama na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla Ị rịọrọ n’aka ya.

Jesu gwara ya sị, Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ. Mata aza sị ya, “Ama m na ọ ga-ebilite ọzọ na mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” Jesu wee sị ya, “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ, onye ọbụla kwere na m ọbụladị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ.

Ma onye ọbụla nke dị ndụ, kwerekwa na m, agaghị anwụ ma ọlị. I kwere nke a?” Ọ zara Jesu sị, “Ee, Onyenweanyị, ekwere m na Ị bụ Kristi ahụ, nwa Chineke, onye nke ga-abịa n’ime ụwa.

MA Ọ BỤ

OZIỌMA – 10:38-42

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Mgbe ha na-aga n’ụzọ, Jesu banyere na otu ọnụmara. Otu nwaanyị a na-akpọ Mata nabatara ya n’ụlọ ya. Mata nwere nwanne nwaanyị a na-akpọ Meri, onye nọdụrụ ala n’ụkwụ Onyenweanyị na-anụrụ nkuzi ya.

Ma uche Mata gbasachara agbasa ebe ọ na-agba mbọ maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere Jesu sị, “Onyenweanyị, ọ bụ na ometụghị gị n’obi na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ije ozi niile?

Gwanụ ya ka ọ bịa nyere m aka.” Ma Onyenweanyị zara ya sị, “Mata, Mata, Ị na-echegbu onwe gị na-esogbukwa onwe gị n’ihi ọtụtụ ihe; ma otu ihe bụ ihe dị mkpa. Meri ahọrọla oke ka mma nke a na-agaghị anapụ ya.

Igbo Mass Readings for July 30 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for July 29 2024, Ncheta Martha dị Asọ.