Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Abụọ.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Abụọ.

NKWỤSỊ NKE ABỤỌ

Jesu Eburu Obe Ya

Uzo nke obe - Igbo Stations of the Cross - Nkwusi nke abuo

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

KAỊFAS eziga Jesu na nke Paịlet, onye lechara ya kwupụta sị: “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m hụrụ nwoke a mere” Paịlet ezigara ya Herọd. Herọd ajụchaa ya ajụjụ zighachiri ya Paịlet. Paịlet na Herọd ejiri ya meziri esemokwu dị n’agbata ha abụọ. Paịlet abịa ma Jesu ikpe ọnwụ (Luke 23:1, 4, 1-12).

Sekpurunụ Ala

Gịnị kpatara ụmụ-mba ji arọ iro? Kedụ ihe ha jiri arọ iro na-enweghị isi? Ndị eze ụwa adọkọtala ukwu gbaa izu ha ji emegide Dinwenụ na onye O-Tere-Ude. Obinigwe nọ na-achị ha ọchị. Osebụrụwa achịgbuola ha n’ọchị.

Onyenweanyi, mee ka anyị kwụrụ n’ụzọ eziokwu gị mgbe niile, ghara iji egwu ndị mmadụ emehie gị. Mee ka ndị na-achị obodo tinyere Nzuko gị aka n’ọrụ ịgbasa ikpe nkwụmọtọ gị.

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke atọ

Ukwe: Anya mmiri abụrụla nri m

             Ma n’ehihie ma n’abalị

             Mmadụ sị: Olee Chukwu gị? (Abụọma 42:3)

Ụzọ nke Obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Abụọ.

Categorized in:

Igbo Stations of the Cross,