Ndị Bịara Ụka Ga-anata Ngọzi [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Ndị Bịara Ụka Ga-anata Ngọzi‘ is one of the hymns used in Igbo Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as Entrance Hymns for the Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Ndị Bịara Ụka Ga-anata Ngọzi Lyrics (Key G22)

s.m,m:d.r/m,m.-.,m:m/r.r-,r:r/m,

m.-,m:m/s.m,m:d.r/m.m:m.r/r:-/

Chorus:

Ndị bịara ụka ga’nata ngọzi nata ngọzi nata ngọzi,

Ndị bịara ụka ga’nata ngọzi n’aka Onyenweanyị,

Natakwa ebere n’aka Chineke onye zọrọ ha,

N’ihina ha so n’ọnụọgụgụ ndị n’achọ Dinwenụ.

s.m.-.,m:d.f/m:d/m,s.-m:d.f/

m:r:m.s:-,m:d.f/m.r.d.t/d:-/

1. Ọ bụ Dinwenụ nwe ụwa, n’ihe juru n’ime ya,

ụwa nke a na ndị bi n’elu ya.

Ka ya wụkwasịrị ya, n’elu oshimiri,

Mee ka oguzosike ike n’elu mmiri.

2. Onye ga-arịgo ugwu nke Onyenweanyị,

Onye gabata n’ime ụlọ nsọ ya?

Onye omume ya dị nsọ, onye obi ya dị ọcha,

Onye n’etinyeghị uche ya n’ụmụ ihe na-enweghị isi.

Onye na-anaghị añụrụ mmadụ ibe ya iyi aghụghọ

Ọ ga-anata ngọzi na aka Onyenweanyị,

Natakwa ebere n’aka Chineke onye zọrọ ha,

O soro laa n’igwe, ụmụ mmadụ n’achọ ya,

Ndị na-achọ ihu Chineke Jacob.

3. Ọnụ ụzọ ama bulienụ isi ụnụ elu

bulienụ elu ọnụzọ ọkpụ,

Ka Eze dị otito bata.

Onyekwa bụ Eze ebube a?

Ọ bụ Dinwenụ Dike dike,

Dinwenụ nke siri ike n’agha!

Ọnụ ụzọ ama bulienụ isi ụnụ elu,

bulienụ elu ọnụ ụzọ ọkpụ,

Ka Eze dị ebube bata onye.

4. Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ, a ọ bụ bu?

Dinwenụ nke igwe agha,

Ọ bụ Ya bụ Eze ebube a.

Otu ọdị na mbụ, n’ugbu a, na mgbe nile,

n’ụwa ebighị ebi Amen.

Other Igbo Entrance Hymns

Other Catholic Hymns