Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Asatọ.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Asatọ.

NKWỤSỊ NKE ASATỌ

Jesu Ezute Ụmụnwaanyị Jerusalem

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - nkwusi nke asato

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Igwe ndị mmadụ so Jesu na-aga n’ụzọ, tinyekwara ụmụnwaanyị na-emere ya ebere na-ebere ya akwa. Ma Jesu atụgharịa sị ha: “Ụmụada Jerusalem, ụnụ eberela m akwa; kama bewerenụ onwe ụnụ na ụmụ ụnụ akwa. (Luk 23:27-28).

Sekpurunụ Ala

A nụrụ m olu na-ebe akwa arịrị, na-eru nnukwu ụjụ na Rama. Rechel na-ebere ụmụ ya akwa. Ọ jụla ịnara nkasi-obi maka ụmụ n’ihi na ha adịghịkwa. Dinwenụ kwuru sị: Ebekwala akwa ọzọ; Hichaa anya mmiri maka na ha ga-esi n’ala ndị iro alọghachi. (Jeremaya 31:15-16).

Dinwenu m anapụkwala m ndị nkasịobi mgbe m nọ na mkpa. E kwela ka ọnwụnwa merie m, ma mee ka m merie ọnwụnwa. (Uzo nke obe Asato)

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke itoolu

Ukwe: Kedu ihe eji atụnyere gị;

            Iji nye gị nkasị obi;

            Ewoo! Ada Zayọn? (Abụakwa 2:13).

Ụzọ nke Obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Asatọ.

Categorized in:

Igbo Stations of the Cross,