Igbo Mass Readings for December 26 2024, Emume Ncheta Stivin Dị asọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 26 2024, Emume Ncheta Stivin Dị asọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:8-10; 7-54-59

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrọ Ndị Ozi

Ebe Stivin jupụtara na-amara na ike nke Mmụọ Nsọ, ọ rụrụ oke ọrụ ịtụnaanya na ihe ịrịbaama dị iche-iche n’etiti ndị Juu. Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu ndị si n’ụlọ nzukọ nke “Ndị nweere onwe ha” (dịka e si akpọ ya) na nke ndị Saịriin, na nke ndị Elegzandrịa, na nke ndị si Silisia na Eshịa bịara rụsa Stivin ụka.

Ma ha enweghị ike ịkwụgidenwụ amamihe ike nke Mmụọ Nsọ Stivin ji agwa ha okwu. Mgbe ọgbakọ ikpe ahụ nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwuu n’ebe Stivin nọ ha wee taa ikikere eze, ma Stivin onye jupụtara n’ike nke Mmụọ Nsọ lere anya n’eluigwe hụ ebube nke Chineke.

Ọ sị ha “Lee! Ana m ahụ ka e meghere eluigwe, na nwa nke mmadụ ka ọ kwụ na-aka nri nke Chineke. Ha weere oke olu tie mkpu, were aka kuchie ntị ha, were ọsọ wakpo Stivin.

Ha si n’obodo ahụ kpụpụ ya, were okwute tụgbuo ya. Ndị akaebe ụgha, ndị gburu Stivin, wụsara uwe ha n’ụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl. Ka ha na-atụgbu Stivin o kpere ekpere sị, “Onyenweanyị Jesu nara mkpụrụobi m.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps:31-3-4, 6, 7, 8, 17,21

Azịza: N’aka gị O Dinwenụ ka m tinyere mmụọ m.

1. Bụrụ nkume nke mgbaba m,

ide nke ga-azọpụta m,

N’ihina ị buụ nkume m na Ide m;

n’ihi aha gị dube m, ma chekwaba m. Azịza

2. N’aka gị ka m tinyere mmụọ m,

Ị gbapụtala m Osebụrụwa Chineke nke eziokwu.

Mana atụkwasịrị m obi m n’Osebụrụwa,

Aga m awụli elu, nwee añụrị n’ime ịhụnaanya gị. Azịza

3. Ka ihu gị chakwasị nwodibo gị,

were ịhụnaaya gị zọpụta m.

N’ihu gị ka ị na-ezobe ha,

ka atụmaatụ ndị ajọomume ghara imetu ha. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa na-aha Onyenweanyị, Osebụrụwa bụ Chineke, o ji ihu ọchị ele anyị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 10:17-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị ụmụazụ ya iri na abụọ sị: Zerenụ ndị mmadụ, n’ihina ha ga-arara ụnụ nye n’ụlọ ikpe; ha ga-apịa ụnụ ihe n’ụlọ nzukọ ha dị iche-iche. Ha ga-akpụgara ụnụ ndị na-achị achị na ndịeze n’ihi m.

Ụnụ ga-eji ohere ahụ gbaara m akaebe n’ihu ha na ndị mba ọzọ. Mgbe ha raara ụnụ nye, ụnụ echegbula onwe ụnụ banyere ihe ụnụ ga-ekwu, ma ọ bụ banyere otu ụnụ ga-esi kwuo ya; n’ihi na a ga-akụziri ụnụ ihe ụnụ ga-ekwu n’oge ahụ.

Maka na ọ bụghị ụnụ ga-ekwu, kama mmụọ nke Nna ụnụ ga-esi n’ime ụnụ kwuo okwu. Nwanne ga arara nwanne ya nye n’ọnwụ; nna ga ararakwa nwa ya nye n’ọnwụ.

Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha, mee ka e gbuo ha. Mmadụ niile ga-akpọ ụnụ asị n’ihi m, ma onye nọgidesiri ike ruo n’isi njedebe ka a ga-azọpụta.

Igbo Mass Readings for December 27 2024, Ncheta Jọn Dị asọ

Igbo Mass Readings for December 26 2024, Emume Ncheta Stivin Dị asọ